N'Anambra, Mmadụ Ise Enwetela Mmerụahụ Dịka Ụgbọala Abụọ Kwòkọrọ Isi Ọnụ

Sep 8, 2021 - 20:37
 0
N'Anambra, Mmadụ Ise Enwetela Mmerụahụ Dịka Ụgbọala Abụọ Kwòkọrọ Isi Ọnụ

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Mmadụ ise nọrọ na nsonso a wee nweta mmerụahụ n'ụdị icheiche na steeti Anambra, oge otu ụgbọala bọọsụ na otu ụgbọala spesi wagọn kwokọtàrà isi ọnụ, wee kpọrikọọ onwe ha na ndị nọgasị n'ime ha.

Nke a bụ nke e mere ka ụwa mara site n'ọnụ onye jigodi ọkwa ugbua dịka onye na-ahụ maka ịkụziri ọhaneze ihe ha kwesiri ịma n'ụlọọrụ FRSC n'ime steeti ahụ, bụ DRC Margaret B. Onabe, site n'ozi ọ kụpụụrụ ndị ntaakụkọ na nsonso a n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ.

Dịka o siri kọwaa, ya bụ ihe mberede okporoụzọ dapụtàrà na mpaghara Nawfia nke ogologo ụzọ awara-awara ahụ siri Enugu gaa Onitsha, ma bụrụkwa nke mere oge o jiri ọkara gata elekere iri anọ nke ehihie ụbọchị Tuzdee.

Ọ gakwara n'ihu kọwaa na ya bụ ihe mberede okporoụzọ dapụtara n'etiti ụgbọala bọọsụ Toyota Hiace (nwéré ákàrà EPE 948 YD), nke onye na-anya ya bụ Maazị Augustine Ikpa; nà ụgbọala speesi wagọn Toyota Sienna (nwéré ákàrà BKL 361 ZJ), nke onye na-anya ya bụ Maazị Eze Okonkwo Chijioke

O kwuru na ndị ọnọmgbeomere kọwàrà na ihe kpatara ihe mberede okporoụzọ ahụ bụ mmadụ ịhapụ aka nke ya gbaba n'aka nke onye ọzọ, ma kwuo na onye ahụ na-anya ụgbọala speesi wagọn dara iwu okporoụzọ site n'ịhapụ akụkụ nke ya o kwesiri ịgba, wee gbaa akụkụ nke ndị na-abịa abịa, ya na ụgbọala bọọsụ na-abịa abịa wee kwòkọọ isi ọnụ.
 
DRC. Onabe gara n'ihu kọwaa na ihe mberede okporoụzọ ahụ mètụtàrà mmadụ iri na asaa, nke gụnyere ụmụnwoke asatọ, ụmụnwaanyị ise, ụmụaka ụmụnwoke abụọ na ụmụaka ụmụnwaanyị abụọ. O kwukwàrà nà mmadụ asaa n'ime ndị ahụ, nke gụnyere ụmụnwoke abụọ na ụmụnwaanyị ise, nwètàrà nnukwu mmerụahụ n'ihe mberede okporoụzọ ahụ, ma kwuo na o nweghị onye nke nwụrụ maọbụ tụfuo ndụ ya n'ebe ahụ. 

Ọ kọwakwara na e buuru ndị ahụ nwetara mmerụahụ wee gaa n'ụlọọgwụ 'Princeton Hospital' dị n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ maka inye ha ọgwụgwọ; ma mekwa ka a mara na ndị ọrụ FRSC nyere aka wee bughasịa ihe dachisịrị ụzọ n'ebe ahụ, iji hụ na e nweghị agbakata akwụrụ n'okporoụzọ ahụ.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ụlọọrụ FRSC na steeti Anambra, bụ C.C. Adeoye Irelewuyi kelere Chukwu na o nweghị onye tụfuru ndụ ya n'ihe mberede okporoụzọ ahụ, ma kpekwazie ka ndị nke ahụ nwetara mmerụahụ gbakere ma nweta ọgwụgwọ zuru òkè n'oge adịghị anya.
 
Ọ dụkwazịrị ndị na-anyà ụgbọala ọdụ ka ha kwụsị ịhapụ aka nke ha na-agba n'aka nke onye ọzọ, n'ihi na nke ahụ megidere iwu na-achị okporoụzọ ma bụrụkwa otu n'ime ihe kacha eweta ihe mberede okporoụzọ n'ụdị dị oke egwu. Ọ dụkwazịrị ndị na-anyà ụgbọala ọdụ ka ha na-erubere iwu niile na-achị okporoụzọ isi nke ọma n'ozuzuoke, iji zèéré maọbụ ghàra iwètà ihe mberede okporoụzọ, ọkachasị n'ime oge a a bànyègoro n'ọnwa Mba.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484