Nchekwa: Ndị Gọvanọ Ndịda-Ọwụwa Anyanwụ Ehibela "Ebube Agụ"

Apr 12, 2021 - 19:15
 0
Nchekwa: Ndị Gọvanọ Ndịda-Ọwụwa Anyanwụ Ehibela "Ebube Agụ"
Ndị sonyere na mmemme ahụ

Izunna Okafor dere akụkọ a

N'ịgbakwụnyekwu n'ezi agbambọ ha n'iweghachi ezi ọnọdụ nchekwa na mpaghara ahụ, òtù ahụ jikọtara ndị gọvanọ ndịda-ọwụwa anyanwụ ala Nigeria a maara dịka 'South-East Governors Forum' nọrọ na nsonso a wee wepụta ma hibe atụmatụ nchekwa pụrụ iche maka mpaghara ahụ.

Atụmatụ nchekwa ọhụrụ ahụ a kpọrọ "Ebube Agụ" bụ nke ndị gọvanọ ahụ hibere na nnukwu ọgbakọ nchekwa pụrụ iche ndị òtù ahụ nwere, ha na ndịisi ngalaba ọrụ nchekwa dị iche iche na mpaghara ahụ, bụkwa nke weere ọnọdụ n'Owerri, bụ isi obodo steeti Imo.

Ya bụ ọgbakọ bụ nke dọtara ndị gọvanọ niile nke steeti ise e nwere na mpaghara ahụ, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee lebàá anya n'ihe dị iche iche metụtara mpaghara ahụ na ndị Igbo n'izùgbe.

N'okwu ya oge ọ na-ewepụta mpụtara ihe e metere na nzukọ ahụ nà nkwekọrịta ha nwere, onyeisioche òtu ahụ jikọtara ndị gọvanọ ahụ, ma bụrụkwa aka na-achị steeti Ebonyi, bụ Gọvanọ Dave Umahi mèrè ka a mara na ndị òtù ahụ, nke gụnyere Gọvanọ Willie Obianọ nke steeti Anambra; Gọvanọ Hope Uzodimma nke steeti Imo, Gọvanọ Okezie Ikpeazụ nke steeti Abia; na Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyị nke steeti Enugu, jìrì ótù olu wee katọọ mwakpò ndị omekoomè, igbusi mmadụ, mbíbì na ajọ ọnọdụ nchekwa ndị ọzọ na-arịzị ibe ya elu na mpaghara ahụ.

O kwuru na ọ bụzị iji wee weta ya bụ ajọ ọnọdụ nchekwa n'isi njedobe ma wèghachikwa ezi ọnọdụ nchekwa na mpaghara ahụ niile mere ha jiri hibe atụmatụ nchekwa "Ebube Agụ" ahụ.  Ọ gakwara n'ihu kọwaa na isi ụlọọrụ nchekwa ahụ ga-adị na steeti Enugu, ma jirikwazie ohere ahụ kpọọ òkù maka ezi njikọaka n'ọrụ n'etiti ndị ji ọkwa ọchịchị, ngalaba ọrụ nchekwa dị iche iche na ndị ọzọ e ji okwu ha agba ìzù na mpaghara ahụ.

Dịka ótù n'ime nkwekọrịta iri na ise ha nwèrè, ndị òtù ahụ kpọkukwàzịrị gọọmenti ka ọ kwalitekwuo ọnọdụ nchekwa na gburugburu ala Nigeria niile ma kpachapụkwa anya ịhụ na ndị niile ajọ ọndụ nchekwa dakwàsịrị na-enweta ikpe nkwụmọtọ, site n'ịnwụchikọ ndị omekoome ahụ na-eweta ala adịghị mma, kpee ha ikpe ma nyekwa ha ntaramahụhụ kwesiri ha.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484