Ndị ASUU Akwụsịna Ịgba Abụbọ Ọrụ

Sep 30, 2017 - 22:53
Jan 22, 2021 - 07:34
 0
Ndị ASUU Akwụsịna Ịgba Abụbọ Ọrụ

Izunna Okafor, Awka

Otu jikọtara ndị nkuzi mahadum n'ala anyị akwụsịna abụbọ ọrụ ahụ ha malitere n'ọnwa Ọgọọstụ kemgbe ihe dịka izu ụka ise gara aga. Ọ bụ ezie na ha kwụsịrị ya, mana ha nyere gọọmenti etiti ụfọdụ ọnọdụ banyere nke ahụ. Onyeisi otu ASUU bụ ọkammụta Abiodun Ogunyemi kwuputara nke a n'okwu ọ gwara ndị nta akụkọ n'Abụja bụ isi ala anyị ka ha na ndị nọchitere anya gọọmenti etiti nwechara nzukọ maka ya bụ abụbọ ọrụ.

Otu jikọtara ndị nkuzi mahadum n'ala anyị akwụsịna abụbọ ọrụ ahụ ha malitere n'ọnwa Ọgọọstụ kemgbe ihe dịka izu ụka ise gara aga. Ọ bụ ezie na ha kwụsịrị ya, mana ha nyere gọọmenti etiti ụfọdụ ọnọdụ banyere nke ahụ.

Onyeisi otu ASUU bụ ọkammụta Abiodun Ogunyemi kwuputara nke a n'okwu ọ gwara ndị nta akụkọ n'Abụja bụ isi ala anyị ka ha na ndị nọchitere anya gọọmenti etiti nwechara nzukọ maka ya bụ abụbọ ọrụ.

Ọ sị na ihe ha jigodiri kwụsị abụbọ ọrụ ahụ bụ ka gọọmenti etiti nwee imezu ihe ha na ha kwekọrịtara na mbinye aka n'akwụkwọ nke otu abụọ ahụ.

Ọ sịzịkwa na ọ bụrụ na gọọmenti etiti emezughị ihe ahụ ha abụọ kwekọrịtara, na ha agaghị egbu oge ime dịka ha si eme na mbụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.