N'Awka, Ashbishọp Ibezim Ebikwasala Mmadụ 54 Aka n'Isi, Nabata 49 n'Òtù Ụmụnwaanyị nà Òtù Ụmụnwoke

Dec 8, 2021 - 19:49
 0
N'Awka, Ashbishọp Ibezim Ebikwasala Mmadụ 54 Aka n'Isi, Nabata 49 n'Òtù Ụmụnwaanyị nà Òtù Ụmụnwoke

 Izunna Okafor dere akụkọ a

A dụọla ndị otu Kraịst ọdụ ka ha bie ndụ ịdị ọcha na ịdị nsọ, n’agbanyeghị ihe dị icheiche na-emegasị na gburugburu ha na n'ebe ọbụla ha hụtara onwe ha

Ashbishọp nke mpaghara Niger ma bụrụkwa Bishọp nke Dayọsis Awka, bụ 'His Grace, Most Reverend' Alexander Chibuzor Ibezim bụ ya nyere ndụmọdụ a n'okwuchukwu ya na mmemme ofufenrò ibikwàsa aka n'isi ikpeazụ ya n'ime afọ 2021, nke e mere n'ụlọụka 'Chapel of Redemption' nke Mahadum Nnamdi Azikiwe, dị n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra.

Ya bụ ofufènrò wééré ọnọdụ ụbọchị Tuzdee, nụ nke ọtụtụ ndị mmadụ sonyere na ya, ma bụrụkwa nke Ashbishọp Ibezim nọrọ na ya wee bikwàsa mmadụ 54 aka n'isi, nabàta ụmụnwoke ruru iri abụọ na otu n'ọnụọgụgụ n'otu ụmụnwoke dayọsis ahụ, nabàtakwa ụmụnwaanyị ruru iri abụọ na asatọ n'otu ụmụnwaanyị dayọsis ahụ, bụ ndị sitere ụlọụka 'Anglican Church of Redemption Parish, Awka' na ụlọụka 'Chapel of Redemption, Unizik, Awka'.

N’okwuchukwu ya n'ebe ahụ, Ashbishọp Ibezim, onye okwuchukwu ya gbadoro ụkwụ n'ịdị ọcha, kọwara ịdị ọcha dịka ọmarịcha omume ọma na onyinye nke mmụọ nsọ, ma kwukwa na mmadụ apụghị ịba alaeze Chineke ma e wezuga ịdị ọcha na ịdị nsọ.

Ọ sị, “Ọ bụrụ na ị dịghị ọcha, ị ga-abụ onye iro nke Chineke;  ọ dịghịkwa onye iro Chineke nke pụrụ inwe ọganihu maọbụ bàá n'alaeze eligwe. Ịdị ọcha bụ àgwà ọma na onyinye magburu onwe ya. "

Ọ rụtụrụ aka na ndụ Joseph nke Akwụkwọ Nsọ dịka ezi ihe atụ nke onye ghọtara ịdị ọcha, bụ nke o gosipụtara mgbe ọ jụrụ ịkwasò nwunye nna ya ukwu bụ Potiphar iko - bụ ọnyà nke Ekwensu debere iji bibie nrọ ya, akaraka na ọdịnihu ya.

Ọ gbadoro ụkwụ n'akwụkwọ Matiu 5:8 na Luk 24:49 wee kwuo na ndị dị ọcha ga-ahụ Chineke, kwukwa na Mmụọ Nsọ adịghị adakwasị ndị ajọ omume na ndị na-adịghị ọcha, kama na ọ bụ nanị ndị dị ọcha na ndị dị njikere ịnara Ya.

Mgbe a na-adọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha sepu aka n'ọgwụike mkpụrmmmiri na n'ihe ndị ọzọ na-eme ka mmadụ ghara ịdị ọcha, ya bụ nnukwu onyeisi nchụaja n'ụka Angịlịkan rịọrọ ndị ahụ e bikwàsàrà aka n'isi ụbọchị ahụ na ndịikom na ndịinyom ahụ a nabatara ọhụrụ ka ha na-edebe onwe ha ọcha, ma gharakwa imerụ onwe ha site n'ihe ndị na-eme gburugburu ha, ebe ha hụtara onwe ha, maọbụ usoro ụwa si eme ihe.

