Ndị ASATU Etoola Obianọ Maka Ọdụ Ụgbọelu Anambra

Aug 23, 2021 - 21:36
 0
Ndị ASATU Etoola Obianọ Maka Ọdụ Ụgbọelu Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ngalaba ụmụnwaanyị nke òtù ahụ jikọtara ọchịchị obodo dị iche iche na steeti Anambra, bụ Anambra State Association of Town Unions (ASATU)' etoola aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ maka ọmarịcha ọdụ ụgbọelu mba ụwa ahụ ọ rụrụ na steeti Anambra.

Ndị òtù a kwupụtara nke a oge ndị ndu ha sonyere Gọvanọ Obianọ wee gaa njem nleta n'ọdụ ụgbọelu ahụ dị n'Ụmụeri, n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Anambra East', iji were anya ha hụ ya bụ ọdụ ụgbọelu ma hụkwa ka ọrụ si aga n'ebe ahụ. 

N'okwu ha n'otu n'otu n'ebe ahụ, ndị ndu ụmụnwaanyị ahụ n'ogoogo dị iche iche kọwara Obianọ dịka ekwueme maka na o mezuputela nkwà ahụ o kwere ịrụrụ Ndị Anambra ọdụ ụgbọelu, ya na nkwà ndị ọzọ dị iche iche o kwere ha oge ọ na-achụ nta nkwàdo na oge ọ batara n'ọkwa ọchịchị.

N'okwu ya oge ọ gagharịchara ebe ahụ iji hụ ka ọrụ siri gbata kwụrụ, Gọvanọ Obianọ mere ka a mara na gọọmenti etiti ala Nigeria enyela steeti Anambra olulu mmanụ (oil well) dị iri na otu n'ọnụọgụgụ, ma gaa n'ihu kọwaa na steeti ahụ ga-amalitezị zaba steeti na-emepute mmanụ ọkụ n'ime ọnwa na-abịa abịa.

O mere ka a mara na o teela aka ọchịchị ya jiri chọba ka aha steeti Anambra bata n'aha steeti ndị na-emepụta mmanụ, ma kelekwazie Chukwu na nrọ ahụ mechaara bịa na mmezu n'oge nke ya.

N'okwu ọ gwara ụmụnwaanyị ahụ, nwunye Gọvanọ Obianọ, bụ Oriakụ Ebelechukwu Obianọ kpọpụtasịrị ọtụtụ ihe dị iche iche o megoro site n'okpuru atụmatụ ọrụ obiebere ya bụ CAFÈ, ma kwe nkwà na òtù ahụ ga-aga n'ihu na-arụ ọrụ obiebere, ọbụladị ma oge ọchịchị di ya gwụrụ. 

Ndị ọzọ kwuru okwu n'ebe ahụ gụnyere Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ na steeti ahụ, bụ Injinia Marcel Ifejiọfọr (bụ onye dugharịrị ha n'ọdụ ụgbọelu ahụ); onye omeiwu na-anọchi anya ọgbọ nta nkwàdo Anambra East na West n'ụlọ nnọchianya etiti, bụ Maazị Chinedu Obidigwe; onyeisi ndị ọrụ nye Gọvanọ Obianọ, bụ Maazị Primus Odili; onyeisi òtù ASATU, bụ Maazị Titus Akpudo.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484