Ndakpò: Okpotokpo Adaigbo Emeela Ngagharị Iwe n'Awka

Aug 13, 2020 - 20:50
Jan 28, 2021 - 20:53
 0
Ndakpò: Okpotokpo Adaigbo Emeela Ngagharị Iwe n'Awka

By Izunna Okafor

N'iji tụnye ụtụ nke ha n'ịkatọ na ibu agha megide arụrụala ahụ na-achọzị ịghọ omenala, òtù a maara dịka 'Okpotokpo Adaigbo' nọrọ na nso-nso a wee mee ngagharị iwe n'ụzọ udo megide nkwasò iko n'ike, bụ nke na-ewùzị na mpaghara ebe dị iche iche n'ala Nigeria ugbu a.

Ya bụ ngagharị iwe bụ nke weere ọnọdụ na steeti Anambra, ma bụrụkwa nke ha mèèrè gaa n'ụfọdụ isi ụlọọrụ dị iche iche dị n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ, nke gụnyere ogige isi ụlọọrụ ndị uweojii steeti Anambra, bụ ebe ha nọrọ wee kpọtụrụ onyeisi uweojii steeti ahụ.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onye duru ndị ahụ wee bịa ya bụ ijè, ma bụrụkwa onyeisi òtù Okpotokpo Adaigbo n'ụwa gbaa gburugburu, bụ Oriakụ Ogochukwu Okparasili kọwàra na òtù ahụ bụ òtù nnọrọonwe jikọtara ụmụnwaanyị n'ala Igbo.

Ọ kwuru na ihe mere ha jiri bàgide na ngagharị iwe ahụ bụ iji gosipụta obi mwute ha bànyere etu akụkọ ndakpò na ịkwaso iko n'ike sizị arị ibe ya elu ugbu a ma bụrụkwazie nke a na-anụzị kwà ụbọchị na mpaghara ebe dị iche iche n'ala Nigeria.

O kọwara nke ahụ dịka ihe na-egbu ha mmụọ nke ukwuu, ọkachasị etu o sizị bụrụ ihe a na-ahụtazị ụbọchị ọbụla, ma bụrụkwa nke a na-emesòkarị ma ụmụaka ụmụnwaanyị enweghị ihe ha mà, ma ụmụagbọghọ, nakwa ndị agadi nwaanyị.

Dịka o siri kọwaa, ịkwaso iko n'ike bụ ihe arụ, ma n'anya Chineke, ma n'anya mmadụ, nke mezịrị o jiri dị mkpà na a ga-achọ ihe a ga-eme iji buso ya agha aka ọkụ aka ọkụ.

Oriakụ Okparasili jikwazịrị ohere ahụ wee kpọkuo gọọmentị na ụlọọrụ dị iche iche nke ahụ dị n'aka, ka e were aka ọkụ aka ọkụ wee busoo ya bụ arụrụala na akụkọ ọjọọ agha ma memìlaa ya ugbua ọ ka dị mfe, tupu ọ kawanye njọ maọbụ ghọrọzie omenala.

Na nzaghachi, onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ, bụ CP John Abang, nabatara ma kelee ndị òtù ahụ maka ezi nzọpụ ụkwụ ahụ ha zọpụrụ ma kpọpụtasịkwa ihe dị iche iche ya bụ ụlọọrụ uweojii ahụ megoro na ụzọ dị iche iche ha sogoro buo agha megide nkwaso iko n'ike.

CP Abang, nke ọ bụ onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti ahụ, bụ SP Haruna Mohammed nọchitere anya ya, jazịrị ndị òtù ahụ ike ma dụọ ha ka ha ghàra ịdà mbà n'ime nke ahụ, ọbụnadị dịka o kwèrè nkwà na ụlọọrụ ahụ agaghị ada mbà ịtụnye ụtụ nke ya n'okwu ahụ a kpụ n'ọnụ, iji weta ya bụ arụrụala n'isi njedobe.

Ọ dị ncheta na kemgbe ọnwa olenaole ugbua, na ihe ọzọ kachazị ewù èwù n'ala Nigeria (ma e wezuga ọrịa korona) bụzị ịkwaso iko n'ike, bụkwazị nke wetagoro ọnwụ na mmetọ ọtụtụ ụmụnwaanyị, ma ụmụaka, ma ụmụagbọghọ na ndị agadi. N'ịkatọ nke ahụ, otu dị iche iche emeela ngagharị iwe banyere akparamagwa ọjọọ ahụ, ebe ọtụtụ ka na-emekwa nke ha, iji hụ na e wetara arụrụala dị etu ahụ n'isi njedobe.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.