N'Anambra, Ụlọọrụ NEMA Ekesàárála Nsogbu Ndị Ijummiri Metụtara Ihe Nkwàdó

Dec 19, 2021 - 22:19
 0
N'Anambra, Ụlọọrụ NEMA Ekesàárála Nsogbu Ndị Ijummiri Metụtara Ihe Nkwàdó

Izunna Okafor dere akụkọ a


Òtù ahụ na-ahụ maka gbanụgbanụ na ijikwa ọnọdụ ntụmadụ n'ala Nigeria, bụ ụlọọrụ 'National Emergency Management Agency (NEMA) ekesàála ihe nkwàdo na ihe enyemaka dị icheiche nyegara ndị nsogbu ijummiri na oke ifufe metụtara n'ime steeti Anambra na mgbe gara aga.

Ya bụ ihe enyemaka na ihe nkwàdo bụ nke ọ bụ gọọmenti etiti butere, ma bụrụkwa àgbà nke abụọ ya e kesààrà. Ọ bụkwa obodo dị icheiche dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Ayamelum, Anambra East na Anambra West ka e kesààrà ya bụ ihe enyemaka, bụ ebe ijummiri na oke ifufe bibìsiri ihe a kọrọ n'ugbo, ụlọ ndị mmadụ na ọtụtụ ihe ndị ọzọ n'oge gara aga.

Ọ bụzị n'ihi nke ahụ ka gọọmenti etiti jiri kwàdo ka e bute ma kesàá ihe enyemaka ahụ nyegara ndị ahụ ọdachi ahụ metụtara. Ihe dị icheiche e kesààrà ndị ahụ gụnyèrè nri, akụrụngwa e ji agba mmiri, akụrụngwa e ji akwa akwa, nke e ji akpà isi, nke e ji akwọ ihe, tinyere ihe ndị ọzọ.

N'okwu ya oge ọ na-ekesara ndị ahụ ihe ahụ n'isi ụlọọrụ 'Anambra State Emergency Management Agency (SEMA)' onyeisi ụlọọrụ NEMA, bụ Maazị Mustapha Habib Ahmed gosipụtara obi mwute ya banyere ọnụọgụgụ ihe ijummiri na oke ifufe ahụ mebisiri, ma kọwaa na ebumnobi e ji ekesara ha ihe ahụ bụ iji tie ha aka n'obi na iji nyere ha aka inwe ebe ha si aracha mmanụ, maka na ọ bụ ihe doro anya na a pụghị iweghàchi ihe ndị ahụ mmiri na oke ifufe bibisiri.

Maazị Ahmed, nke onye nọchitere anya ya na mmemme ahụ bụ onyeisi ụlọọrụ ahụ na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ, bụ Maazị James Eze, dụkwazịrị ha ọdụ ka ha jiri ihe ahụ wee na-emechagharị aka ma tinyekwa ha n'ọrụ nke ọma, maka ịchụta ihe ha na ezinụlọ ha ga na-eri, wee ruo mgbe ọnọdụ tụgharịịrị ha nke ọma.

Ka ọ na-ekele ụlọọrụ NEMA n'aha gọọmenti steeti Anambra, onyeisi ụlọọrụ 'Anambra State Emergency Management Agency (SEMA)', bụ Maazị Paul Odenigbo nyere nkọwa banyere ya bụ akụrụngwa na ihe nkwàdo ahụ e kesàrà, ma kelekwa gọọmenti etiti banyere ezi ọrụ ya ahụ, ichètà ndị ahụ na imezu nkwà o kwere. O kpekwazịrị ka ụdị ihe ntụmadụ ahụ dakwasịrị ndị hụ ghara ịdapụta ọzọ, ọbụladị dịka ọ kpọkuru onye ọbụla ka ha na-eke nkwụcha nke ukwuu oge niile.

N'okwu nke ya n'aha ndị ọzọ, ụfọdụ n'ime ndị ahụ ritere uru n'ihe ahụ e kesàrà ụbọchị ahụ, nke gụnyere Maazị Mike Osita (onye e bunyere akụrụngwa e ji agba mmiri) na Oriakụ Chika Okafor (onye e bunyere akụrụngwa e ji eme isi) kèlèrè ụlọọrụ NEMA maka ezi mgbataọsọ enyemaka ha, gbaa akaebe na ihe ahụ ga-enyere ha aka ịchụta ihe ha na ezinụlọ h ga-eji na-aracha mmanụ, ma kwekwazie nkwà itinye ihe ndị ahụ n'ọrụ etu o kwesiri m jiri ha mepụta ihe a hụrụ anya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484