N'Anambra, Ndị Uweojii Anwụchiela Mmadụ Abụọ Maka Igbu Ọchụ

Nov 12, 2020 - 15:48
Jan 30, 2021 - 15:48
 0
N'Anambra, Ndị Uweojii Anwụchiela Mmadụ Abụọ Maka Igbu Ọchụ

Izunna Okafor

Ọ bụ ihe doro anya na ụbọchị niile nwèrè ike bụrụ nke onye ohi, mana otu ụbọchị ga-abụrịrị nke onye nwe ụlọ, maka na ọ na-abụ ihe emeghị n'izù, ò méé n'ọnwa.

O wee bụrụ etu ahụ ka aka ndị uweojii steeti Anambra siri nwụchikọọ mmadụ abụọ a na-enyo enyo na aka ha dị n'ogbugbu ahụ e gburu otu nwa amadi a maara dịka Maazị Azubuike Ekwegbalu.

Nke a bụ nke e mere ka ụwa mara site n'ọnụ onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti ahụ, bụ Maazị Haruna Mohammed, site n'ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ na nsonso a bànyéré nke ahụ.

Ọ dị ncheta na onye/ndị omekoome nọrọ n'abalị iteghete nke ọnwa asatọ nke ahọ a wee gbuo Maazị Ekwegbalụ, bụ nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye Gọvanọ Willie Obianọ n'ihe gbasaara nchekwa. Ya bụ nwa amadi gbara ahọ iri anọ na atọ ka e kwuru na ọ bụ onye obodo Ogbunike dị n'okọuru ọchịchị Oyi, ma bụrụkwa onye e gburu n'ebe obibi ya dị n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra, n'àgbàtà elekere mbụ na elekere abụọ nke ime abalị.


Dịka Maazị Mohammed siri kwuo, ndị uweojii banyere ọrụ ozigbo iji nwụchikọọ ndị kpara arụ ahụ. O mezịrị ka ha mara na ha nọrọ na nsonso a wee nwụchikọọ mmadụ abụọ a na-enyo enyo na aka ha dị n'ogbugbu ahụ e gburu nwa amadi ahụ.

O kwuru na mmadụ abụọ ahụ e jidere gụnyèrè Maazị Osita John (bụ nwata nwoke gbara ahọ iri abụọ na otu, ma bụrụkwa onye Ifite-Ọgwarị dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Ayamelum nke steeti Anambra, ma biri na mpaghara Agụ Awka); na Maazị Achewa Musa (bụ nwata nwoke gbara ahọ iri abụọ na asaa ma bụrụ onye Abinsel dị n'okpuru ọchịchị Guma nke steeti Benue, ma biri na mpaghara Amansea Garki na steeti Anambra).

O kwuru na ndị ahụ ekwetala ma gbaa akaebe na ọ bụ ha gburu ya bụ nwoke oge ha wakpòrò ya n'ebe obibi ya ma were mmà sụọ ya n'afọ, sụgide ya, ma sụgbuo ya, n'ihi okwu banyere otu nzuzo. Ha jikwara ekwentị ya abụọ wee pụọ oge ha gbuchara ya.

Ihe dị iche iche e nwetara n'aka ndị ahụ gụnyèrè ekwentị abụọ nke nwa amadi ahụ ha gburu egbu, na otu obere mma dị nkọ a na-enyo ènyò na ọ bụ ya ka ha jiri wee sụgbuo ya bụ nwoke ụbọchị ahụ.

SP Mohammed mekwazịrị ka a mara na a ka na-eme nnyòcha bànyere arụrụala ahụ, ma sịkwa na a ga-akpụpụ ndị ahụ ụlọikpe ma ọ bụrụ na e mechaa nnyocha ahụ, ebe a ga-anọ jiri usoro iwu wee gwọọ ha ji mmanụ.

N'okwu nke ya, onyeisi uweojii na steeti Anambra, bụ CP John Abang mere ka a mara na e nweghị ebe nzuzo ọbụla maka ndị ohi, ndị arụrụala, ndị otu nzuzo, nakwa ndị omekome ndị ọzọ dị iche iche n'ime steeti Anambra.

O nyekwara ndụmọdụ ka onye ọbụla hie asaa n'anya n'ihi ihe dị iche iche na-emezị ugbua. Ọ gwakwara onye ọbụla ka ọ kpọtụrụ ha bụ ndị uweojii site n'akàrà ekwentị 07039194332 oge ọbụla ọ hụtara maọbụ dabà na n'ọnọdụ dị añaa, iji gbatara ya ọsọ enyemaka.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.