Ndị Abacha Eriela Ji Ọhụrụ

Aug 18, 2021 - 20:44
 0
Ndị Abacha Eriela Ji Ọhụrụ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ na nsonso a dịka eze ọdịnala na ụmụafọ obodo Abacha dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Idemili North' nke steeti Anambra mere mmemme iri ji ọhụrụ ha nke ahọ 2021.

Oke mmemme ahụ Ịwa Ji ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'obi eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Godwin Nwabunwanne Odiegwu, ma bụrụkwa mmemme ịwa ji nke mbụ ọ na-eme dịka eze ọdịnala, n'ihi na ọ bụ n'abalị asaa nke ọnwa Jenụwarị nke ahọ a ka e chiri ya Igwe obodo ahụ.

Mmemme iri ji ọhụrụ ahụ dọtàkwàrà ọtụtụ ụmụafọ steeti ahụ, ndị ọrụ gọọmenti, ndị iche iche e ji okwu ha agba ìzù, ndị enyi na ndị nwadiala, bụ ndị sitere mpaghara ebe dị iche iche n'obodo ahụ nà mpụga ya wee bịa isoro obodo ahụ ñụrịa.

N'okwu ya oge ọ na-eme omenala ịwa ji kpọnkwem na mmemme ahụ, Igwe Odiegwu kọwàrà iri ji ọhụrụ dịka emume pụrụ iche n'ala Igbo e ji akwanyere ji ùgwù ma na-enyekwa Chineke ekele maka ọkụkọ ugbo na owuwe ihe ubi.

O kelere Chineke maka onyinye ndụ na nchekwa ya n'isi ụmụafọ obodo ahụ, ma ndị nọ n'ụlọ ma ndị nọ n'ụzọ ije, ọbụladị dịka o kpere ka Chineke gaa n'ihu ịgọzi ha n'ihe ọbụla ha na-eme.

Dịka ọ na-ekele Ndị Abacha maka nkwàdo ha, o mekwakwara ka a mara na udo tọrọ àtọ alaghachila n'obodo ahụ, ma kelekwazie aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Obianọ maka ihe dị iche iche o meputegooro ndị obodo ahụ, na etu o siri guzobe ọnọdụ udo bụ ịgbà n'obodo ahụ.

Na mbụ n'okwuchukwu ya n'ịkà ụka e jiri malite mmemme ahụ, ụkọchukwu Bedemoore Obiekezie nke ụlọuka 'St. Michael's Catholic Church, Abacha' dụrụ ụmụafọ obodo ahụ ọdụ ka ha nye aka n'ịkwàlite udo, ọganihu na mmepe obodo ahụ, ma zèéré akpọmasị na ihe ndị ọzọ nwere ike iwètà nsogbu maọbụ dọghachi aka elekere azụ n'ihe gbasaara mmepe.

Na ntụnye nke ya, Onowu obodo ahụ, bụ Paul Omofia, onye bụkwa Onowu kachagoro wee nọọ ọdụ na steeti Anambra, kwupụtara obi ụtọ ya banyere etu obodo ahụ siri dị n'udo ma na-agawanye n'ihu, ọbụladị dịka ọ dụrụ ụmụafọ Abacha ka ha jigidesi mmụọ ịdịnotu na mmụọ ịhụnanya ike.

Ụfọdụ ndị ọzọ kwuru okwu na mmemme ahụ gụnyèrè onyeisi ọchịchị obodo ahụ, bụ Maazị Ifeanyi Okeke-Obata; odeakwụkwọ ndịichie obodo ahụ ma bụrụkwa nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye Gọvanọ Obianọ n'ihe gbasaara ọrụ ngo, bụ Maazị Jeffrey Ubah; onye chịbụrụ obodo ahụ n'oge mbụ, bụ Maazị Emeka Okeluo na ụfọdụ ndị ọzọ bụkwa ndị kwupụtara afọojuju ha banyere etu ya bụ mmemme siri gaa. Ha kelekwazịrị Chineke maka inye ha eze ọdịnala na-atụ egwu Chineke, bụkwa onye wetagoro mmepe, ọganihu na ezi mgbanwè n'obodo ahụ.

N'akụkụ nke ya, onye nnọchianya ala Nigeria na mba South Africa n'oge mbụ, bụ Maazị Uche Ajulu-Okeke, na onye 'Assistant Inspector General of Police' lagoro ezumike nka n'ọrụ, bụ Maazị Ikemefuna Okoye, kọwàrà mmemme iri ji ọhụrụ dịka oke omenala n'ala Igbo, ma kpọkuo ndị Igbo ka ha na-akwàdo ma na-emesi omenala Igbo ike.

Eze ọdịnala obodo ahụ bụ Igwe Odiegwu nọkwàzịrị na mmemme ahụ wee bunye ndị ọrụ nchekwa obodo ahụ ọgbatumtum iji kwàlite ezi ọrụ nchekwa ha na-arụ n'obodo ahụ.

A nọkwazịrị na mmemme ahụ wee buoro eze ọdịnala ahụ ìhù site n'aka ndị òtù dị iche iche n'obodo ahụ na ndị sitere ebe ndị ọzọ wee bịa; gbaa egwu ọdịnala, ma rikwa ji ahụrụ ahụ, e jiri mmanụ akwụ ọhụrụ na ụtazị mara abụba wee hazie, tinyere mmanya ngwọ jụrụ oyi e jiri wee gbanyere ya ụgbọ nwamkpi; nke mezịrị ka mmemme ahụ zaa aha a kpọrọ ya n'ezie.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484