N'Awka, Ibezim Emeela Ọgbụgbà Ahọ Iri O Jiri Bụrụ Bishọọpụ

Nov 25, 2020 - 16:04
Jan 30, 2021 - 16:05
 0
N'Awka, Ibezim Emeela Ọgbụgbà Ahọ Iri O Jiri Bụrụ Bishọọpụ

Izunna Okafor

Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ na nsonso a, dịka Bishọọpụ ụka Angịlịkan na dayọsiisi Awka, ma bụrụkwa Achbishọọpụ nke mpaghara Naịjà, bụ Achbishọọpụ Alexander Chibuzor Ibezim merùbèrè ọgbụgbà ahọ iri o jiri bànye n'ọkwa dịka Bisọọpụ dayọsiisi ahụ, nakwa ọgbụgbà otu ahọ o jiri bànye n'ọkwa dịka Achbishọọpụ nke mpaghara Naịjà.

Oke mmemme ahụ e jiri ofufè nrò pụrụ iche wee màlite, bụ nke weere ọnọdụ n'ụlọụka 'Our Saviour's Church' dị n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị ọrụ ụka, ndị ọrụ gọọmenti, na ndị dị iche iche e ji okwu ha agba izù na ngalaba dị iche iche n'ime steeti ahụ na mpụga ya.

N'okwuchukwu ya n'ofùfè nrò ahụ, odeakwụkwọ sinọọdụ na dayọsiisi ahụ, bụ venerabụlụ Clement Mgbemena kọwàrà ụbọchị ahụ dịka ụbọchị pụrụ iche ma ikèlè Chineke n'isi Achbishọọpụ Ibezim na nwunye ya bụ Chioma Ibezim, ma mee ka a mara na ọ bụ Chineke na-eguzobe mmadụ n'ọkwa ma jirikwa aka ya na-edu, na-echekwa, ma na-agbàzi onye ahụ. 

Ọ kpọpụtasịrị ụfọdụ ihe dị iche iche nwa amadi ahụ mepụtàgoro na dayọsiisi ahụ n'ime ahọ iri gara aga, ma kpee ka Chineke gaa n'ihu idu na ịgbà ya ume.

N'okwu nke ya, Achbishọọpụ Ibezim mere ka a mara na ndụ ya jupụtara n'akụkọ ọgbụgba àmà, mee ka a mara na ọrụ ụka akụzierela ya ọtụtụ ihe; ọbụladị dịka o kèlèrè Chineke maka odudu ya na ọrụ ebube Ya n'ime ndụ ya dịka onye ọrụ ụka.

Ọ gbarụrụ ihu bànyere etu ọnọdụ ala Nigeria, ọkachasị ọnọdụ nchekwa siri debe imi na ọnụ ka ntọọ ugbua, ma kpọkuo ndị otu Kraịst ka ha hie asaa naabọ n'anya, ma mụrụkwa anya dịka azụ, ọkachasị n'ime oge mmemme ekeresimesi a na-akpụdobe nso ugbua, n'ihi na ọ na-abụkarị oge ihe ọjọọ dị iche iche na-abawanye ma na-arịkwa ibè ya elu.

Ọ dụrụ gọọmenti n'ogoogo dị iche iche ọdụ ka ha lebanye anya n'ọnọdụ nchekwa ala Nigeria, mpụ na arụrụala, ọnọdụ ụbịam, nakwa ihe ndị ọzọ dị iche iche na-ebi ụmụ mmadụ aka ọjọọ n'ime oge a, iji weta mgbanwe. Ọ kpọkuwkazịrị ndị otu Kraịst ka ha na-atụkwasị obi na Chineke oge niile n'ihi na Ọ naghị agharịpụ ndị dabeere ma tụkwäsị obi na Ya.

N'okwu ọ gwara ndị nta akụkọ, nwunye Achbishọọpụ Ibezim, bụ Oriakụ Chioma Ibezim mere ka a mara na ụbọchị ahụ bụ oke ụbọchị pụrụ iche n'ezinụlọ ha, ọbụladị dịka ọ kpọkuru ndị ụka ka ha nọgidesie ike n'ime Chineke, n'agbanyèghị ihe iche aka mgba dị iche iche ha nwere ike izutè na ndụ ha dịka ndị na-eso ụzọ Kraist.

A nọrọ na mmemme ahụ wee waa achịcha bekee maka oke ụbọchị ahụ, bụọ abụ otutu dị iche iche, ma tụkwara Chineke mmamma, mee emume ịkụ ngazị n'eze, tinyéré ihe ndị ọzọ e mere, nke mezịrị ka ya bụ mmemme zaa aha a kpọrọ ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.