Ndị Agha Mba Amerịka Egbuola Abu Bakr al-Baghdadi

Oct 28, 2019 - 06:11
Jan 21, 2021 - 06:08
 0
Ndị Agha Mba Amerịka Egbuola Abu Bakr al-Baghdadi
: :
playing

Aka akparala nụ ezekaudele, o kwuo onye chiri ya ọzọ. Onye isi ndị otu agha iyi egwu ahụ a ma ama n’ụwa niile dịka ISIS anwụọna. Baghdadi, nwoke onye okpukperechi alakụba, nke na-achị ndị otu a kpọrọ izlamik steeti, ezutego ọnwụ ya na mba Sirịa.

Nke a mere n’abalị ụnyaa, mgbe ndị agha mba Amerịka wakporo Baghdadi n’ebe o jiri mere ebe nzuzo na mpaghara ugwu mba Sirịa.

Site n’okwu onye isi ala mba Amerịka bụ Donald Trump kwuputere n’ụtụtụ ụnyaa, ndị agha mba Amerịka na-achọ ịnwete Baghdadi na ndụ maọbụ n’ọnwụ, kemgbe afọ ole n’ole ahụ ha na-alụ agha megide ndị otu izlamik steeti.

N’ozi o weputere site n’igwe okwu ịhe onyonyo, Trump kọwapụtara otu okwe siri gbaa, yana otu ndị agha Amerịka siri ga ije ahụ, wakpo ogige ebe Baghdadi bi, mezie ịhe Baghdadi jiri nwere aka ya gbuo onwe ya, kama a ga-ejido ya na ndụ.

N’izu ụka gara aga, Amerịka matara ebe Baghdadi zoro na Sirịa site n'ọnụ Mohammed Ali Sajet, otu n’ime ndị na-eso ụzọ Baghdadi, bụ onye e jidere na mba Ịrak n’ọnwa gara aga.

Ndị agha Amerịka mechara buru ọgụ jekwuru Baghdadi n’ebe ahụ o jiri mere ebe nzuzo. Ha na ndị otu Baghdadi kwarịtara mgbọ.

Baghdadi mechara kpasuo mgbọ ogbunigwe o jiri soo onwe ya. O gburu onwe ya ma gbukwe ụmụ ya ndị ya na ha nọ tupu ọgụ ahụ amalite.

Mgbe Baghdadi gbuchare onwe ya, ndị Amerịka mechera nwere ogbunigwe gbarie ụlọ ebe ịhe ahụ mere.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.