Naijiria Agbara Aka Ihe Olu

Naijiria Agbara Aka Ihe Olu

Apr 29, 2020 - 16:35
Jan 19, 2021 - 16:36
 0
Naijiria Agbara Aka Ihe Olu

By Ibe Kelechukwu, Ibadan, Nigeria

N'agbanyeghị ohere niile ha nwere, Naijiria gbara aka ihe olu lata dịka egwuregwu ndị na-erubeghị afọ iri na asaa na mba Afrịka bịara n'isi njedebe tata na Tanzania. Naijiria ka ndị Angola jiri ọkpụ abụọ asatara nanị otu were merie dịka mba abụọ a zọrọ ndị nke atọ na Satọdee. N'agbanyeghị mmeri a, Ugo Ọlaedo Naijiria ga-esonye na nke mba ụwa niile na Brazil.

Ndị na-ahazi ndị egwu bọọlụ Naijiria ga-enwe isi ọwụwa maka ebe mmiri siri wee baa n'opi ụgbọgụrụ ka goolu ndị Naịjirịa na-enye siri were gbadaa dịka egwuregwu ahụ na-aga n'ihu.

Na mbụ, ha jiri otu goolu merie Tanzania na asọmpi enyere goolu iteghete, were penariti merie Angola, ma jisi ike gbata onye laba onye laba dịka ha na Uganda gbara onwe ha otu ọkpụ otu ọkpụ, Guinea meriri ha na penariti; ebe ndị Angola mechiziri akwụkwọ.

Otu a ka o siri bịa n'isi njedebe maka otu egwuregwu bọọlụ bụ ndị nwere ọtụtụ ohere mana gbafusie ya, n'agbanyeghị ohere juru eju ha nwere, na akwụkwọ ọbara ọbara ndị Angola nwetara mere ha jiri dị mmadụ iri gbachaa nkeji iri atọ na anọ fọdụrụ, Ugo Ọlaedo emenwughị ihe ọ bụla.

Ebe Olatomi Olaniyan, Tijani na Charles Etim gbaliri bọọlụ ha elu oge ha nwetara ohere ịnye goolu, onye kacha nye goolu n'egwuregwu a bụ Osvaldo Capemba jiri isi nye goolu n'oghere mbụ Angola nwetara mana Wisdom Ubani sara goolu ahụ ka nkeji abụọ gasịrị.

Ka ha sachara goolu ahụ, ndị Naịjirịa ejighị ohere ha nwetara ọzọ mere ihe n'ime asọmpi ahụ, kama ha nọ na-agbafusị bọọlụ ha.

Kama nkea, Andre Sebastio Zito nyere goolu abụọ nke ndị Angola n'ohere ọma ọzọ ha nwere na nkeji nke atọ dịka ọkara nke abụọ bidochara, mana n'agbanyeghị lịkalịka niile ha gbara, Naijiria enweghị ike ime ihe ọ bụla na nkeji ndị ọzọ fọdụrụ.

N'ụbọchị ụka, Cameroon jiri ọkpụ ise merie mba Guinea na asọmpi ikpeazụ ha jiri bụrụ ọkaibe n'egwuregwu Afrịka maka ndị na-erubeghị afọ iri na asaa ka ha na mba Guinea gbachara onye ha onye laba onye laba.

Obodo anọ ndị a ga-anọchitezi anya Afrịka n'Iko FIFA na Brazil n'afọ a.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.