Ndị Alor Eguzobela Chukwumesili Dịka Igwe Ọhụụ Ha

Oct 21, 2020 - 15:38
Jan 30, 2021 - 15:43
 0
Ndị Alor Eguzobela Chukwumesili Dịka Igwe Ọhụụ Ha

Izunna Okafor

Igbo sị na eze na-ekwesi, ma sịkwa na ihe ruru onye na-adị mma inye ya na mgbe o ruru ya. Ọ bụ n'ịgbaso nke a ka ndị obodo Alor dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Idemili South' nke steeti Anambra jiri nọrọ na nsonso a wee guzobe Collins Ebele Chukwumesili n'ocheeze dịka eze ọdịnala ọhụụ nke obodo ahụ.

Mmemme nguzobe a bụ nke weere ọnọdụ n'ụlọ ezumeezu obodo Alor, ma bụrụkwa nke dọtara imirikiti ụmụafọ obodo ahụ selitere isi na ngalaba dị iche iche, tinyere ndị ọrụ gọọmenti na ọtụtụ ndị ọzọ e ji okwu ha agba ìzù.

N'okwu ya na mmemme ahụ, Onowu obodo ahụ, bụ Maazị Okwuchukwu Ezekwesili rụtụrụ aka n'okwu bànyere onye bụbụ eze ọdịnala obodo ahụ, onye gọọmenti steeti Anambra chụtùgodiri n'ọkwa n'ihi akparamagwa ezighị ezi ọ kparà.

O mere ka a mara na ọ bụ nwa amadi ahụ mère onwe ya, n'ihi na ọ bụ ihe jọgburu onwe ya ka o mere, bụ ịga Abuja ịga zute onyeisi ala, n'ebughị ụzọ gwa maọbụ nata ikike n'aka gọọmenti steeti ahụ. Ọ dụkwazịrị eze ọdịnala ọhụụ ahụ ọdụ ka o jiri egwu Chineke na mwedanala wee duo obodo ahụ.

N'okwu nke ya na mmemme ahụ, minista na-ahụ maka ọrụ oyibo na inye ọrụ, bụ Dọkịta Chris Ngige, onyé bụkwa nwaafọ obodo ahụ mère ka a mara na ọ bụ site n'ịtụ akwụkwọ ka e siri wee họpụta eze ọdịnala ọhụụ ahụ, ma bụrụkwa nke ya onwe ya sonyere na ya. O mere ka a mara na ịhọpụta na igùzobè eze ọdịnala ahụ ga-enye aka ime ka udo tọrọ àtọ na ọganihu bata n'obodo ahụ karịa ka ọ dị na mbụ. Ọ kpọkukwazịrị ụmụafọ obodo ahụ ka ha kwàdo eze ọdịnala ọhụụ ahụ ka o wee chịa ọchịchị nke ọma ma duruo obodo ahụ n'ala e kwere na nkwa.

Na nzaghachi oge e guzobechara ya n'ọkwa ahụ, ya bụ eze ọdịnala ọhụụ, bụ Igwe Chukwumesili kelere ndị obodo ahụ maka ntụkwàsịobi ha nwere na ya wee họpụta ya dịka eze ọdịnala ha. O kwuru na ọ gaghị agharịpụ ha na ntụkwasiobi ahụ ha nwere na ya, ma kwe nkwà ijikọta obodo ahụ n'ọganihu na n'ịhụnanya.

Ọ rịọkwazịrị nkwàdo ụmụafọ obodo ahụ nàkwà ekpere ha, maka na ọ bụ naanị site na nke ahụ ka ọ pụrụ isi mee nke ọma dịka eze ọdịnala.

Ụfọdụ ihe pụtakarịchara ìhè na mmemme ahụ gụnyèrè iji eze ọdịnala ọhụụ ahụ ejiji ọhụụ dịka eze ọdịnala, ikpubè okpueze, nakwa inyefè ya ọfọ obodo ahụ n'aka, tinyere ihe ndị ọzọ mere ka ya bụ mmemme dàá ụdà.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.