N'Anambra, Ndị Na-azụ Añụ Emerùbela Ụbọchị Añụ Nke Ahọ 2021

May 25, 2021 - 22:00
 0
N'Anambra, Ndị Na-azụ Añụ Emerùbela Ụbọchị Añụ Nke Ahọ 2021

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ dịka ndị na-azụ añụ (bụ ndị na-emepụta mmanụañụ) nọrọ n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra wee merùbe mmemme ụbọchị añụ na mba ụwa, nke ahọ 2021.

Mmemme imerùbè óké ụbọchị ahụ bụ nke a chịkọbàrà site n'aka ụlọọrụ 'Gist AGRICA' na ụlọọrụ 'Medical Honey Bees Farm Nigeria', ma bụrụkwa nke e jiri inye ọzụzụ na nkụzi were mkpụrụ ụbọchị atọ (banyere ịzụ añụ na imepụta mmanụañụ) wee merùbe.

N'okwu ya na mmalite mmemme ahụ, onyeisi ụlọọrụ 'Gist Africa' bụ Nwaada Ekwi Ajide kọwara na ebumnobi mmemme ahụ na ọgbakọ nkụzi ahụ bụ iji gbasàá ozi banyere mmanụañụ, imepụta mmanụ, usoro mmepụta ya, na ihe ndị ọzọ na-enye aka n'imepụta ya, tinyere mkpà ihe ndị ahụ na nchekwa ha dịgasị na gburugburu.

Ọ kọwara ụbọchị ahụ dịka nke dị oke mkpà, bụ nke mezịrị òtù mba ụwa 'United Nations (UN)' jiri wee wepụta ya; ma kọwakwa añụ na ịzụ añụ dịka ihe dịka ihe bara oke uru n'ịkwalite ọnọdụ ahụike, ọnọdụ gburugburu, na ọnọdụ akụnụba, tinyere ọtụtụ uru ndị ọzọ ha bàrà.

O mere ka a mara na ọ dị mkpa ịkụziri ndị na-azụ añụ, ndị na-emepụta mmanụañụ na ndị nwere mmasị n'ihe ndị ahụ etu e si eme ya, maka na ọ na-adị mma mmadụ ịma banyere ahịa ọ na-azụ nke ọma, maka ọghọm; bụzị nke mere ha jiri wee chịkọba ọgbakọ ọzụzụ ahụ iji merùbe mmemme ụbọchị ahụ nke ahọ a. 

O kwukwara na ọzụzụ ahụ ga-enye aka ime ka ndị chọrọ isonye n'ịzụ añụ na imepụta mmanụañụ mara banyere ya, jiri ya na-akpata ego, kwàlite ọnọdụ obibindụ ha na nke ndị ọzọ, ma gbaara ụbịam ọdọ, ya na ajọ mmetụta nke sitere n'oge ọrịa korona, na ihe ndị so ya wee bịa.

Na nkụzi ya na mmemme ahụ, onyeisi ụlọọrụ 'Majesty Honey Farms', bụ Maazị Emeka Okafor kọwààrà ndị sonyere na mmemme n'ọzụzụ ahụ ọtụtụ uru dị n'ịzụ añụ, etu e si eme ya, na ihe ọ ga-ewè (n'ụdị ego) iji malite ya, tinyere ihe ndị ọzọ ha kwesiri ịma banyere ịzụ añụ na imepụta mmanụañụ.

Ọ kpọkukwazịrị ọhaneze na gọọmentị ka ha tinye anya nke ukwuu n'ịzụ añụ na imepụta mmanụañụ n'ihi na nke ahụ bụ ohere ọrụ na ihe omume na-enye ego nke ukwuu, tinyere ọtụtụ úrù ndị ọzọ nke ahụ na-ewèta, ọbụladị dịka ọ kpọrọ òkù ka onye ọbụla tinye aka n'ichekwaba ụmụ ihe ndị ọzọ dị iche iche na-enye aka n'usoro mmepụta mmanụañụ, dịka olokorombụba, ụsụ, nnụnụ, na ụfọdụ ahụhụ, anụmanụ na anụufe ndị ọzọ.

N'okwu ha n'otu n'otu, ụfọdụ ndị sonyere n'ọgbakọ nkụzi ahụ kèlèrè ndị chịkọbàrà ya, ma gbaa akaebe na nke ahụ emeela ka ha mara ọtụtụ ihe dị iche iche ha amaghị banyere ịzụ añụ na imepụta mmanụañụ, ọbụladị dịka ha kwèrè nkwà na ha ga-etinye ihe niile ha mụtàrà ebe ahụ n'ọrụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484