N'Anambra, Otu Onye Awụpụla n'Ụgbọala na-Aga Aga, Nwụọ

Dec 15, 2021 - 21:50
 0
N'Anambra, Otu Onye Awụpụla n'Ụgbọala na-Aga Aga, Nwụọ

Izunna Okafor dere akụkọ a


Ozi si n'aka ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka njem awele n'okporoụzọ n'ala Nigeria, bụ 'Federal Road Safety Corps (FRSC)', ngalaba steeti Anambra na-akọwa na otu nwoke anwụọla, ebe mmadụ ise ndị ọzọ nwetere ihe mmerụahụ n'ihe mberede okporoụzọ dapụtara na steeti ahụ na nsonso a.

Onye jigodi ọkwa ugbua dịka onye na-ahụ maka ịkụziri ọhaneze ihe ha kwesiri ịma n'ụlọọrụ FRSC n'ime steeti ahụ, bụ DRC Magaret B. Onabe bụ ya mere ka ụwa mara nke a site n'ozi ọ kụpụụrụ ndị ntaakụkọ na nsonso a n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ.

Dịka o siri kọwaa, ya bụ ihe mberede okporoụzọ dapụtàrà na mpaghara àkwà ọdọmmiri Agụlụ (Agụlụ Lake) n'ogologo ụzọ ahụ siri Agụlụ gaa Nanka, ma bụrụkwa nke mere oge o jiri nkeji iri na ise gata elekere iri anọ nke ụbọchị Mọnde.

O kwuru na ya bụ ihe mberede okporoụzọ metụtara naanị otu nnukwu ụgbọala gwongworo nwere ákàrà ABN625YN, ma kọwaa na ọ bụ ịgba oke ọsọ na ngharịpụ nke breeki kpatara ya bụ ihe mberede okporoụzọ.

O mere ka a mara na ndị ọnọmgbeomere kọrọ na nnukwu ụgbọala ahụ bụ akpa osikapa wee na-awụcha ọsọ oge ọ na-agbada ugwu Agụlụ ahụ, wee ruo mgbe mgbe ụgbọala ahụ pụnahịrị ya n'aka, nke na o nweghịzị ike ijidenwu maọbụ kwụsị ya n'ihi na breeki ya agharịpụla ya.

Ọ bụzị oge ihe ahụ na-eme ka otu nwokorobịa nọ n'ụgbọala ahụ jiri ụjọ wee si n'elu ụgbọala ahụ wụpụ, wee nwụọ ozigbo ahụ, ụgbọala ahụ wee jiri akụkụ daa.

DRC Onabe gara n'ihu mee ka a mara na ihe mberede okporoụzọ ahụ metụtara mmadụ isii (nke gụnyere ụmụnwoke anọ na ụmụnwaanyị abụọ), ma kọwaa na otu onye n'ime ha (bụ nwoke) nwụrụ, ebe mmadụ ise ndị ọzọ nwetara mmerụahụ n'ogoogo dị icheiche.

E burukwazịrị ndị ahụ ihe mberede ahụ metụtara wee gaa ụlọọgwụ 'St. Joseph Hospital' dị nso n'ebe ahụ, bụ ebe dọkịta nọrọ wee lelechaa ha ahụ ma gbaa akaebe na otu nwoke n'ime ha, bụ onye ahụ wụpụrụ n'ụgbọala ahụ anwụọla. A dọnyezịkwara ozu ya n'ụlọ nchekwa ozu, ebe ndị ọrụ FRSC gbakwazịrị mbọ bupusie ihe dachisiri ụzọ, iji gbochie inwe agbakata akwụrụ n'ebe ahụ.

N'okwu ya banyere ya bụ ajọ ọdachi, onyeisi ụlọọrụ FRSC na steeti Anambra bụ Maazị Adeoye Irelewuyi dọrọ ndị na-anyà ụgbọala aka na ntị ka ha na-akpachapụ anya oge niile, zèére ịgba oke ọsọ, ma na-elerukwa ụgbọala ha anya nke ọma tupu buru ya pụta iro.

O kwuru na ọ bụ ịgba oke ọsọ na-ewetakarị ọkà n'ọnụọgụgụ ihe mberede okporoụzọ na-adapụta aghara aghara na mpaghara ebe dị iche iche steeti ahụ. O chètààrà ha na oji nwanyọ anaghị emerụ ahụ, ma dụọ ha ka ha zèére ịgba oke ọsọ, ọkachasị ugbua a na-achọkwa ịbànye na mmemme ekeresimeesi kpọmkwem.

Dịka ọ na-ekpe ka onye nke nwetara mmerụahụ n'ihe mberede okporo ụzọ ahụ gbakere ngwangwa, CC Irelewuyi kasikwazịrị ezinụlọ onye nke ha nwụrụ anwụ obi, kpee ka Chineke nabata ma nye mkpụrụ obi onye ahụ nwụrụ anwụ ezumike udo.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484