Ndị Ebenator Amalitela Iji Aka Ha Edozi Okporoụzọ Ha, Rịọ Enyemaka Gọọmentị

Apr 21, 2021 - 19:07
 0
Ndị Ebenator Amalitela Iji Aka Ha Edozi Okporoụzọ Ha, Rịọ Enyemaka Gọọmentị

Izunna Okafor dere akụkọ a

Igbo sị na ọ na-adị mma nwaanyị na-eche di ya, ọ na-emetụ nke ọ ga-emenwu; maka na ọ naghị adị mma ọhammadụ ịnọ nkịtị wee na-eche ọhammụọ.

N'ịgbasò nke a, ndị Ebenator, dị n'okpuru ọchịchị 'Nnewi South' nke steeti Anambra amalitela iji aka ha edozi okporoụzọ ha na ọwàmmiri ha mebisiri emebi, ka ọ gachaara ọtụtụ ahọ ha jiri chebe mgbataọsọ na enyemaka gọọmentị n'idozi okporoụzọ ahụ na ọwàmmiri ahụ, n'enweteghị ụsa ọbụla.

Okporoụzọ ahụ na ọwàmmiri ahụ, nke dị na mpaghara njikọ ụzọ Amannalụ (Amannalu Junction) bụ nke a malitere ọrụ mmetụ aka na ya na nsonso a site n'aka ndị a maara dịka 'Ummunnama Progressive Youths', bụ òtù jikọtara ndị ntorobịa Ụmụnnama, bụ ótù ógbè n'ime ógbé atọ mejupụtara Ebenator.

Ya bụ okporoụzọ gọọmenti etiti bụ otu n'ime okporoụzọ pụtakarịchara ìhè e si abata ma na-apụ n'obodo ahụ, ma bụrụkwa nke gafere obodo ahụ, si ya bànye Ụkpọr (bụ isi obodo okpuru ọchịchị 'Nnewi South'), wee si ya gaa Ihembosị na Ọkịja, nà obodo ndị ọzọ.

N'okwu ya banyere nke ahụ, ótù onye n'ime ndị na-ahụ maka ọrụ ahụ, ma bụrụkwa onye òtù 'Ummunnama Progresive Youths', bụ Maazị Ugochukwu Abbah mère ka a mara na ihe kpaliri mmụọ ha bụ na okporoụzọ ahụ nà ọwammiri na-echuzị obodo ahụ aha kemgbe ọtụtụ ahọ, n'ihi na ọ bụ ya ka onye ọbụla si na mpaghara ahụ abata obodo ahụ ga-ebu ụzọ wee zute.

O mere ka a mara na obodo ahụ akpọkuola ma lee anya enyemaka na mgbataọsọ gọọmenti n'okporoụzọ ahụ kemgbe ọtụtụ ahọ, mana o nweghị nke mịtara mkpụrụ, bụzị nke mere ha jiri jikọta onwe ha ọnụ, wee kpebie iji aka ha malite ọrụ nke ha nwere ike ịrụnwu n'ebe ahụ, ọkachasị iji mee ka ya bụ okporoụzọ na ọwàmmiri dịtụ mma ile anya.

Na ntụnye nke ha n'ótù n'ótù, eze ọdịnala Ebenator, bụ Igwe Edwin Chinewubeze Ezejiburu; na onyeisi ọchịchị 'Ebenator Development Union (E.D.U), bụ Dọkịta Anthony Okechukwu kọwàra ọrụ ahụ ndị ntorobịa ahụ na-arụ dịka nke magburu onwe ya, ma kelee ha maka ezi nzọpụụkwụ dị etu ahụ.

Dịka ha na-ekpe ka Chineke gọzie ma kwụghàchi ndị ahụ mmaji kwuru mmaji maka ọrụ ọma ha ahụ, ha jikwazịrị ohèrè ahụ kpọkuo ụmụafọ Ebenator ndị bigasị n'ebe dị iche iche ka ha ñòmie ezi ọrụ ọma ahụ, ka ha na-echeta obodo ha ma na-ewelataru akụnụba ha ụlọ, iji soro tụnye ụtụ nke ha n'ịkwalite mmepe obodo ha, maka na ọ na-adịkwanụ mma isi n'ụlọ mara mma wee pụba ama. 

N'okwu nke ha n'ótù n'ótù banyere ọrụ ahụ, ụfọdụ ụmụafọ Ebenator, nke gụnyere Josephat Udeze, Chidiebere Ojiego na Onyeka Mbamalu kọwàrà ezi ọrụ ahụ dịka nke kwesiri nñòmi, ma kelee ndị ntorobịa ahụ maka ọmarịcha atụmatụ dị etu ahụ. Ha kọwara na ọrụ ahụ ga-enye aka ime ka ụzọ ahụ e si abata obodo ahụ chawapụ ma dịkwa mma ile anya, ebe ọwàmmiri ahụ a na-edozi ga-emekwazị ka mmiri nwee ike ịdị na-agara onwe ya etu o kwesiri, karịa ịga n'okporoụzọ maọbụ imebisi ihe a kọrọ n'ugbo.

Ndị Ebenator jikwazịrị otu olu kpọkuo gọọmentị ka o nye aka ịhụ na e tere okporoụzọ ahụ, ugbua ha onwe ha malitegoro ọrụ na ya, ka o wee chawapụ nke ọma n'anya, ma dịkwa mma ijèụkwụ na ụgbọala.

Ha kpọkukwara gọọmenti ka ọ gbatara Ebenator ọsọ enyemaka na nsogbo dị iche iche na-echere obodo ahụ aka mgba, nke gụnyere enweghị ezigbo okporoụzọ, nsogbu mbize (ibo Ebenator), nsogbu enweghị ọkụ latiriiki, tinyere ọtụtụ nsogbu ndị ọzọ.

Onye ntaakụkọ anyị bụ Izunna Okafor, gara n'ebe ahụ ya bụ ọrụ na-aga, wee wèta akụkọ na a kpụchara ya bụ okporoụzọ wee ruo n'ụlọụka 'St. Matthew Catholic Church, Ebenator' ma waa ya ọwàmmiri. 


Ya bụ okporoụzọ eruola óhú kwùrú óhú ahọ e jiri gbahapụ ya, n'agbanyeghị na gọọmenti arụọla àkwàmmiri Ọfala Ébè sírí n'okporoụzọ ahụ wee gaa, gbutusie ọtụtụ osisi ndị mmadụ dị n'akụkụ ụzọ ahụ, n'ụdị na a na-achọ ịrụ ya arụ; mana kemgbe ahụ, o nwebeghị ihe ọzọ e mere ebe ahụ wee ruo ugbua ndị obodo ahụ malitezịrị iji aka ha eme ihe banyere nke ahụ.

Ọwàmmiri ahụ a na-edozigharịzị ugbua bụkwa nke mebiri emebi kemgbe ọtụtụ ahọ, na-achọ ịghọ mbize n'ebe ahụ, ma bụrụkwazie ebe ídè mmiri si were agbada n'ibo Ebenatọ, bụ nnukwu mbize megoro ọtụtụ mkpamkpa dị iche iche n'obodo ahụ kemgbe ọtụtụ ahọ, bụkwá nke ndị obodo ahụ na-akpọkuzị gọọmentị ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka na ya, iji wee kpochie ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484