Ndị Arewa Ekwena Nkwa Ịkwado Obianọ Nke Ugboro Abụọ

Sep 22, 2017 - 19:42
Jan 23, 2021 - 17:25
 0
Ndị Arewa Ekwena Nkwa Ịkwado Obianọ Nke Ugboro Abụọ

Izunna Okafor, Awka

Otu jikọtara ndị Arewa bi na steeti Anambra ekwuputana nkwado ha nyegara aka na-achị steeti ahụ bụ gọvanọ Willie Obianọ maka ịchị steeti ahụ nke ugboro abụọ. Nkwado a bụ nke bịara dịka e mere ngagharị udo ịchụ nta nkwado nke ya bụ gọvanọ, bụ nke weere ọnọdụ n'ebe obibi gọvanọ dị n'Amawbịa.

Otu jikọtara ndị Arewa bi na steeti Anambra ekwuputana nkwado ha nyegara aka na-achị steeti ahụ bụ gọvanọ Willie Obianọ maka ịchị steeti ahụ nke ugboro abụọ.

Nkwado a bụ nke bịara dịka e mere ngagharị udo ịchụ nta nkwado nke ya bụ gọvanọ, bụ nke weere ọnọdụ n'ebe obibi gọvanọ dị n'Amawbịa. Ngagharị ahụ bụ nnọọ nke ọtụtụ ndị Arewa sonyere na ya, bụ ndị sitere n'ebe dị iche iche na steeti ahụ wee pụta iji gosipụta ndọnye ukwu ha nyegara gọvanọ Willie Obianọ n'ihi ezi ọnọdụ nke ọchịchị ya nye ha.

N'okwu ya na mmemme ahụ, nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye gọvanọ Obianọ n'ihe metụtara okpukperechi ndị ụka Islam ma bụrụkwa Sarikin Awụsa n'Ọka, bụ Alhaji Garuba Haruna kwupụtara hoohaa na kemgbe okike steeti ahụ, na onwebeghi oge ha nwetara ezi ọnọdụ tọrọ atọ na steeti ahụ dịka nke na-enweta ugbu a n'ọchịchị gọvanọ Willie Obianọ.

N'otu n'otu n'okwu ha dị iche iche, onye bụ Sarikin Awụsa n'Ọnịsha bụ Alhaji Ilyasu Iman, na ogbo ya nke Nnewi bụ Alhaji Salisu Kumba, tinyere onyeisi ndị Fụlani na steeti ahụ, bụ Alhaji Giddado Sadiq mere ka a mara na ha na-azụrụ nnọọ ahịa ha ma na-arụkwa ọrụ ọma ha dị iche iche na steeti ahụ na-enweghị ihe mgbakasị ahụ ọbụla maka ihi mmụọ ịhụ ịdị n'otu n'anya, nke gọvanọ Willie Obianọ nwere. Ha kwezịkwara nkwa inye ya nkwado zuru oke n'ịzọ ọchịchị ya nke ugboro abụọ iji hụ na ya bụ udo na ịdị n'otu tọrọ atọ ma bụrụkwa nke ga-adịgide.

N'okwu nke ya, onyeisi otu na-ahụ maka ịhọpụtagharị gọvanọ Obianọ nke ugboro abụọ, bụ maazị Victor Umeh kwuru na ya bụ gọvanọ egosipụtana n'ezie na ọ bụ ezi nwaafọ hụrụ ala anyị na ịdị n'otu n'anya, ma sịkwa na ude ya na-ede n'ala Naịjiria na ụwa gbaa gburugburu. Ọ sị na nke ahụ na-eweta nnọọ ezi mmetụta nye ụmụafọ steeti Anambra bi n'ebe dị iche iche, ọkachasị na mgbago ụgwu ala anyị.

Na nzaghachi, gọvanọ Obianọ kelere ndị otu Arewa ahụ maka nkwado ha nye ọchịchị ya nke ugboro abụọ, ma kwe ha nkwa ezi nchekwa nye ndụ na akụnụba ha na steeti ahụ. Ọ dụkwara ha ka gbaa mbọ bụrụ ndị na-erubere iwu isi, ka ha ghara itinye aka n'akparamagwa ọbụla nwere ike ibutere ha nsogbu n'ebe ha bi, na ka ha mekwa ka ndị ọrụ nchekwa mara babyere onye ọbụla a na-enyo enyo n'etiti ha.

N'aka nke ya kwa, onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwado Njikọka nke abụọ n'ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti ahụ, bụ maazị Pete Ibida kpọkuru ndị gọvanọ ndị ọzọ ka ha ñomiri ma soro nzọ ụkwụ ezi onye ndu nke gọvanọ Willie Obianọ na-egosipụta, site n'idị n'otu, na-akpazugaghị onye ọbụla n'akụkụ n'ihi okpukperechi ya ma ọ bụ agbụrụ o si na ya.

Ndi otu ahụ nọzịkwara n'oge ahụ wee bụkuo abụ nkwado nyegara gọvanọ Willie Obianọ, bụ nke na-egosi na ha kwụ ya n'azụ gidigbaa na ya bụ nhọpụta na-abịa n'ihu.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.