N'Anambra, FRSC Enyeghachila Ndị Ezinụlọ Onye Nwụrụ n'Ihe Mberede Okporoụzọ Ego Ya

Apr 9, 2021 - 17:29
 0
N'Anambra, FRSC Enyeghachila Ndị Ezinụlọ Onye Nwụrụ n'Ihe Mberede Okporoụzọ Ego Ya

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ụlọọrụ 'Federal Road Safety Corps (FRSC)' na steeti Anambra nọrọ na nsonso a wee mee ihe ọtụtụ mmadụ atụghị anya a ka nwere ike imenwu ugbua n'ala Nigeria, site n'inyeghachi ndị ezinụlọ onye nwụrụ n'ihe mberede okporoụzọ ego ya dapụrụ ebe ahụ ọ nwụrụ.

Dịka ozi a kụpụrụ site n'aka onye na-ahụ maka mmekọrịta ụlọọrụ FRSC na ọha mmadụ n'ime steeti Anambra, bụ SRC Florence Edor siri wee kọwaa, ọkpụrụkpụ ego ahụ dị narị puku naịra asaa na iri na isii, na narị naịra asata (716,800) bụ nke a hụrụ n'ebe ihe mberede okporoụzọ ahụ mere n'Ọzụbụlụ dị n'okpuru ọchịchị Ekwusigo, na steeti ahụ, ma bụrụkwa ego otu nwaanyị nwụrụ n'ihe mberede okporoụzọ ahụ.

O mere ka a mara na ya bụ ihe mberede okporoụzọ bụ nke mere na mpaghara ụzọ awara-awara ahụ siri Onịtsha gaa Owerri, ma bụrụkwa nke dapụtara n'abalị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Maachị ahọ a n'etiti ụgbọala Bọọsụ Nissan nwere ákàrà LSH-517YG, na otu nnukwu gwongworo nwere ákàrà GGU-83XA.

N'okwu ya n'isi ụlọọrụ FRSC dị n'Ọraifite, oge ọ na-enyefe ndị ezinụlọ nwaanyị ahụ ego ahụ n'aha ụlọọrụ FRSC, onye nlekọta ụlọọrụ FRSC na mpaghara Oraifite, bụ Bamidele Ayanwale, mèrè ka a mara na ha tụụtara ego ahụ oge ha gara mgbataọsọ na inye aka n'ebe ahụ ya bụ ihe mberede mere.

O kwuru na ọ bụ nwaanyị ahụ tụfuru ndụ ya n'ihe mberede okporoụzọ ahụ, bụ Oriakụ Oparaocha nwe ya bụ ego, bụkwazị nke mere ha jiri were ekwentị ya wee kpọọ ndị be ya.

Dịka ọ na-akọwa na ihe mberede okporoụzọ ahụ metụtara mmadụ asaa (nwoke atọ na nwaanyị anọ), Ayanwale gara n'ihu mee ka a mara na ọ bụ naanị nwaanyị ahụ na onye na-anya ụgbọala bọọsụ ahụ nwụrụ ka ya bụ ihe mberede mechara.

O mekwazịrị ka a mara na ọ bụ nwa nwaanyị ahụ nwụrụ anwụ, bụ Maazị Chibueze Oparaocha ka ha nyefere ego ahụ n'aka, oge o dechaara ma binye aka n'akwụkwọ n'ụlọọrụ ahụ.

Ọ kasizịrkwara ha obi maka ọnwụ nwaanyị ahụ, ma kpee ka Chineke nye mkpụrụobi ya ezumike udo n'alaeze Ya.

Na nzaghachi oge ọ natachara ego ahụ, Maazị Chibueze Oparaocha kelere ụlọọrụ FRSC maka ọmarịcha ihe ahụ ha mere, ma kpee ka Chineke gaa n'ihu iji aka Ya kwụghachi ha ụgwọ mmaji kwuru maji, maka ezi ọrụ ha.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484