N'Anambra, Onye Ọgbaatumtum Anwụọla n'Ihe Mberede Okporoụzụ

May 4, 2021 - 17:48
 0
N'Anambra, Onye Ọgbaatumtum Anwụọla n'Ihe Mberede Okporoụzụ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Otu nwoke na-ányà ụgbọala zùtèrè ọnwụ mberede ya na nsonso a n'ajọ ihe mberede okporoụzọ dapụtara na steeti Anambra.

Ihe mberede okporoụzọ ahụ bụ nke mere ụbọchị Mọnde ma bụrụkwa nke dapụtara n'Uli, dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Ihiala nke steeti ahụ.

Dịk ozi a kụpụrụ site n'aka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ụlọọrụ 'Federal Road Safety Corps' n'ime steeti Anambra, bụ SRC Florence Edor siri kọwaa, ihe mberede okporoụzọ ahụ bụ nke dapụtara n'etiti ụgbọala 'Nissan Caravan' (nwere ákàrà GDD 623 XA) na onye ọkada amaghị onye ọ bụ, onye nya ọgbaatumtum Kasea enweghị ákàrà.

O kwuru na ndị ọnọmgbeomere na-akọwa na ọ bụ ịgba oke ọsọ nà erubeghị isi nye iwu na-achị okporoụzọ wètàrà ihe mberede okporoụzọ ahụ, n'ihi na onye ahụ na-anyà ụgbọala ahụ nọ n'oke ọsọ, ebe onye na-anya ọgbaatumtum ahụ nà-agba n'usoro megidere iwu na-achị okporoụzọ, wee ruo mgbe ụgbọala ahụ jiri óké ọsọ wee paịchara ya na onye o bu n'azụ ọgbaatumtum ya.

Ọ sị na ihe mberede ahụ mètụtàrà mmadụ iri na abụọ, nke mmadụ iteghete n'ime ha bụ ụmụnwoke, ebe mmadụ atọ ndị ọzọ bụ ụmụnwaanyị.

Ọ gara n'ihu kwuo na ndị ọrụ FRSC nọ na mpaghara Ihiala bùrù onye ọgbaatumtum ahụ na onye ahụ o bu n'azụ wee gaa ụlọọgwụ 'Our Lady of Lourdes' dị nso ebe ahụ, ebe dọkịta nọrọ wee lelechaa ha ahụ, wee kọwaa na onye nke na-anya ọgbaatumtum ahụ anwụọla. A dọnyezịkwara ozu ya n'ụlọ nchekwa ozu 'Angles Mortuary' dị na mpaghara ahụ; ebe onye nke ahụ o bù n'ọgbaatumtum nwètàrà nnukwu mmerụahụ n'akụkụ ahụ ya dị iche, ma bụrụkwa onye nọ n'ụlọọgwụ ahụ ugbua anara ọgwụgwọ.

Ndị ọrụ FRSC burukwazịrị ụgbọala ahụ na ọgbaatumtum ahụ wee gaa n'ogige ndị uweojii dị na mpaghara Uli, ma gbakwa mbọ hụ na njem na-aga siriri-werere n'ebe ahụ ihe mberede ahụ mere.

N'okwu ya, onyeisi ụlọọrụ FRSC na steeti Anambra, onye kwuru okwu site n'ọnụ DCC Anthony Ozoemena Ogbodo dọrọ ndị na-anya ihe ọnyịnya aka na ntị megide ịgba oke ọsọ na inupu isi n'iwu na-achị okporoụzọ, bụ nke ọ kọwara dịka ihe na-eweta oke ọdachi nà ihe mberede okporoụzọ tagoro isi ọtụtụ ndị mmadụ.

Ọ kasiri ndị ezinụlọ onye ahụ nwụrụ anwụ obi ka ha dìbé, kpee ka mkpụrụobi nwa amadi ahụ zuo ike na ndokwa n'ime Chineke; ma kpekwazie ka onye nke ahụ nwetara mmerụahụ gbakere n'oge adịghị anya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484