N'Anambra, Ihe Mberede Okporo Ụzọ Egbuola Mmadụ Abụọ

Oct 18, 2020 - 00:44
Jan 25, 2021 - 00:44
 0
N'Anambra, Ihe Mberede Okporo Ụzọ Egbuola Mmadụ Abụọ

Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Mmadụ abụọ zutèrè onwụ mberede ha na nsonso a, dịka otu ụgbọala bọọsụ kwọrikọrọ ha.

Onye na-ahụ maka mgbasaozi n'ụlọọrụ 'Federal Road Safety Corps' (ngalaba ya nke steeti Anambra) bụ RC Kamal Musa mere ka ụwa mara nke a site n'ozi ọ kụpụrụ banyere nke ahụ 

Dịka o siri kọwaa, ótù n'ime mberede okporo ụzọ ahụ bụ nke mere n'Ichida, na mpaghara ụzọ ahụ siri Igboukwu gaa Nnewi, ma bụrụkwa nke dapụtara n'etiti ụgbọala Bọọsụ (nwéré akàrà AHH 605 RM) na ọgbatumtum 'KC/Sanya' enweghị akàrà ọbụla.

O mere ka a mara na ihe mberede ahụ dapụtara n'ihi ịgba oke ọsọ, bụ nke mere ka ụgbọala ahụ pụnahị onye na-anya ya n'aka; o wee danyeziere onye ọgbatumtum ahụ ma kwọrikọọ onye o bu n'azụ.

Ihe mberede okporo ụzọ ahụ metụtàrà mmadụ anọ —otu nwaanyị, onye e bu n'ọgbatumtum ahụ ma bụrụkwa onye nwụrụ ozigbo ozigbo ahụ; na ụmụnwoke atọ, bụkwa ndị nwetara mmerụahụ n'ụdị dị iche iche. Ndị ahụ nwetárá mmerụahụ bụ ndị e buuru (site n'aka ndị ọrụ FRSC) wee gaa n'ụlọọgwụ 'Apex Hospital Igboukwu' maka inye ha ọgwụgwọ, ebe ozu onye nke nwụrụ anwụ bụkwazị nke a dọnyere n'ụlọ nchekwa ozu dị n'ụlọọgwụ ahụ, oge dọkịta lelechaara ya ahụ wee gbaa akaebe na ọ nwụọla.

N'akụkọ dịkwa ka ibè ya, otu nnukwu ụgbọala nọkwara ụnyaahụ bụ Wenezdee wee gbuo otu nwoke ọzọ e bukwa n'ọgbatumtum, n'ihe mberede okporo ụzọ dapụtàrà n'akụkụ ogigè ndị uweojii dị n'Ọba, na mpaghara okporo ụzọ ahụ siri Oba gaa Nnewi.

Ya bụ ihe mberede dapụtara n'etiti nnukwu ụgbọala gwongworo 'Mark' (nwéré akara KSF 441 XF)

Dịka nke ọzọ, ọ bụkwa ịgba oke ọsọ mèrè ihe mberede okporo ụzọ ahụ, n'ihi na ya bụ ụgbọala pụnahịrị onye na-anya ya n'aka, wee suo onye ọgbatumtum na-agara onwe ya. Otu nwoke e bu n'azụ ọgbatumtum ahụ nwụkwàrà ozigbo ahụ ya bụ ihe mberede ahụ mere, n'ime mmadụ ise ihe mberede okporo ụzọ ahụ metụtara, ebe mmadụ atọ ndị ọzọ kètàkwàrà òkè ihe mmerụahụ dị iche iche.

A dọnyekwazịrị ozu nwoke ahụ nwụrụ anwụ n'ụlọ nchekwa ozu, ebe ndị ọzọ nwetara mmerụahụ nọkwazị n'ụlọ ahụike anara ọgwụgwọ.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ụlọọrụ FRSC na steeti ahụ, bụ Maazị Andrew Kumapayi dọrọ ndị na-anya ụgbọala aka na ntị nke ukwu megide ịgba oke ọsọ na ịnyà ụgbọala n'ụdị ọbụla adabaghị adaba, n'ihi na ọ bụ ihe dị etu ahụ na-eweta ihe mberede okporo ụzọ na ihe mmerụahụ maọbụ ọnwụ mberede na-esi na ya apụta.

O kpekwazịrị ka ndị nwetara mmerụahụ n'ihe mberede okporo ụzọ ahụ gbakere ngwangwa, ma kasikwa ezinụlọ ndị ahụ nwụrụ anwụ obi, kpee ka Chineke nabata ma nye mkpụrụ obi ya ezumike udo.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.