N'Anambra, Ndị Ọrụ Nchekwa Awakpòla, Memìlaa Ndị Omekoome n'Ọhịa Lilu

Jan 19, 2022 - 21:30
 0
N'Anambra, Ndị Ọrụ Nchekwa Awakpòla, Memìlaa Ndị Omekoome n'Ọhịa Lilu

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ bụ ọ̀gụ̀ mmeri nyégárá ndị ọrụ agha ala Nigeria na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ, oge ha jikọtara onwe ha ọnụ wee wakpo ma buso ndị ojiegbe na ndị omekoome agha n'ebe nzuzo ha n'ime ọhịa dị na Lilu, n'okpuruọchịchị ime obodo Ihiala, dị na steeti Anambra.

Ọ dị ncheta na Lilu, bụ́ obodo gbara steeti Anambra na steeti Imo agbatobi nọrọ n'ime ọnwa olenaole gara aga wee bụrụzie ebe ndị omekoome na ndị ojiegbe jupụtara ma na-akpakwa ajọ ike na ụdị arụ dị icheiche, nke gụnyere ịwakpò, ịtọrọ, na imemila ndụ ụmụ mmadụ, ịpụnara ndị mmadụ ụgbọala ha.

Nke ahụ tinyèzịrị ndị bi na gburugburu ebe ahụ na nnukwu ọnọdụ ihe egwù, ma mekwa ka ọtụtụ n'ime ha gbafuo, pụọ na mpaghara ahụ, ma gaa biri ebe ọzọ. Ya bụ akụmakụ na arụrụala ndị omekoomè gàkwàrà n'ihu na-agbasàwanye n'obodo ndị ọzọ dịkwa na gburugburu ebe ahụ, tínyéré Ezinifite dị n'okpuruọchịchị 'Nnewi South'.

Ọ bụ n'ihi nke a ka ndị ọrụ agha ala Nigeria na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ jiri nọrọ na nsonso a, jìkọta onwe ha ọnụ, wee wakpò ebe nzuzo ndị omekoome ahụ dị n'ime ọhịa dị n'obodo Lilu, bụkwa ebe ha na-anọkarị were akụ ụfọdụ akụmakụ ha dị icheiche; wee buso ha agha dị egwù, ma gbagbukwa ọtụtụ n'ime ha.

Dịka ozi a kụpụrụ site n'aka onyeisi ngalaba na-ahụ maka mgbasaozi n'ụlọọrụ agha ala Nigeria, bụ 'Brig. General' Onyeama Nwachukwu siri kọwaa; ọ bụ ụbọchị Mọnde ka ndị ọrụ nchekwa ahụ jere ọrụ ahụ. Ọ kọwara na ndị omekoome ahụ busòrò ha agha ngwangwa ha hụrụ ha, ha na ha wee màlite ịkwà mgbọ, bụzị nke e sitere na ya wee gbugbuo ọtụtụ n'ime ndị omekoome ahụ.

Ọ kọwàkwàrà na ha nwètègasịrị ihe dị icheiche n'aka ndị omekoome ahụ nà n'ebe nzuzo ahụ, nke gụnyere ọtụtụ ụdịrị égbè dị icheiche na ọtụtụ mgbọ egbe, mmà, uwe ndị ọrụ agha, ọkọlọtọ ndị òtù IPoB, ekwentị, igwe kọmputa (laptọọpụ), tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ, na ngwaọgụ ndị ọzọ.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ ndị ọrụ agha ala Nigeria (mpghara nke 82), ndị ọrụ agha mmiri, mpaghara '211 Quick Response Group' nke ndị ọrụ agha elu, ndị ọrụ nchekwa 'Department of State Services (DSS) na ndị ọrụ uweojii ala Nigeria jikọtara onwe ha wee rụọ ya bụ ọrụ dimkpà, bụ nke ha haziri ma tụkwa atụmatụ ya nke ọma.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484