N'Anambra: Gọọmenti abagidela n'ịkụtùsì ụfọdụ ihe a rụrụ n'ebe ezighị ezi

May 20, 2020 - 20:19
Jan 22, 2021 - 21:09
 0
N'Anambra: Gọọmenti abagidela n'ịkụtùsì ụfọdụ ihe a rụrụ n'ebe ezighị ezi

Izunna Okafor, Awka

Ka ọ dọchara aka na ntị ọtụtụ oge bànyere nke ahụ, gọọmenti steeti Anambra amalitela ịkụtùsì ụlọ/ọdụ ahịa na ihe ndị ọzọ dị iche iche a rụrụ n'ebe ekwesighị ekwesi na steeti ahụ.

Ụfọdụ n'ime ihe ndị ahụ a kụtùrù bụ nke a rụnyere n'okpuru ebe eriri ọkụ latiriki nwere ike dị egwu (bụ 'High Tension Wire' n'asụsụ bekee) siri gaa; ebe ndị ọzọ bụkwa ndị a rụnyere n'elu ọwà mmiri, bụ ebe idè mmiri si agafè.

Atụmatụ ọrụ ịkụtùsi ihe ndị ahụ bụ nke a bàgidere na mpaghara 'Club Road' bụ nke a ma n'oge mbụ dịka 'Abakaliki Street' dị n'Akwa bụ isi obodo steeti ahụ, ma bụrụkwa nke ọ bụ ụlọọrụ 'Awka Capital Territory Development Authority (ACTDA)' nọ n'isi ya, site na njikọ aka ndị ọrụ nchekwa dị iche iche.

N'okwu ọ gwara ndị nta akụkọ banyere nke ahụ, onyeisi ụlọọrụ ACTDA, bụ Maazị Amaechi Okwuosa kwuru na ha adọọla ndị ahụ aka na ntị ọtụtụ ugboro bànyere ime ihe dị etu ahụ, nà ihe égwù dị na ya; mana ha kachiri ntị nọrọ n'ebe ahụ.

Ọ dụrụ onye ọbụla na-achọ ịrụnye ihe ọbụla ka o buru ụzọ nweta nkwàdo site n'aka gọọmenti tupu o mebe nke ahụ, ma dọkwa aka na ntị ka onye ọbụla chọrọ igo àlà n'Awka buru ụzọ kpọtụrụ ma nweta nkwàdo maọbụ ọnụ mmiri okwu ụlọọrụ ACTDA banyere nke ahụ, maka ịkwa ngara m mara n'oge ikpeazụ.

Dịka ọ na-arụtụ aka n'ọtụtụ ihe egwu dị iche iche dị na mmadụ ịrụnye ihe n'okpuru ebe eriri ọkụ latiriki gara maọbụ ebe ọwà mmiri gara; Maazị Okwuosa makwazịrị ọkwà ma dọọ aka na ntị na onye ọbụla a ga-ahụ ka ọ na-abagide n'ihe dị etu ahụ ọzọ, ga-abụ onye a ga-anwụchi ma kpụpụ ya ụlọ ikpe, nyekwa ya ntaramahụhụ ruru ya, karịa naanị ịkụtù ihe ahụ onye ahụ rụrụ.

Otu onye n'ime ndị ahụ a kụtùrù ihe ha ụbọchị ahụ, ma bụrụkwa onye na-ere ihe oriri dị iche iche n'akụkụ ebe ahụ, bụ Maazị Ekene Ugbaja gbàra akaebe na gọọmenti kàrà ọdụ ahịa ya akàrà nkụtù ma dọọkwa ya aka na ntị ka o si ebe ahụ pụọ kemgbe ọnwa ole na ole gara aga.

O kwuru na n'eziokwu, na ya chọrọ ịpụ n'ebe ahụ dịka gọọmenti siri gwa ya, mana ihe ya jiri ka nọrọ ebe ahụ wee ruo ụbọchị ahụ abụghị maka na ọ na-atọ ya ụtọ maọbụ ka o wee mara ihe gọọmenti ga-eme; kama na ọ bụ n'ihi na ya enweghị ego ọ ga-eji ga chọrọ ọdụ ahịa dị mma ebe ọzọ.

Ọ dị ncheta na otu nwaanyị na nwa ya zùtèrè ọnwụ ike na nso nso a na Nnewi, oge eriri ọkụ latiriịi gbabìrì ma dakwasa n'elu ụlọ ha, bụ nke a rụrụ n'okpuru ebe ọkụ latiriki ahụ siri gaa.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.