N'Anambra, Otu Onye Bu Mmanụ E Zuru Ezu Agba Ọsọ Anwụọla n'Ihe Mberede Okporoụzọ

Nov 12, 2021 - 23:00
Nov 12, 2021 - 23:01
 0
N'Anambra, Otu Onye Bu Mmanụ E Zuru Ezu Agba Ọsọ Anwụọla n'Ihe Mberede Okporoụzọ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ozi si n'aka ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka njem awele n'okporoụzọ n'ala Nigeria, bụ 'Federal Road Safety Corps (FRSC)', ngalaba steeti Anambra na-akọwa na otu nwoke anwụọla n'ihe mberede okporoụzọ dapụtara na steeti ahụ na nsonso a.

Onye jigodi ọkwa ugbua dịka onye na-ahụ maka ịkụziri ọhaneze ihe ha kwesiri ịma n'ụlọọrụ FRSC n'ime steeti ahụ, bụ DRC Margaret B. Onabe bụ ya mere ka ụwa mara nke a site n'ozi ọ kụpụụrụ ndị ntaakụkọ na nsonso a n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ.

Dịka o siri kọwaa, ya bụ ihe mberede okporoụzọ dapụtàrà na mpaghara Okeọhịa, nke okporoụzọ awara-awara ahụ siri Ihiala gaa Owerri, ma bụrụkwa nke metụtara ụgbọala abụọ, nke gụnyere ụgbọala bọọsụ na-ebu ndị njem (nwere akara NKK-314-VT), nà ụgbọala gwongworo enweghị akara.

O kwuru na ndị ọnọmgbeomere kọwàrà na ọ bụ ịgba oke ọsọ kpatara ihe mberede okporoụzọ ahụ.

Ọ kọwakwara na onye na-anyà ụgbọala bọọsụ ahụ bù mmanụ agbidi e zuru n'ohi wee na-agba oke ọsọ, nke mezịrị na o nweghịzị ike ijidenwuzị̀ ụgbọala ya, o wee jiri ọsọ ahụ gbakwuru ma suo otu nnukwu ụgbọala gwongworo ahụ nọọrọ onwe ya.

O kwukwara na ngwangwa onye nwe ụgbọala gwongworo ahụ chọpụtara ihe mere, o jiri ọsọ ozigbo makpuo n'ime ụgbọala ya, ma nyàrá ya rie mbọmbọ ọsọ, nke mezịrị na ndị nọ ebe ahụ enweghịzị ike ihụ maọbụ nweta ozi ọbụla banyere ya maọbụ ụgbọala ya.

DRC Onabe gakwazịrị n'ihu kwuo na mmadụ ise nọ̀ n'ime ụgbọala bọọsụ ahụ oge ya bụ ihe mberede okporoụzọ dapụtara, nke gụnyere ụmụnwoke anọ na otu nwaanyị.

Ọ kọwakwara na otu onye n'ime ụmụnwoke anọ ahụ, bụ onye nke nya ụgbọala ahụ oge ahụ nwụrụ ozigbo ozigbo ahụ ya bụ ihe mberede mere, ma bụrụkwazie onye a dọnyere ozu ya n'ụlọ nchekwa ozu 'Our Lady's Mortuary Ihiala' oge dọkịta nọ n'ọrụ ebe ahụ lelechaara ya ahụ wee gbaa akaebe na ọ nwụọla.

O kwuru na ndị ọrụ FRSC na ndị uweojii si na mpaghara Ihiala gbàsikwazịrị mbọ ike ma bupù ụgbọala ahụ n'ụzọ, iji hụ na e nweghị 'agbakata akwụrụ' n'okporoụzọ ahụ

N'okwu nke ya banyere ihe mberede okporoụzọ ahụ, onyeisi ụlọọrụ FRSC na steeti Anambra bụ Maazị Adeoye Irelewuyi dọrọ ndị na-anyà ụgbọala aka na ntị ka ha na-akpachapụ anya oge niile, zèére ịgba oke ọsọ, ma jirikwa nwayọ na uchè na-anyà ụgbọala. 

O kwuru na ọ bụ ịgba oke ọsọ na-ewetakarị ọkà n'ọnụọgụgụ ihe mberede okporo ụzọ na-adapụta aghara aghara na mpaghara ebe dị iche iche steeti ahụ. O chètààrà ha na oji nwanyọ anaghị emerụ ahụ, ma dụọ ha ka ha zèére ịgba oke ọsọ, ọkachasị ugbua a na-achọkwa ịbànye na mmemme ekeresimeesi kpọmkwem.

CC Irelewuyi kasikwazịrị ezinụlọ onye nke ha nwụrụ anwụ obi, kpee ka Chineke nabata ma nye mkpụrụ obi onye ahụ nwụrụ anwụ ezumike udo.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484