Ndị APGA Esuola Azịza Ndị APC Ọkụ n'Awka

Sep 29, 2021 - 18:53
Sep 29, 2021 - 19:14
 0
Ndị APGA Esuola Azịza Ndị APC Ọkụ n'Awka

Izunna Okafor dere akụkọ a


Anwụrụ ọkụ sụlara elu na nsonso a n'ama egwuregwu Alex Ekwueme dị n'Awka, na steeti Anambra, oge a chịkọtara ma suo ọkụ, azịza karịrị narị n'ọnụọgụgụ, bụ nke ndị nọ n'òtù ndọrọndọrọ ọchịchị 'All Progressive Congress' (APC).

Ndị òtu APC ahụ gbahapụzịrị ya bụ otu ndọrọndọrọ ọchichị wee banyezie n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'All Progressive Grand Alliance (APGA)'; nke mezịrị ha jiri wepụta ma suo azịzị ha ọkụ, iji gosi na o nweghịzị ihe ọbụla jikọọrọ maọbụ ga-ejikọrọ ha na APC ọzọ.

Isu azịza ndị ahụ ọkụ bụ nke weere ọnọdụ na mmemme a nọrọ wee gbapee achụmta nkwàdó nke Ọkammụta Chukwuma Soludo dịka onye ga-eji aha na ọkọlọtọ otu ndọrọndọrọ ọchịchị APGA wee zọọ ọkwa Gọvanọ steeti Anambra na nhọpụta ọchịchị ahụ a ga-eme na steeti ahụ n'abalị isii nke ọnwa Nọvemba ahọ a.

N'okwu ha n'ebe ahụ, ndị ahụ batara ọhụrụ n'APGA kwuru na ha hụtara otu ndọrọndọrọ ahụ dịka nke nwere ezi ebumnobi maka ndị Igbo na ọdịmma ha, bụzị nke mere ha jiri kpebie ịhapụ APC ma sonyere otu ndọrọndọrọ ahụ, maka na ọ naghị adị mma ịhapụ ebe a na-echi ọzọ, gaba ebe a na-arụ agwụ.

Ha kwukwara na ha hụtara Ọkammụta Chukwuma Soludo na onye òtù ya bụ Dọkịta Onyekachi Ibezim, dịka ndị tozuru ma nwekwa ihe ọ ga-ewe iji bulie Anambra n'ogo kacha elu, malite n'ebe Gọvanọ Obianọ kwụsịrị; ma kọwakwazie na nke ahụ sokwa n'ihe mere ha jiri bàta n'otu ndọrọndọrọ ahụ, iji hụ na ha nyere ha nkwàdo kwesiri ekwesi ka ha wee nweta mmeri na nhọpụta ọchịchị ahụ.

N'okwu ya oge ọ na-anabata ndị ahụ n'aha ndị òtù APGA, onyeisi otu ndọrọndọrọ APGA n'ala Nigeria, bụ Maazị Victor Oye gwàrà ndị ahụ na ọ bụ ezi mkpebi ka ha mere wee bata n'otu ndọrọndọrọ ahụ, maka na ya bụ otu ndọrọndọrọ bụ ụgbọ na-aga aga.

Dịka ọ na-echetere ha na otu ndọrọndọrọ APGA anaghị agharịpụ, o kwere ha nkwà na ọnụnọ ha n'otu ndọrọndọrọ ahụ ga-abụ nke jupụtara n'ọñụ, n'ihi na APGA na-agbaso usoro na ụkpụrụ nwa mmụọ emegbula mmadụ, ma mmadụ emegbula nwa mmụọ.

Ndị ahụ nọkwazịrị n'ebe ahụ wee suo akwa APC ha ọkụ, ya na azịza ha wee gbaa pịapịa n'ihu ọha.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484