N'Awka, Ụmụnwaanyị Emeela Ngagharịiwe Maka Ọnọdụ Nchekwa

Jun 21, 2021 - 20:51
 0
N'Awka, Ụmụnwaanyị Emeela Ngagharịiwe Maka Ọnọdụ Nchekwa

Izunna Okafor dere akụkọ a


Ụfọdụ ụmụnwaanyị nọrọ na nsonso a wee mee ngagharịiwe n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra, bànyere ajọ ọnọdụ nchekwa ahụ na-arị ibe ya elu na mpaghara ebe dị iche iche n'ala Nigeria ugbua.

Ọ bụ ngalaba ụmụnwaanyị nke òtù nkịtị a maara dịka 'Igbos for a Progressive Nigeria (IPAN)' mere ngagharịiwe a, ma bụrụkwa nke ha mere na mpaghara ụzọ Amawbia dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Awka South', ebe ha nọrọ wee katọọ igbusi mmadụ, nsogbu ajọ ọnọdụ nchekwa, nà imemìlà ndụ ụmụ mmadụ aka ha dị ọcha ma na steeti ahụ ma na mpaghara ebe dị iche iche.

N'okwu ya oge ha na-eme ngagharịiwe ahụ, onye ndu ngalaba ụmụnwaanyị n'òtù IPAN, bụ Oriakụ Juliet Ezenwosu mèrè ka a mara na ya bụ nsogbu ajọ ọnọdụ nchekwa na-echuzị ha ụra ma na-agbazịkwa anyammiri, bụ nke mere ha jiri hụta ya dịka ihe dị mkpà, ịtụnye ụtụ nke ha na olu nke ha iji wèta ya bụ ajọ ọnọdụ na njedobe.

O jikwazịrị aha òtù ahụ wee kpọọ òkù ma rịọ ndị dị iche iche e ji okwu ha agba ìzù, ndịisi ụlọọrụ nchekwa dị iche iche na ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu ka ha biko gbaa mbọ mee ihe banyere ọnọdụ ahụ, iji kwụsị ya bụ nkwafu ọbara ụmụ mmadụ aka ha dị ọcha, ma n'ala Igbo ma na mpaghara ebe dị iche iche n'ala Nigeria. Ọ kpọkwazịrị òkù ka e nwee ịhụnanya nà udo tọrọ àtọ n'ala Nigeria.

Na ntụnye nke ya, onyeisi òtù IPAN n'ala Nigeria, bụ Maazị Lawrence Onuzulike, kpọkuru Ndị Igbo ka ha na-ahụ onwe ha n'anya ma nwee otu obi, iji nweta ihe ha na-achọ. O chètààrà ha na e jighị igbu mmadụ, ịkwafù ọbara nà nsogbu wee mara ha, ma dụọ ha ọdụ ka ha tinye mmà ha n'ọbọ, ma jidekwa iwe ha aka, gbaso udo. 

Maazị Ọnụzulike kpọkukwàrà ndị ndu n'ogoogo dị iche iche n'ala Nigeria, ọkachasị n'ọkwa gọọmenti na n'ụlọọrụ nchekwa dị iche iche ka ha tikọọ isi ọnụ wepụta atụmatụ na usoro kacha mma iji weta ajọ ọnọdụ nchekwa ahụ na ihe na-ewèta ịkpọ ganịganị n'isi njedobe ma mekwa ka udo tọrọ àtọ laghàchi azụ n'ala Nigeria.

Na ntụnye nke ya, otu onye n'ime ụmụnwaanyị ahụ mere ngagharịiwe ahụ, bụ Oriakụ Mabel Daniel kwuru na ha sikwà na ngagharịiwe ahụ wee na-akpọ òkù ka e mee nhọpụta ọchịchị ahụ a na-akwado na steeti Anambra n'ụzọ udo na n'ụzọ ghe anya oghe.

O chètààrà ma gwa ndị na-egwu okwe ndọrọndọrọ ọchịchị na steeti Anambra, ọkàchasị ndị na-esonye na ya bụ nhọpụta ọkwa gọvanọ a ga-eme na steeti ahụ n'abalị isii nke ọnwa Nọvemba, ka ha buru n'obi na o nweghịkwa ihe karịrị ndụ mmadụ. N'ihi ya, ọ dụkwazịrị ha ọdụ ka ha gbaa mbọ hụ na ha gbasoro ụzọ udo, ma oge a na-akwado nhọpụta ahụ, oge a na-eme ya, na oge e mechara ya.

Ndị ahụ na-eme ngagharịiwe ahụ bugàsịkwa akwụkwọ dị iche iche e dere ihe na ya wee mee ya bụ ngagharịiwe, ma bụrụkwa ndị ndị uweojii sònyèèrè oge ha na-eme ngagharịiwe ahụ, iji hụ na e mere ya n'ụzọ iwu kwàdòrò, n'enweghịkwa nsogbu ọbụla dapụtàrà.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484