Na Unizik, Ngalaba Ọmụmụ Ihe Maka Ọhịa Emeela Emume Ịnabata Ndị Ọhụrụ

May 6, 2021 - 19:53
 0
Na Unizik, Ngalaba Ọmụmụ Ihe Maka Ọhịa Emeela Emume Ịnabata Ndị Ọhụrụ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ ụbọchị Tuzdee, dịka ngalaba ọmụmụ ihe ma ọhịa, a maara dịka ngalaba 'Forestry and Wildlife' nke mahadum Nnamdị Azikiwe University dị n'Awka, n'ime steeti Anambra, merùbèrè emume ịnabata ụmụakwụkwọ batara ọhụrụ na ngalaba ahụ.

Oke mmemme ahụ bụ nke a chịkọbara site n'aka òtù jikọtara ụmụakwụkwọ ngalaba ahụ, bụ 'Forestry and Wildlife Students Association (FOWSA)', ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee nyekwa onyinye nkwanyeùgwù dị iche iche nyegara ụfọdụ ụmụakwụkwọ na ndị nkụzi na ngalaba ahụ.

N'okwu mmalite ya n'ebe ahụ, onyeisi ngalaba ọmụmụ ihe ahụ, bụ Dọkịta Anselm E. Egwuatum jiri obi ụtọ wee nabata ụmụakwụkwọ ahụ batara ọhụrụ na ngalaba ahụ, ma chètara ha na ọ bụ mmasị Chineke na ha ga-abụ ụmụakwụkwọ nọ na ngalaba ahụ n'oge dịka oge a.

Ọ kọwara ngalaba ahụ dịka otu n'ime ngalaba ọmụmụ ihe kachasị mma n'ụwa gbaa gburugburu, ma bụrụkwa ngalaba nwere ụsa nye nsogbu mgbanwè ihu ígwe na-échéré mba ụwa aka mgba; ọbụladị dịka ọ kpọkuru ụmụakwụkwọ ahụ ka ha dị uchu n'agụmakwụkwọ ha ma gụsie akwụkwọ ike, iji nwee ezi mpụtara ma bụrụ ndị gọọmentị na ụlọọrụ dị iche iche ga na-achọgharị ka e wee ha n'ọrụ, ngwangwa ha gụchara akwụkwọ.

N'okwu nke ya, otu onye n'ime ndị nkụzi nọ na ngalaba ahụ, bụ Ọkammụta E.A. Ibe tòrò ụmụakwụkwọ ahụ maka ọgụgụisi ha, ma kpọkuo ha ka ha bụrụ ndị na-aña ntị nke ọma, na-erube isi na ndụmọdụ, ma na-agbasòkwa ntụziaka, ka ha wee ghara ịkwa ngarammara ma e mechaa.

Ọ gwakwara ha ka ha zèéré ihe ọbụla bụ akparamagwa ọjọọ, dịka ígwù ojoro, ịtụ asị na ihe ndị ọzọ dị etu ahụ, bụ nke nwere ike imebi aha ha maọbụ kpụtọọ ùgwù ha, ọbụladị dịka ọ dụrụ ha ọdụ ka ha na-ekpesikwa ekpere ike, ma na-achụsòkwa ezi mpụtàrà.

N'akụkụ nke ya, onye ndụmọdụ ụmụakwụkwọ ahụ ma bụrụkwa onye nkụzi na ngalaba ahụ, bụ Maazị Chukwu Onyekachi, kọrọ akụkọ ọgbụgba ama banyere etu ịgụ akwụkwọ na ngalaba ọmụmụ ihe ahụ sigoro wee nyere ya aka iru ogoogo ọ nọ na ya ugbua. 

O chètààrà ụmụakwụkwọ ahụ na ọ bụ asambodo abụọ ka a na-enye onye ọbụla gụchara akwụkwọ na ngalaba ahụ, ma kpọpụtasịkwara ha ohere ọrụ dị iche iche na-echere onye gụrụ akwụkwọ na ngalaba ahụ. Ọ dụkwara ha ọdụ ka ha dị uchu n'agụmakwụkwọ ha iji mee nke ọma, maka na ọ bụ ihe ahụ ka nne na nna ha zitere ha ụlọakwụkwọ ka ha bịa mee.

Na mbụ n'ozi nnọọ ya, onyeisi òtù 'Forestry and Wildlife Students Association' (FOWSA) na mahadum ahụ, bụ Nwaada Abonyi Edith Amuche kèlere ụmụakwụkwọ ahụ maka mbàta ha na ngalaba ahụ, ma nyekwazie ha owuweanya na òtù FOWSA ga-aga n'ihu ịkwalite ọdịmma ha ogologo oge niile ha ga-anọ na mahadum ahụ, ọbụladị dịka ọ gwara ha ka ha gbaa mbọ bụrụ ezigbo ụmụakwụkwọ, ma mekwa nke ọma n'agụmakwụkwọ ha.

Na nzaghachi ya n'aha ndị òtù ya, onyeisi ụmụakwụkwọ ahụ batara ọhụrụ, bụ Nwaada Ogu Stacy Nneọma, kwuru na mmemme ahụ emepeela anya ha ka ha mụta ọtụtụ ihe dị iche iche ha kwesiri ịma banyere ngalaba ọmụmụ ihe ahụ na agụmakwụkwọ ha na mahadum ahụ. Dịka ọ na-ekele ndị haziri ihe mmemme, o kwèzịrị nkwa na ọ ga-agụsi akwụkwọ ya ike iji wee nwee ezi mpụtara na ngalaba ọmụmụ ihe ahụ.

Ụfọdụ ihe pụrakarịchara ihe na mmemme ahụ gụnyèrè egwu ọdịnala a gbara site n'aka ụmụakwụkwọ ahụ, idu ha n'iyi ọrụ, banyere irube isi nye iwu na-achị òtù ahụ ịwa achịcha bekee, na inye onyinye nkwanyeùgwù na asambodo nyegara ụfọdụ ndị nkuzi na ụmụakwụkwọ dị iche iche, ndị a họpụtara maka nke ahụ n'ihi otu ihe maọbụ nke ọzọ.

Ụfọdụ ndị dị iche iche e nyere onyinye nkwanyeùgwù ahụ nà nkwànyeùgwù e nyere ha gụnyere: Ọkammụta Ernest Chukwusoro Igwe ('Outstanding Achiever Award'); Dọkịta Anselm E. Egwuatum ('Award of Excellence'); Jacinta A. Ezenwenyi ('Award of Honour'); Onyekachi Chukwu (Lecturer of the Year Award); Ozomma Linda Chidimma ('Merit Award, dịka nwata akwụkwọ kacha wee nwee ezi mpụtara na ngalaba ahụ ugbua); Urama, Jude Odirachukwu ('Outstanding FOWSA President Award'); Okafor, Tochukwu ThankGod ('Achiever FOWSA President Award'); KeneChukwu, Toochukwu Vivian ('Award of Selfless Service'); Nwadinobi, Emmanuel Vincent ('Rare-gem Award'); and Kenechi, Emmanuel Anthony ('Distinguished Service Award'), tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484