Na Yola, Ọkụ Agbarikọọla Ọdụ Ahịa Dị n'Ụlọọgwụ Gọọmenti

Jun 27, 2021 - 19:20
Jun 27, 2021 - 19:51
 0
Na Yola, Ọkụ Agbarikọọla Ọdụ Ahịa Dị n'Ụlọọgwụ Gọọmenti

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ajọ ọkụ ọgbụgba dabidooro ma gbarikọọ ọdụ ahịa dị n'otu nnukwu ụlọọgwụ pụrụ iche na-ewu èwù na Yalo, bụ isi obodo steeti Adamawa.

Ya bụ ụlọọgwụ a maara dịka 'Adamawa State Specialist Hospital' dị na mpaghara Jemita na Yola ka e kwuru na ọ bụ ụlọọgwụ kacha buo ibù gọọmenti steeti ahụ nwe.

Dịka ndị ọnọmgbeomere siri kọwaa, ọkụ ọgbụgba ahụ dapụtara n'isi ngwụcha izuụka a gbarikọrọ ọtụtụ ngwaahịa ma bibie ọtụtụ ihe n'ebe ahụ, n'agbànyèghị na ụgbọala nsọnyụ ọkụ ruru atọ n'ọnụọgụgụ gara n'ebe ahụ maka ịgbanyụ ya bụ ọkụ. Ọbụladị na mgbede ụbọchị ụka, a ka hụrụ ka anwụrụ ọkụ na-asụ n'ime ebe ahụ, nke na-egosi na ya bụ ọkụ ọgbụgba ka na-ekùkwa ume.

Dịka nkọwa e nwetere site n'ọnụ ndị ọnọmgbeomere ahụ siri kwuo, a chọpụtàbeghị ihe ọ bụ ya kpatara ọkụ ọgbụgba ahụ kpọnkwem ruo ugbua, ma a ka na-eme nnyocha banyere nke ahụ. A chọpụtabeghịkwa ka ọnụọgụgụ na ọnụego ihe ọkụ ọgbụgba ahụ bibiri ebe ahụ hà ruo ugbua.

Kaosiladị, o nwebeghị ozi e nwetara site n'aka gọọmenti steeti ahụ, isi ọchịchị ụlọọgwụ ahụ, ụlọọrụ nsọnyụ ọkụ steeti ahụ maọbụ ụlọọrụ nchekwa ọbụla banyere ya bụ ọkụ ọgbụgba.

Ụlọọgwụ 'Adamawa State Specialist Hospital' dị n'okpuru ọchịchị 'Yola North Local Government' so n'ụlọọgwụ gọọmenti mbụ a rụrụ na steeti Adamawa, tupu gọọmenti etiti wee bịazie rụọ ụlọọgwụ 'Federal Medical Centre (FMC)' dị na mpaghara okpuru ọchịchị ime obodo 'Yola South' na steeti ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484