Ndị Gọvanọ Ndịda Anyanwụ Enweela Nzukọ Ọzọ Na Lagos, Lee Ihe Ha Kpebiri

Jul 7, 2021 - 19:50
 0
Ndị Gọvanọ Ndịda Anyanwụ Enweela Nzukọ Ọzọ Na Lagos, Lee Ihe Ha Kpebiri

Izunna Okafor dere akụkọ a

Buusu sị na mmekọrịta ahụ bụ ụtọ nwanne. Ọ na-abụkwa a tọkọọ aro ọnụ, ihe a na-achọ adị nso.

N'ịgbaso nke a, òtù ahụ jikọtara ndị gọvanọ ndịda anyanwụ ala Nigeria enweela ọgbakọ pụrụ iche, ebe ha nọrọ wee tinye okwu ọnụ banyere ihe dị iche iche metụtara ala Nigeria, mpaghara ahụ, na ọ dịmma ndị ha na-achị, ọkachasị dịka o siri metụta ọnọdụ nchekwa, atụmatụ imegharịiwu ahụ e ji n'aka ugbua, na okwu ndị ọzọ a kpụ n'ọnụ

Nnukwu ọgbakọ ahụ wééré ọgbakọ n'obi gọọmenti steeti Lagos dọtàrà ndị gọvanọ niile sitere mpaghara ahụ, ma bụrụkwa nke ha nọrọ na ya wee kwekọrịta ma kpebikwa ọtụtụ ihe na nchịkọta okwu dị iche iche ha tinyere ọnụ.

N'okwu ya oge ọ na-agụpụta mkpebi dị iche iche ha nwere n'ọgbakọ ahụ, onyeisi òtù ndị gọvanọ ahụ ma bụrụkwa Gọvanọ Steeti Ondo, bụ Gọvanọ Arakunrin Oluwarotimi Odunayo Akeredolu kwùrù na ha kwenyesiri ike n'ịkwàlite ọnọdụ ịdịnotu ala Nigeria, bụ nke ga-agbado ụkwụ n'ikpe nkwụmọtọ, ọganihu, ime nwata ka e mere ibe ya, ime ihe etu o kwesiri, na ịgbaso udo n'etiti mmadụ na ibe ya.

O kwuru na ha kwekọrịtara na iji ọkwa ọchịchị onyeisiala Nigeria ga na-agbagharị agbagharị na mpaghara mgbago ugwu na mpaghara ndịda ala Nigeria, nke pụtara na onyeisiala ọzọ ga-achị ala Nigeria ga-esirịrị mpaghara ndịda ala Nigeria, ebe ọ bụ na ndị mgbago ugwu ewerela oke nke ha.

N'ihe banyere nchekwa, o kwuru na ndị òtù ahụ lebara anya n'ọnọdụ nchekwa ala Nigeria, kelee ndị ọrụ nchekwa ala dị ice iche maka ịgba mbọ ha iweghachite ezi ọnọdụ nchekwa n'ala Nigeria; ma kwuputekwa obiebere ha nyegara ndị dị iche tụfugoro ndị ezinụlọ ha maọbụ ndị nke ha n'ihi ajọ ọnọdụ nchekwa dị n'ala Nigeria, ọkachasị ụfọdụ ndị ọrụ nchekwa nwụgoro n'ihu ọrụ, ma kpekwazie ka mkpụrụobi ya zuo ike na ndokwa.
 
Ha kwupụtànwòrò mkpa ọ dị ka steeti dị iche iche nwee ndị uweojii nke ha; ma kpebikwa na e nwegodi ka ọnọdụ siri dị, nke na a chọrọ izite ndị ọrụ nchekwa maka ọrụ pụrụ iche maọbụ ọrụ dị añaa na steeti ọbụla, na a ga-agwarịrị Gọvanọ steeti ahụ na 'Chief Security Officer' agwa ma nweta ụsà ya tupu a kpọbata ndị ọrụ nchekwa ahụ na steeti ahụ.

