Ndị Gọvanọ Ndịda Anyanwụ Enweela Ọgbakọ Izugbe n'Asaba

May 12, 2021 - 15:08
 0
Ndị Gọvanọ Ndịda Anyanwụ Enweela Ọgbakọ Izugbe n'Asaba

Izunna Okafor dere akụkọ a


Igbo sị na ọ na-abụ e jikọọ aka wee buo ozu enyi, ọ dị mfe; maka na ọ na-abụ e tikọọ isi ọnụ,  echichè adị mfe.

Ka ọ dị taa, ndị Gọvanọ steeti iri na asaa dị na mpaghara ndịda anyanwụ ala Nigeria (a maara dịka Souther Governors Forum) nọrọ ụbọchị Tuzdee wee nwee ọgbakọ banyere ajọ ọnọdụ nchekwa ahụ na-arịzị ibe ya elu n'ala Nigeria ugbua.

Ọgbakọ ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'Asaba, bụ isi obodo steeti Delta, ma bụrụkwa nke dọtara ndị Gọvanọ sitere mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ, mpaghara ndịda-ọdịda, na mpaghara ndịda-ndịda anyanwụ ala Nigeria.

Ya bụ nnukwu ọgbakọ bụ nke ndị Gọvanọ ahụ kwekọrịtara ime oge ha nwechara ọgbakọ n'izuụka gara aga, nke onyeisi ndị Gọvanọ ndịda-ọwụwa anyanwụ, bụ Gọvanọ Dave Umahi nke steeti Ebonyi; onyeisi ndị Gọvanọ ndịda-ọdịda anyanwụ, bụ Oluwarotimi Akeredolu nke steeti Ondo; na onyeisi ndị Gọvanọ ndịda-ndịda anyanwụ, bụ Gọvanọ Ifeanyị Okowa nke steeti Delta sonyere na ya.

Ndị gọvanọ ahụ nọrọ n'ọgbakọ ahụ wee tinye ọnụ n'ọtụtụ okwu dị iche iche na-emetụta mpaghara ahụ na ala Nigeria n'izugbe, nke gụnyere ọnọdụ nchekwa, nsogbu ndị Fụlani na-achị ehi, ịkpọ ganị-ganị, nsogbu òtù agbụrụ na-achọ ịdọwara ma nọọrọ onwe ha (ọkachasị òtù IPOB), mwakpò ndị omekoome, tinyere ụfọdụ ihe ndị ọzọ dị oke mkpa.

N'okwu ya oge ọ na-agụpụta nkwakọrịta ha n'aha ndị òtù ya, Gọvanọ steeti Ondo, bụ Maazị Rotimi Akeredolu mèrè ka a mara na ha kwekọrịtara ịkwalite ịdịnotu ala Nigeria n'usoro gbadoro ụkwụ n'udo na n'ikpe nkwụmọtọ (n'ụdị nwa mmụọ emegbula nwa mmadụ, ma nwa mmadụ emugbula nwa mmụọ); lebàá anya n'ịhazigharị ụdịdị ọnọdụ ala Nigeria; mkpọlite n'ọkwa n'ụlọọrụ gọọmentị etiti dịgasị iche iche (ma na ngalaba isi ụlọọrụ nchekwa dị iche iche); na ihe ndị ọzọ ha tụlere uche na ha, bụkwa ihe ndị ga-enye aka n'ịkwàlite ọnọdụ nchekwa na ọnọdụ akụnụba.

Ndị gọvanọ ahụ katọrọ mkpamkpa ndị Fulani na-achị ehi na-akpa na steeti dị iche iche na mpaghara ahụ, ma kwaa arịrị na nke ahụ emetụtala ịkọpụta erimeri n'ụzọ dị oke njọ na mpaghara ahụ, mee ka agụụ bawanye, ma sokwa mee ka ọnụahị erimeri rịgozie n'elu ọjị, n'ihi na ndị Fụlani ahụ ji ehi ha emebisi ihe a kọrọ n'ugbo. 

Ha jizịrị otu olu wee màchie ịchị ehi na-agagharị n'ezi na ụzọ steeti ọbụla na mpaghara ahụ, maọbụ ịchịrị ehi bàá n'ugbo mmadụ ka ha ga kpaa nri ebe ahụ. Ha gwàkwàzịrị gọọmentị etiti ka ọ kwàdo steeti ọbụla nwere mmasị n'iguzobe nà ịkwàlìtè usoro ọzọ maka ọzụzụ na mmepụta ehi na anụmaanụ ndị ọzọ.

Ha kpọkùrù onyeisiala Muhammadu Buhari ka o leba anya ma mee ihe ngwangwa banyere ọnọdụ nchekwa ala Nigeria, maka na ya bụ ihe na-achọzịkwa ịghọ ihe ọzọ; ọbụladị dịka ha kpọrọ òkù ka e nwee ndị uweojii steeti. 

Ha tinyere ọnụ n'okwu gbasaara mkpebi ahụ gọọmentị etiti mere na nsonso na ọ ga-enyekwa iwu 'onye apụtakwala ezi' ọzọ n'ihi ọrịa nje korona; ma kwuo na nke ahụ ga-ebìkwa ụmụ mmadụ aka ọjọọ n'ọtụtụ ụzọ dị iche iche; ọbụladị dịka ha kpọrọ òkù ka e wepụta usoro ọzọ dị mfe a ga-eji wee gbochie mgbasa ọrịa ahụ.

Ha nọrọ na nzukọ ahụ wee kpọọ òkù ka e nwee nnukwu ọgbakọ izugbe n'ala Nigeria, ebe a ga-anọ wee lebà anya n'ihe banyere ịkpọ ganị ganị òtù dị iche iche na-akpọ na steeti dị iche iche na mpaghara ahụ na na mpaghara ebe ndị ọzọ; ka e wee mara ihe bụ iwe maọbụ isiokwu ha.

Ha tinyèkwàrà ọnụ n'okwu ndị ọzọ metụtara 'agbakata akwụrụ' na oke nkwụkọju ụgbọala ahụ ndị njem na-ezute kwà ụbọchị na mpaghara ụzọ awara awara ahụ siri Oshodi gaa Apapa na steeti Lagos, nke bụ naanị ụzọ e si ebupute ngwaahịa dị n'ebe ndobe ngwaahịa Apapa; ma kpọọ òkù ka e mee ihe banyere nke ahụ, iji belata ya bụ oke nkwụkọju, n'ihi ụzọ dị iche iche ya bụ ihe si emetụta n'ọnọdụ akụnụba.

Dịka otu ụzọ isi belata ya bụ nkwụkọju ụgbọala n'ụzọ ahụ a na-ekwu okwu ya, ndị gọvanọ ahụ kwekọrịtara ma kpọọ òkù ka e mepee ebe ndobe ngwaahịa ndị ọzọ nà ebe ndị ọzọ ngwaahịa nà-abàta, dịgasị na steeti ndị ọzọ, ka ha wee màlite ọrụ n'uju, n'ihi na nke ahụ ga-enye aka ibelata oke nkwụkọju ahụ a na-enwe ebe ahụ, kewàpụtakwa ohere ọrụ nye ọtụtụ ndị ntorobịa, ma kwàlitekwa ọnọdụ akụnụba na ọnọdụ mmepe steeti ndị ahụ n'ụzọ dị iche iche.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484