N'Anambra, A Gbanyụọla Ọkụ Ọgbụgba Dapụtara n'Akụkụ Ọdụ Mmanụ Stanel

Mar 2, 2021 - 06:54
 0
N'Anambra, A Gbanyụọla Ọkụ Ọgbụgba Dapụtara n'Akụkụ Ọdụ Mmanụ Stanel
Ụlọọrụ Stanel

Izunna Okafor

Ndị ọrụ nsọnyụ ọkụ steeti Anambra nọrọ na nsonso a wee gbochie ajọ ihe mberede chọrọ ịdapụta n'Ọka (Awka) site n'ịsọnyụ ọkụ dapụtàrà n'akụkụ ọdụ mmanụ ụgbọala Stanel dị na mpaghara ụzọ awara awara ahụ siri Enugu gaa Ọnịsha.

Ya bụ ọkụ ọgbụgba bụ nke malitere n'ihe dịka elekere iri na otu nke ụtụtụ n'ụbọchị Satọdee isi ngwụcha izuụka gara aga, ma bụrụkwa nke e kwuru na ọ bụ ọkụ ịkpa (ịgba ọhịa ọkụ) mere o jiri wee màlite n'akụkụ ọhịa dị n'ebe ahụ, o wee nwúsàbazie, nke mezịrị ka a kpọọ ndị ọrụ nsọnyụ ọkụ steeti ahụ; ha wee wụchaa n'ebe ahụ ozigbo ahụ, wee gbanyụọ ya.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onye nọgodi dịka onyeisi ụlọọrụ Stanel, bụ Maazị Chris Oragi kèlèrè Chineke na ọkụ ahụ abàtàghị n'ụlọọrụ ahụ, ma mee ka a mara na ha nwegàsịrị akụrụngwa dị iche iche e ji asọnyụ ọkụ n'ụlọọrụ ahụ, bụ nke ha kwàdobere maka ajọ ọdachi dị etu ahụ.

Dịka ọ na-ekele ndị nyere aka mee ka a mara banyere ọkụ ọgbụgba ahụ, Maazị Oragi gbarụkwàrà ihu banyere etu ụfọdụ ndị mmadụ siri gbasàá ozi ụgha banyere ya bụ ọkụ ọgbụgba n'usoro nzikọrịta ozi dị iche iche site n'ikwu ya ka ọ dàá ụdà ma dịkwa óké égwù karịa ihe ọ bụ n'ezie, ọbụladị dịka ọ dọrọ ndị mere ihe dị etu ahụ aka na ntị ka ha gbaa mbọ na-enyòcha ozi ha nke ọma tupu ha agbasàá ya, ka ha were ghara ime ụmụ mmadụ ọbara mgbalielu maọbụ tinye ha n'ọnọdụ ọgbaaghara.

N'okwu nke ya, onyeisi ọrụ nsọnyụ ọkụ na steeti Anambra bụ Maazị Martin Agbili nyèrè nkọwa banyere etu ha siri nwete òkù mberede maka ọkụ ọgbụgba ahụ, nke mezịrị ha jiri kwado onwe ha ozigbo ma buru ngwaọrụ ha wụchaa ebe ahụ ma gbòchie ya bụ ọkụ.

O mere ka a mara na ụlọọrụ ahụ dị ezi njikere ibusò ọkụ ọgbụgba agha na igbòchikwa ya kpamkpam n'ime steeti ahụ. Ọ kpọkùzịkwara ndị ndu obodo dị iche iche, ndịisi ụka, ndị ndu òtù dị iche iche na ndịisi ụlọọrụ ka ha gba mbọ nyere ha aka n'agha ahụ a na-ebu megide ọkụ ọgbụgba n'ime steeti ahụ site n'ịsụchasị ọhịa dị na gburugburu ụlọọrụ ha, ịgbanyụsị ọkụ ha na ihe ndị ọzọ dị n'ụlọ ha tupu ha apụọ, ma gbasòkwa usòrò na ntụziaka dị iche iche e nyere iji gbanahị ọkụ ọgbụgba.

Dịka ọ na-echètere ndị mmadụ na ụgụrụ ka dịkwà ugbua, Maazị Agbili nyèkwàzịrị ọhaneze ndụmọdụ ka ha kpọtụrụ ụlọọrụ ha n'oge mgbe ọbụla ha hụtara ọnọdụ ntụmadụ ọkụ ọgbụgba, iji wee gbata ọsọ ma gbanyụọ ya n'ogè.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484