N'Anambra, A Nwụchiela Ụmụnwaanyị Abụọ Ji Ụmụaka Arịọ Arịrịọ

Mar 2, 2021 - 06:19
 0
N'Anambra, A Nwụchiela Ụmụnwaanyị Abụọ Ji Ụmụaka Arịọ Arịrịọ
N'Anambra, A Nwụchiela Ụmụnwaanyị Abụọ Ji Ụmụaka Arịọ Arịrịọ
N'Anambra, A Nwụchiela Ụmụnwaanyị Abụọ Ji Ụmụaka Arịọ Arịrịọ
N'Anambra, A Nwụchiela Ụmụnwaanyị Abụọ Ji Ụmụaka Arịọ Arịrịọ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ na-abụ onye kpọọ onwe ya òké, bùúsù esu ya ọnụ, maka na ọ bụ etu onye siri mete ka e si emeso ya.

Ka ọ dị taa, ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ọdịmma ọhaneze na ihe metụtara ụmụaka na ụmụnwaanyị n'ime steeti Anambra anwụchiela mmadụ abụọ maka iji ụmụaka arịọ arịrịọ na steeti ahụ.

Mmadụ abụọ ahụ, bụcha ụmụnwaanyị, bụ ndị e jidere n'Ọka (Awka) bụ isi obodo steeti ahụ, ma bụrụkwa ndị sitere steeti Nasarawa na steeti Enugu n'otu n'otu. Ha bụ ụmụnwaanyị abụọ nà ụmụaka isii (nwaanyị anọ na nwoke abụọ) ha ji arịọ arịrịọ ka e kwuru na ha so na ndị arịrịọ a nwụchikọbụrụ n'oge mbụ na Nnewi na n'Ọka (Awka) n'ime ọnwa Disembà ahọ gara aga, site n'aka ndị ụlọọrụ ahụ.

Ka o sila dị, oge mbụ ahụ a nwụchikọrọ ha n'ahọ gara aga, Kọmishọna na-ahụ maka ụlọọrụ ahụ, bụ Oriakụ Ndidi Mezue nyechara ha ndụmọdụ megide ịrịọ arịrịọ, nye ha nri, ma nyekwa ha ego ka ha wee ga malite ndụ ọhụrụ ma kwụsịzie ịrịọ arịrịọ.

Dịka a ga-asị na nke ahụ ezubeghị, Kọmishọna Mezue kpọkwara ògbò ya nke steeti Nasarawa oge ahụ, ma gwa ya ka o nye nwaanyị ahụ bụ onye Nasarawa e jidere ọrụ ka o wee si ebe ahụ na-enweta ego o ji azụ ụmụ ya, ma sepuzie aka n'ịrịọ arịrịọ kpamkpam.

Ka o sila dị, n'ihi na ndị Igbo sị na ihe na-esi nkakwụ isì dị ya n'ime ahụ; ụmụnwaanyị abụọ ahụ, n'agbànyèghị ihe niile ahụ e meere ha, kpọkwara ụmụaka ha laghachi azụ n'Anambra ọzọ, wee malitekwa iji ha arịọ arịrịọ, tupu aka wee kpàrazie ha na nke ikpeazụ a.

N'okwu ya banyere nke a, Kọmishọna Mezue kwuzịrị na ọ ga-atụ atụmatụ ịhụ na e nwogharịrị ndị ahụ n'otu n'ime ogige mnwògharị dị iche iche e nwere na steeti ahụ, nye ha nkuzi ga-eme ka uche ha pụọ n'ịrịọ arịrịọ, ma nyekwazie ha ezi ọzụzụ kwesiri ekwesi tupu e zilaga ha na steeti ha, iji malite ndụ ọhụrụ, ma baara onwe ha na obodo ha uru, kwụsị imetọ ikike dịịrị ụmụaka ahụ, ma kwụsịkwa ire ùgwù ha site n'ịrịọ arịrịọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484