N'Anambra, Ihe Mberede Okporo Ụzọ Egbuola Mmadụ Isi, Merụọ Ọtụtụ Ahụ
Izunna Okafor
Ajọ ihe mberede okporo ụzọ dị oke égwù dapụtàrà ọzọ na steeti Anambra, wee taa isi mmadụ isii, merụọkwa mmadụ iri na otu ahụ.
RC Kamal Musa, bụ ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ 'Federal Road Safety Corps (FRSC)' na steeti Anambra, bụ ya kwupụtara nke a n'ozi ọ kụrpụụrụ ndị nta akụkọ bànyere ya bụ ihe mberede okporo ụzọ.
O kwuru na ya bụ ihe ọdachi dapụtàrà ụbọchị ụka na njikọ ụzọ Nkwelle (Nkwelle Junction) dị na mpaghara okporo ụzọ ahụ siri Nteje wee gaa Ọnịcha, ma bụrụkwa nke mere oge otu ụgbọala bọọsụ na-ébú ndị njèm (nwéré akàrà efere BGT 313 XA), na nnukwu ụgbọala gwongwórò na-ebu mmanụ ọkụ (enweghị ákàrà efere) sukọrọ isi ọnụ, wee kpọrìkọọ ụmụ mmadụ nọgasị n'ime ha.
Ọ gara n'ihu mee ka a mara na nnyòcha e mere na-egosi na ọ bụ ịgba oke ọsọ na ejighị nwayọ wètàrà ihe mberede okporo ụzọ ahụ, nke na ụgbọala ahụ ekweghịzị ndị na-anya ya njide n'ihi na ha abụọ nọ n'oke ọsọ; ha wee bakọọ isi ọnụ ka ebule na ibe ya.
O kwuru na ọgụọgụgụ mmadụ nọ n'ime ụgbọala abụọ ahụ dị iri na asaa (ụmụnwoke iri na otu, na ụmụnwaanyị isii); mana ụmụnwaanyị niile ahụ nwụrụ anwụ, ebe ụmụnwoke iri na otu ahụ nwètàrà mmerụahụ n'ụdị dị iche iche. Ndị ọrụ FRSC buruzịkwara ndị ahụ nwetara mmerụahụ wee gaa n'otu ụlọọgwụ dị n'Ogidi maka inye ha ọgwụgwọ, ebe a dọnyezịkwara ozu mmadụ isii nwụrụ anwụ n'ụlọ nchekwa ozu, oge dọkịta lelechaara ha ahụ wee kwuo na ha anwụọla.
N'okwu ya banyere ihe mberede okporo ụzọ ndị ahụ, onyeisi ụlọọrụ FRSC na steeti Anambra bụ Maazị Andrew A. Kumapayi dọrọ ndị na-anyà ụgbọala aka na ntị ka ha na-akpachapụ anya oge niile, zèére ịgba oke ọsọ, ma jirikwa nwayọ na uchè na-anyà ụgbọala. O kwuru na ọ bụ ịgba oke ọsọ na-ewetakarị ọkà n'ọnụọgụgụ ihe mberede okporo ụzọ na-adapụta aghara aghara na mpaghara ebe dị iche iche steeti ahụ. O chètààrà ha na oji nwanyọ anaghị emerụ ahụ, ma dụọ ha ka ha zèére ịgba oke ọsọ, ọkachasị ugbua a nọ n'ọnwa mbà, ma na-achọkwa ịbà na mmemme ekeresimeesi koọmkwem.
O kpekwazịrị ka ndị nwetara mmerụahụ n'ihe mberede okporo ụzọ ahụ gbakere mgwamgwa, ma kasikwa ezinụlọ ndị nke ha nwụrụ anwụ obi, kpee ka Chineke nabata ma nye mkpụrụ obi ndị ahụ nwụrụ anwụ ezumike udo.
What's Your Reaction?