N'Anambra, Ndị Iwe Juru Obi Agbaala Onyeohi Ọkụ Maka Izu Handkachiifù

May 13, 2021 - 19:19
May 30, 2021 - 17:53
 0
N'Anambra, Ndị Iwe Juru Obi Agbaala Onyeohi Ọkụ Maka Izu Handkachiifù

Izunna Okafor dere akụkọ a


Ọ bụnnọọ ihe anyammiri na ihe mgbawa obi, dịka ụfọdụ ụmụokorobịa iwe juru n'obi, jidere otu nwata nwoke a na-enyo ènyò na ọ bụ onyeohi, ma mụnye ya ọkụ ozigbo ozigbo, ọkụ wee gbagbuo ya.

Nnukwu ihe ọdachi ahụ bụ nke dapụtara na Nkpọr, dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Idemili North' nke steeti Anambra na nsonsoa.

Ụfọdụ ndị ọnọmgbeomere kwùrù na ya bụ nwata nwoke á mághị onye ọ bụ, màrà otu onye aka àkpà, ma maghara handkachiifù ya, gbapụ ọsọ, chee na ọ bụ ego. 

Ndị ọnọmgbeomere ahụ mèrè ka a mara na ya bụ nwoke na ndị òtù ya nọ na mpaghara ụzọ ebe ahụ ezu ndị mmadụ ohi, na-ama ha aka àkpà, ma na-apụnarakwa ha ihe ha ji eme njem na mpaghara ụzọ Ọnịtsha ahụ.

Ha mere ka a mara na onye ahụ nwata nwoke ahụ màrà aka àkpà nke ikpe azụ ahụ màlìtèrè tibe mkpu, nke mezịrị ka ndị mmadụ jiri gbata ọsọ n'ebe ahụ, wee jikọta onwe ha ọnụ, chụba onyeohi ahụ na ndị òtù ya ọsọ, dịka nkịta na-achụ nchì n'ọdọ ata.

Ha chụgidere ma jide onyeohi ahụ, ebe ndị òtù ya ndị ọzọ riri mbọmbọ ọsọ. Ka ha jidechara ya, ha tiri ya gwoogwoo, ma gwa ya ka o kwuo ebe ndị òtù ya gara zoo, ka e wee ga nwụchikọọ ha niile, mana nwoke ahụ ekweghị agwa ha. 

Ka ha jụgidere ya ka ọ gwa ha, o wee jụ ịgwa ha; ndị ahụ jiri iwe tie ya ihe tinka tiri paanụ, wụọ ya mmanụ ọkụ, ma mụnye ya ọkụ ozigbo ozigbo; ọkụ wee gbagide ya, gbagide ya, ma gbagbuo ya.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti Anambra, bụ DSP Ikenga Toochukwu, onye kọwara etu ya bụ ihe siri wee mee, kwùrù na ihe ahụ bụ eziokwu, ma kọwaa na ha ebupùla ozu nwoke ahụ.

Ọ kọwara na ọ bụ n'elekere iri na otu nke ụtụtụ ka ihe ahụ jiri mee, kwuo na ọ bụ na mpaghara njikọ ụzọ Nkpọr ka ya bụ ihe mere, ma kwuo na ha emeela ka ebe niile ahụ dị jụụ.

Ọ katọrọ etu mmadụ si eji aka ha egbu mmadụ maọbụ na-eme ihe iwu akwadòghị maọbụ n'enwetaghị nkabi iwu, ma kwuo ka onye ọbụla jidere ndị ohi maọbụ onye omekoome mee ka ndị uweojii mara banyere nke ahụ, karịa iji aka ya na-eme ihe bụ uche ha n'ebe onye ahụ nọ.

Ọ dị ncheta na o tèéla ndị aka àkpà, ndị otu nzuzo, ndị ohi, ndị wàyo, na ndị omekoome ndị ọzọ jiri yibe ndị mmadụ égwù n'Ọnịtsha nà ná mpaghara ebe ndị ọzọ dị na gburugburu ahụ (ọkachasị ndị bịara ọhụrụ, ndị na-eme njem, ndị machaghị ala ebe ahụ). Ha na-apụnarakwa onye nọ n'ime ụgbọala apị ekwentị ya maọbụ na-aza ekwentị, tinyere ọtụtụ ihe ọjọọ ndị ọzọ ha na-eme ebe ahụ. 

Nke a so n'otu ihe chuzịrị ọchịchị Gọvanọ Willie Obianọ oge ọ batara n'ọkwa ọchịchị, nke mezịrị o jiri wepụta atụmatụ nchekwa dị iche iche, dịka 'Operation Kpochapụ' (nke mbụ na nke abụọ), iji weta ya bụ ajọ ọnọdụ n'isi njedobe. N'agbanyeghị ihe niile ọchịchị Obianọ na ndị ọrụ nchekwa megoro na ezi mbọ ha gbagoro iji memilaa akparamagwa ọjọọ ahụ a na-ahụta n'Ọnịtsha; ụfọdụ ndị ọjọọ ahụ fooro ntutu taa, sị na ha agaghị esepu aka n'ime mpụ, bụkwazị nke mere ndị mmadụ jizịrị malite ime ha 'e jide, e gbuo' n'ebe ndị, maka na ọ na-abụ anụ gbaba ebeghị ebe, dịnta agbaba atụghị atụ.

