Ndị Boko Haram Egbuola Ndị Ọrụ Ugbo Iri Na Anọ Na Borno

Oct 18, 2020 - 00:41
Jan 25, 2021 - 00:42
 0
Ndị Boko Haram Egbuola Ndị Ọrụ Ugbo Iri Na Anọ Na Borno

Izunna Okafor

Mmadụ iri na anọ bụ ndị ọrụ ugbo nọrọ na nsonso a wee zùte ọnwụ mberede ha site n'aka ndị òtù agha isi ekwe ọnwụ bụ Boko Haram. 

Nke a bụ nke e mere ka ụwa mara site n'ozi a kụpụrụ ụbọchị Tuzdee site n'aka ndị ọrụ nchekwa obodo  steeti ahụ.

Dịka ya bụ ozi siri kọwaa, ndị agha isi ekwe ọnwụ ahụ bụ Boko Haram jidèrè ndị ọrụ ugbo mmadụ iri na ise ebe ha nọ n'ugbo ha elekọta ma na-agba ihe ha kụrụ n'ubì mmiri, na Ngwom, nke jiri kilomita iri na anọ wee dị anya n'isi obodo steeti Borno bụ Maiduguri. Ka ha jidechara ndị ọrụ ugbo ahụ, ha tinyèrè ha niile mmà n'olu, ma bepu ha isi ozigbo ozigbo.

Ozi ahụ mere ka a mara na ọ bụ mmadụ iri na anọ n'ime mmadụ iri na ise ahụ nwụrụ, ebe otu onye fọrọ afọ nọzịkwa n'ọnọdụ 'ọdị ndụ ọnwụ ka mma' n'ihi na ha jiri mma wee  bèé ya gwoogwoo. Eleghị anya, ha chere na ọ nwụọla, tupu ha hapụzie ya n'ogbu ọbara.

E mezịrị ka a mara na e buruzịrị ya bụ nwa amadi dị ndụ wee gaba n'ụlọọgwụ ozigbo maka ilekọta ya anya na inye ya ọgwụgwọ.

Ọ dị mwute na ndị agha ọlụọ ọlaa Boko Haram na ndị òtù 'Islamic State West Africa Province (ISWAP)' malitezịrị idè na igbusi ndị ọrụ ugbo, ndị ogbu osisi na ndị na-achị ehi, n'ihi na ha kwuru na ndị ahụ na-enyocha ha n'ụzọ nzuzo n'ime ọhịa, wee ga na-agwa ma na-enyekwa ndị ọrụ nchekwa maka ihe nzuzo banyere ha, n'ụdị iji nyere ha (ndị ọrụ nchekwa) aka memìlaa ha bụ ndị agha isi ekwe ọnwụ.

Ọ dị nchèta na ndị agha isi ekwe ọnwụ a egbuola mmadụ karịrị puku iri atọ na isii (36, 000), bibie ọtụtụ ihe, ma tinyekwa mmadụ karịrị nde abụọ n'ọnọdụ enweghị ebe obibi, kemgbe ahọ 2009 

Ya bụ nsogbu agbasawanyekwala ruo ụfọdụ obodo ndị ọzọ gbara Nigeria gburugburu, nke gụnyere Niger, Chad na Cameroon, bụzị nke mere e jiri guzobe òtù ọrụ nchekwa e jikọtara ọnụ na mpaghara ahụ, iji buso ha bụ ndị ọjọọ agha. 

Mana ka ọ dị ta, ndị ọjọọ a ka na-akpakwa ike ọjọọ, ma na-egbusikwa mmadụ; mana isi ekweghịkwa ha onwe ha ọnwụ, dịka aha ha siri dị, bụ ndị agha isi ekwe ọnwụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.