Ndị Agụleri Emeela Mmemme Ịgba Ọvala

Ndị Agụleri Emeela Mmemme Ịgba Ọvala

Jan 14, 2021 - 00:29
Jan 19, 2021 - 18:07
 0
Ndị Agụleri Emeela Mmemme Ịgba Ọvala

By Izunna Okafor

Ndị obodo Agụleri dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Anambra East' nke steeti Anambra nọrọ na nsonso a wee mee emume ịgba Ọvala nke ya bụ nnukwu obodo.

Emume ịgba ọvala ahụ wééré ọnọdụ n'Amaigwe Square Aguleri bụ àgbà nke otu narị na iri abụọ na otu (121) nke obodo ahụ, ma bụrụkwa ịgba ọvala nke abụọ nke eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Michael Idigo nke ise.

N'okwu ya na mmemme ahụ, Igwe Michael Idigo kọwàrà ya bụ mmemme dịka otu n'ime nnukwu omenala pụrụ iche e jiri mara obodo ahụ, ma kọwàpụtasịkwa mpụtàrà ya bụ omenala. 

O kwupụtara mwute ya banyere ihe iche aka mgba dị iche iche ndị mmadụ gabigàrà nakwà nke ha ka na-agabigakwa ugbua n'ihi ọrịa nje korona, ya na etu ọrịa ahụ siri gbaghachi aka elekere azụ n'ihe metụratara ọnọdụ mmepe, ma kelee Chineke maka nchekwa o nyere ụmụ mmadụ na steeti Anambra. 

Ọ sịkwa na ọ bụ n'ihi nchekwa ahụ Chineke nyere ụmụ mmadụ n'ime oge a mere o jiri kpọọ ya bụ mmemme nke ahọ a "Ọvala Amala Chineke".

Dịka ọ na-ekele aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ maka ezi ọrụ dị iche iche ọ rụgoro n'ịkwàlite nchekwa na mmepe n'ime steeti ahụ, Igwe Idigo kelezịkwara ndị dị iche iche sonyere na mmemme ahụ maka iwepụta oge bịa nọnyere ha, ọbụladị dịka o kpere ka Chineke nyekwa ha amara ụzọ ijè na nlaghachi.

N'okwu nke ya, onye omeiwu na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo 'Anambra East na West' n'ụlọ nnọchianya etiti, bụ Maazị Chinedu Obidigwe kọwàrà Agụleri dịka obodo nwere ọtụtụ omenala dị iche iche, bụ nke ọtụtụ ndị dị iche iche na-eñomi ma na-esikwa ebe dị iche iche were abịa esonye na ya.

Na ntụnye nke ha n'otu n'otu, Kọmishọna na-ahụ maka ihe e ji akwàlite ọnọdụ obibindụ na steeti Anambra, bụ Maazị Emeka Ezenwanne; nwa amadi ahụ nọchitere anya ọgbọ nta nkwado Anambra etiti n'ụlọ omeiwu sineeti, bụ Maazị Victor Umeh; Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ ugbo na steeti ahụ, bụ Maazị Nnamdi Onukwuba; na Kọmishọna steeti na-ahụ maka ahụike n'oge mbụ, bụ Dọkịta Joe Akabuike, kelere ndị Agụleri maka ntụnye ha n'ịkwàlite omenala Igbo n'ụzọ pụrụ iche, ma kpọkuo ndị Igbo na obodo Igbo ndị ọzọ dị iche iche ka ha gbasie mbọ ike na-akwàdo, na-akwàlite ma na-emesi omenala Igbo ike.

Ya bụ oke mmemme kpòghààrà ọkụ ngwangwa Gọvanọ Obianọ wụchara n'ebe ahụ, Ikolo Agụleri wee malite ịhachatụ n'ebe ahụ, iji gosi na dike awụchaala.

Ndị ọzọ dị iche iche sonyere na mmemme ahụ gụnyèrè Igwe Rowland Odegbo nke Nteje; Maazị  Chief Austine Oguejiofor; onyeisi ụlọọrụ Anambra Broadcasting Service (ABS), Nze Uche Nwọrah, na ọtụtụ ndị ọzọ, tinyéré onyeisi ndị ọrụ nye Gọvanọ Willie Obianọ, bụ Maazị Primus Ọdịlị, bụ onye a nọrọ na mmemme ahụ wee chibe echichi Mkpologwu -Okosis Aguleri, nakwa Ọzọmkpụ Victor Oye, bụ onye e chibere echichi dịka 'Akaamalu nke Aguleri.'

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.