Ọ bụnnọọ ihe anyammiri na ihe mgbawa obi, dịka ụfọdụ ụmụokorobịa iwe juru n'obi, jidere otu nwata nwoke a na-enyo ènyò na ọ bụ onyeohi, ma mụnye ya ọkụ ozigbo ozigbo, ọkụ wee gbagbuo ya.

Nnukwu ihe ọdachi ahụ bụ nke dapụtara na Nkpọr, dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Idemili North' nke steeti Anambra na nsonsoa.

Ụfọdụ ndị ọnọmgbeomere kwùrù na ya bụ nwata nwoke á mághị onye ọ bụ, màrà otu onye aka àkpà, ma maghara handkachiifù ya, gbapụ ọsọ, chee na ọ bụ ego. 

Ndị ọnọmgbeomere ahụ mèrè ka a mara na ya bụ nwoke na ndị òtù ya nọ na mpaghara ụzọ ebe ahụ ezu ndị mmadụ ohi, na-ama ha aka àkpà, ma na-apụnarakwa ha ihe ha ji eme njem na mpaghara ụzọ Ọnịtsha ahụ.

Ha mere ka a mara na onye ahụ nwata nwoke ahụ màrà aka àkpà nke ikpe azụ ahụ màlìtèrè tibe mkpu, nke mezịrị ka ndị mmadụ jiri gbata ọsọ n'ebe ahụ, wee jikọta onwe ha ọnụ, chụba onyeohi ahụ na ndị òtù ya ọsọ, dịka nkịta na-achụ nchì n'ọdọ ata.

Ha chụgidere ma jide onyeohi ahụ, ebe ndị òtù ya ndị ọzọ riri mbọmbọ ọsọ. Ka ha jidechara ya, ha tiri ya gwoogwoo, ma gwa ya ka o kwuo ebe ndị òtù ya gara zoo, ka e wee ga nwụchikọọ ha niile, mana nwoke ahụ ekweghị agwa ha. 

Ka ha jụgidere ya ka ọ gwa ha, o wee jụ ịgwa ha; ndị ahụ jiri iwe tie ya ihe tinka tiri paanụ, wụọ ya mmanụ ọkụ, ma mụnye ya ọkụ ozigbo ozigbo; ọkụ wee gbagide ya, gbagide ya, ma gbagbuo ya.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti Anambra, bụ DSP Ikenga Toochukwu, onye kọwara etu ya bụ ihe siri wee mee, kwùrù na ihe ahụ bụ eziokwu, ma kọwaa na ha ebupùla ozu nwoke ahụ.

Ọ kọwara na ọ bụ n'elekere iri na otu nke ụtụtụ ka ihe ahụ jiri mee, kwuo na ọ bụ na mpaghara njikọ ụzọ Nkpọr ka ya bụ ihe mere, ma kwuo na ha emeela ka ebe niile ahụ dị jụụ.

Ọ katọrọ etu mmadụ si eji aka ha egbu mmadụ maọbụ na-eme ihe iwu akwadòghị maọbụ n'enwetaghị nkabi iwu, ma kwuo ka onye ọbụla jidere ndị ohi maọbụ onye omekoome mee ka ndị uweojii mara banyere nke ahụ, karịa iji aka ya na-eme ihe bụ uche ha n'ebe onye ahụ nọ.

Ọ dị ncheta na o tèéla ndị aka àkpà, ndị otu nzuzo, ndị ohi, ndị wàyo, na ndị omekoome ndị ọzọ jiri yibe ndị mmadụ égwù n'Ọnịtsha nà ná mpaghara ebe ndị ọzọ dị na gburugburu ahụ (ọkachasị ndị bịara ọhụrụ, ndị na-eme njem, ndị machaghị ala ebe ahụ). Ha na-apụnarakwa onye nọ n'ime ụgbọala apị ekwentị ya maọbụ na-aza ekwentị, tinyere ọtụtụ ihe ọjọọ ndị ọzọ ha na-eme ebe ahụ. 

Nke a so n'otu ihe chuzịrị ọchịchị Gọvanọ Willie Obianọ ụra oge ọ batara n'ọkwa ọchịchị, nke mezịrị o jiri wepụta atụmatụ nchekwa dị iche iche, dịka 'Operation Kpochapụ' (nke mbụ na nke abụọ), iji weta ya bụ ajọ ọnọdụ n'isi njedobe. N'agbanyeghị ihe niile ọchịchị Obianọ na ndị ọrụ nchekwa megoro na ezi mbọ ha gbagoro iji memilaa akparamagwa ọjọọ ahụ a na-ahụta n'Ọnịtsha; ụfọdụ ndị ọjọọ ahụ fooro ntutu taa, sị na ha agaghị esepu aka n'ime mpụ, bụkwazị nke mere ndị mmadụ jizịrị malite ime ha 'e jide, e gbuo' n'ebe ndị, maka na ọ na-abụ anụ gbaba ebeghị ebe, dịnta agbaba atụghị atụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484