Ndị Awa Emeela Mmemme Otute Awanigbo, Too Obianọ Maka Ịrụ Ụzọ

Oct 7, 2017 - 08:33
Jan 23, 2021 - 23:15
 0
Ndị Awa Emeela Mmemme Otute Awanigbo, Too Obianọ Maka Ịrụ Ụzọ

Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Ndị obodo Awa nke dị n'okpuru ọchịchị Orumba Nọọtụ na steeti Anambra etoona aka na-achị steeti ahụ bụ gọvanọ Willie Obianọ maka inye ọrụ ngo ịrụ ụzọṅahụ si Awa gaa Okpeze gaa Ndiukwuenu gaa Amaetiti na Awgbụ. Otu onye e ji okwu ya agba izu n'otu pati APGA n'obodo ahụ bụ maazị Ambrose Egwuọnwụ mere ka a mara nke a n'okwu ọ gwara ndị nta akụkọ na mmemme Otute Awanigbo nke ahọ 2017, bụ nke weere ọnọdụ n'obi Onoowu obodo ahụ bụ maazị Israel Ezue, ma sị na a rụchaa ụzọ ahụ, na ọ ga-enyere ndị obodo ahụ aka ibupuputaṅihe ha na-akọta n'ugbo ebe a ga-ere ha.

Onye ahụ selitere isi n'otu pati APGA kwara arịrị na oke mmiri ozuzo mebisiri ụzọ ahụ mee ka ọ bụrụ agaghị aga, ma kpọọ oku ka a hụ na a rụchara ụzọ ahụ n'oge iji wee belata ihe nhịa ahụ ndị obodo ahụ na-agabiga. Ọ kpọkuru ndị obodo ahụ ka kwado gọvanọ Obianọ nke ugboro abụọ ma kpọkukwa ndị Anambra ka ha hụta ọrụ mmepe steeti ahụ dịka ọrụ dịịrị onye ọbụla.

N'ajụjụ ọnụ a gbara ya n'oge mmemme, onyeisi ụlọ ọrụ ngo ji ọrụ ahụ, bụ maazị Eveready Freddy onye bịara mmemme Otute ahụ kelere ọchịchị steeti ahụ maka inye ya ohere ịrụ ọrụ ahụ, sị na steeti ahụ na-emezu akụkụ nke ha na nkwekọrịta banyere ọrụ ngo ahụ, ma mekwazie ka a mara na ọ bụ oke mmiri ozuzo mere na a rụchabeghị ụzọ ahụ.

N'okwu ya, Onoowu obodo Awa bụ maazị Israel Ezue onye bụ isi a hụrụ kwaba okpu na mmemme ahụ sị na Otute Awanigbo bụ mmemme iri ji ọhụụ nke obodo ahụ, bụ otu n'ime ụzọ e si akwalite ọnatarachi ndị Igbo. Ọ kpọkuru ndị Igbo ka ha ghara ikwe ka njirimara ha funahị ha, ma dụziekwa ụmụafọ Naịjiria ka ha bụrụ ndị na-eme ihe ga na-akwalite udo na ịdị n'otu nke ala anyị.

Otu n'ime ndị bịara mmemme ahụ bụ maazị Patrick Agbator onye sitere steeti Edo, kọwara ndị Igbo dịka ndị hụrụ udo na ịdị n'otu n'anya ma dụọ ha ka jigidesie omenala ha na ọnatarachi ha ike, bụ nke magburu onwe ya.

Otu onye sitere obodo ahụ bụ maazị Clement Nwankwo, tinyere eze ọdịnala obodo Akpụgoeze dịnna steeti Enugu bụ Igwe Chris Nwajagụ kpọkuru gọọmenti etiti ndị obodo na ezinaụlọ dị iche iche ka ha guzosie ike megide ihe aka mgba dịịrị ichekwaba ezigbo ọnatachi Chineke ji wee gọzie ha; ebe maazị Clement Orji and Oriakụ Obioma Onyegbu kpọrọ oku maka ezi obibi ndụ n'ime obodo iji wee kwalite ịdịkọ n'otu tọrọ atọ n'ebe ụmụ mmadụ nọ.

Ndị eze ọdịnala dị iche iche sitere na steeti na mpụga steeti bịara ya bụ mmemme Otute Awanigbo nke ahọ 2017. A nọkwazịrị na nnukwu emume ahụ wee gbaa ọtụtụ egwu ọdịnala na egwu mmọnwụ dị iche iche.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.