N'Anambra, Ndị Uweojii Anwụchiela Mmadụ Atọ Maka Ohi

Jan 28, 2021 - 04:34
 0
N'Anambra, Ndị Uweojii Anwụchiela Mmadụ Atọ Maka Ohi

Izunna Okafor


Mmadụ atọ nọ n'aka ndị uweojii steeti Anambra ugbua achaghasị anya ka òké a pịara isi n'ala, dịka a nwụchiri ha na nsonso a maka itinye n'ihe metụtara izu ohi na itinye aka n'ụfọdụ ihe ndị ọzọ na-ewèta ala adịghị mma.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti Anambra, bụ Haruna Mohammed bụ ya gbara nke a n'anwụ site n'ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ na nsonso a n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ.

O kwuru na mnwụchi ahụ a nwụchiri ndị ahụ bụ nke dabara adaba n'ịga n'ihu n'agha ahụ ha bụ ndị ọrụ nchekwa na-ebu megide mpụ na arụrụala na ịchụ ndị omekoome ọsọ ụkwụ erughịala n'ime steeti ahụ.

O mere ka a mara na mmadụ atọ ahụ a na-enyo enyo bụ ndị a nwụchikọrọ n'abalị iri abụọ na abụọ nke ọnwa a na Nkpor dị n'okpuru ọchịchị 'Idemili North' site n'aka ndị uweojii nọ na mpaghara Isiowulu, site na njikọaka ha na ndị ọrụ nchekwa obodo, oge ha nwètachara òkù mberede banyere akụmakụ ndị omekoomè ahụ, nke mezịrị ka ha wụchaa n'ebe ahụ, ma nwụchikọọ ha.

O kwuru na mmadụ atọ ahụ  gụnyere Maazị Chukwuebuka Oguejiofor (gbara ahọ iri abụọ na otu, ma bụrụkwa onye obodo Umueshi Abogwu, dị n'okpuru ọchịchị ome obodo 'Ideato North' nke steeti Imo), Maazị Joel Dickson (gbara ahọ iri abụọ ma bụrụ onye obodo Itu Ikpe, dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Ikot Ekpene North' nke steeti Akwa Ibom), na Maazị Uchenna Uzoechi (gbara ahọ iri na iteghete, biri na mpaghara Okpoko, ma bụrụ onye obodo Aguobu Owa, dị n'okpuru ọchịchị 'Ezeagu North' nke steeti Enugu).

Ya bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii gara n'ihu kọwaa na ndị ahụ wakpòrò otu nwoke na Nkpor, zuo ya ohi ma tie ya gwoogwoo, ma si ebe ahụ pụọ, gaa na mpaghara 'Limca Road' Odume, bụ ebe ha nọkwara wee wakpò mmadụ ise ọzọ, tupuu aka ndị uweojii wee nwụchie ha.

Dịka o siri kọwaa, ihe dị iche iche e nwetara n'aka ndị ahụ gụnyere mmà abụọ, ekwentị atọ, na otu Keke nwere akara efere Owerri 961 WJ, ma bụrụkwa nke ha ji akụ akụmakụ ha.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ndị uweojii na steeti Anambra, bụ CP John Abang kelere ndị Anambra maka inyere ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa aka site n'inye ha ozi dị mkpà ga-enye aka ịkwàlite ọrụ nchekwa ha, ma kpọkuo ha ka ha gaa n'ihu ime nke ahụ n'ihi na ọ bụ site n'ụdị njikọaka na ịrụkọ ọrụ ọnụ dị etu ahụ ka a pụrụ isi gaa n'ihu na-enweta mmeri n'agha ahụ a na-ebu megide mpụ na arụrụala n'ime steeti ahụ.

Dịka ọ na-ekwenwò nkwa na ndị uweojii steeti ahụ agaghị ada mbà n'inye Ndị Anambra ezi nchekwa bụ ịgbà, CP Abang nyekwazịrị ntụziaka ka e nyefèé okwu ahụ n'aka ngalaba 'State Criminal Investigation Department' dị n'Ọka (Awka) maka ime nnyocha miri émi banyere ndị omekoome ahụ na arụrụala ha ahụ ha rụrụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.