Ha gbarụrụ ihu banyere ime 'a họrọ ụmụ-ụmụ e gbuo ha ichi, họrọ ụmụ-ụmụ chie ha ọzọ' n'ihe gbasaara ikpe ikpe nkwụmọtọ; ma kwuwaa na ịkpụrụ na ịkpọchi mmadụ ga-abụrịrị nke a ga-agbaso usoro iwu kwàdoro wee mee, ma na-asọpụkwara ikike dịịrị mmadụ oge a na-eme ya.

N'ịgbaso nkwekọrịta ahụ ndị òtù ahụ mebụrụ n'oge mbụ banyere ịchị ehi na-agagharị n'okporoụzọ, bụ nke ha màchiri kpamkpam, ha kwuputanwòrò ọzọ na mmachi ahụ ka dịkwa irè, ma sịkwa na ọ bụ n'abalị mbụ nke ọnwa Septemba ahọ a ka a ga-amalite itinye amụma iwu ahụ n'ọrụ na steeti niile dị na mpaghara ahụ megide ya bụ atụmatụ ịchị ehi na-agagharị n'okporoụzọ.

Ha kwekọrịtakwara na gọọmenti etiti na steeti dị iche iche ga-ekesà ego ọbụla e weputere site n'àkpà ego etiti maka ịkwàdò atụmatụ 'Nigeria Police Security Trust Fund' iji buso ajọ ọnọdụ nchekwa agha. 

N'ihe gbasara atụmatụ iwu metụtara mmanụ agbidi bụ 'Petroleum Industry Bill (PIB) Law' ndị omeiwu ahụ kèlèrè ụlọ omeiwu etiti maka mbọ ha gbagoro n'ịkwàdò ya bụ atụmatụ iwu. Ha bụ ndị gọvanọ jụrụ ịnabata ka a na-enye obodo ndị ahụ e si na ha egwupụta mmanụ agbidi pasentị atọ (30%) nke ego e nwetara, ma kwàdo ka a na-enye ha pasentị ise, dịka ụlọ nnọchianya etiti siri wee kwàdo. Ha jụkwara ịnabata ka a na-etinye pasentị iri atọ nke úrù e ritere na mmanụ n'ihe gbasaara ịmịpụtà mmanụ ahụ na isucha ha.

Ndị otu ahụ kwuru na ọ dịghị ha mma n'obi bụ usoro ahụ e kwuru a ga-esi wee nwere ụlọọrụ 'Nigeria National Petroleum Company Limited (NNPC)', kwuo na ha anabataghị ka ọ bụrụ isi ụlọọrụ na-ahụ maka ego n'ala Nigeria ga na-elekọta ya bụ ụlọọrụ NNPC, ma kpọọ òkù ka a hazie usoro onwunwe ya bụ ụlọọrụ n'okpuru atụmatụ 'Nigeria Sovereign Investment Authority (NSIA), ebe ọ bụ na ogoogo gọọmenti atọ niile nwere òkè na ya bụ ụlọọrụ.

N'iji kwalitekwuo ọnọdụ ọchịchị onyekwuoucheya, ndị gọvanọ ahụ jụrụ ịnabata mwepu ahụ e wepuru ka a na-esi n'usoro eletroniiki wee na-ezipu, na-ezikọta, ma na-ezipu mpụtara nhọpụta ọchịchị, bụ nke ndị omeiwu etiti wepuzịrị ugbua oge ahụ ha na-emegharị atụmatụ iwu ahụ na-ahụ maka nhọpụta ọchịchị.

Ndị òtù ahụ nọkwazịrị na nzukọ ahụ wee nabata ma kwuwaa na steeti Lagos ga-abụzị ebe ha jiri mere isi ụlọọrụ ọkpụtọrọkpụ ha, ọbụladị dịka ha kelere Gọvanọ steeti ahụ maka ile ha ọbịa nke ọma n'ọgbakọ ahụ, ya na ezi ọrụ dị iche iche ọ na-arụ na steeti ahụ, maka na ihe a gba n'aka, e jighị enyò ele ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484