N'ajụjụọnụ ndị ntaakụkọ gbara ha, ụfọdụ ndị nna ahụ a nabatala ọhụrụ n'otu ụmụnwoke, nke gụnyere Maazị Chibueze Ughalaa, Maazị Ifeanyi Okedinachi na Maazị Caleb Okechukwu kèlèrè Chineke maka ime ka nnabata ahụ gaa nke ọma, ma kwe nkwa na ha ga-anọgide na-aga n'ihu ịbụ nna dị ọcha n'ezinaụlọ ha dị icheiche nà ikwe ka Chineke jiri ha na-akwara ngwaọrụ ịgbasa alaeze Ya.

N’okwu nke ya n’aha ndị ọzọ, otu n’ime ụmụnwaanyị ahụ a kpọbatara n’òtù ụmụnwaanyị, bụ Oriakụ Chinonso Ikwuemesi gosipụtara ekele ya n’ebe Chineke nọ maka ohere o nyere ya ịbụ onye òtù ụmụnwaanyị na Dayọsis ahụ, ọbụladị dịka o kwupụtànwòrò na ọ ga-edebe iwu òtù ụmụnwaanyị ahụ, bụkwa nke gbadoro ụkwụ n'ime -ka ha bụrụ ezi nne.

N'akụkụ nke ya, otu onye n'ime ndị ahụ e bikwasara aka n'isi ụbọchị ahụ, bụ obere nwaada Chinemerem Joy Nnyigide (nwa akwụkwọ nọ n'ogo praịma nke ise), bụkwa onye Ashbishọp Ibezim nyere onyinye Akwụkwọ Nsọ ụbọchị ahụ maka ụbụrụ nkọ ya, kèlèrè onye kwadoro ha maka ụbọchị ahụ, bụ Maazị Uche Uwaezuoke; ndị nne na nna ya, bụ Maazị Sunday Nnyigide na Ọkammụta Nkọlị Nnyigide, na ndị ọzọ nyere aka kwado ya na ndị òtù ya maka ya bụ ụbọchị. O kelekwara Ashbishọp maka okwuchukwu ya na onyinye Akwụkwọ Nsọ ahụ o nyere ya, ma kwe nkwa na ọ ga-aga n'ihu na-atụgharị uche n'Okwu Chineke kwa ụbọchị, ka o wee bie ndụ ịdịọcha na ịdịnsọ, dịka Ashbishọp siri gwa ha.

Mmemme ahụ dọtara nwunye Ashbishọp Ibezim, onye bụkwa onyeisi òtù ụmụagbọghọ, otu ụmụnwaanyị na otu ndị nne n'ime dayọsis ahụ nà ná mpaghara Niger, bụ Oriakụ Martha Chioma Ibezim;  onyeisi nchụaja n'ụlọụka 'Anglican Church of Redemption, Awka', Ven.  Obiorah Alokwu na nwunye ya bụ Oriakụ Stella Alokwu; onyeisi nchụaja n'ụlọụka ụlọụka 'Chapel of Redemption, Unizik Awka', bụ Ven.  John Anyachebelu na nwunye ya bụ Oriakụ Anyachebelu; tinyere Ụkọchukwu Lucky Onebunne nke n'ụlọụka 'Anglican Church of Redemption, Awka' na nwunye ya bụ Oriakụ Chidubem Lucky-Onebunne, na ụfọdụ ndị ụkọchukwu ndị ọzọ na ndị nwunye ha sonyere n'oke mmemme ahụ.

Égwú a gụrụ nà abụ a bụrụ site n'aka ndị otiegwu na ndị ọbụabụ ụlọụka ahụ sokwazị n'ihe mere ka ofufenrò ahụ dàá ụda ma dịkwa ebube n'ezie.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484