Ndị Igboukwu Enweela Ọgbakọ Ekpere Pụrụ Iche, Chee Obodo Ha n'Aka Chineke

Apr 9, 2021 - 17:15
 0
Ndị Igboukwu Enweela Ọgbakọ Ekpere Pụrụ Iche, Chee Obodo Ha n'Aka Chineke

Izunna Okafor

Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ na nsonso a, dịka ndị obodo Igboukwu dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Agụata, na steeti Anambra, chịkọbara ọgbakọ ekpere pụrụ ichè, chee obodo ahụ n'ihu Chineke ma kpọkuo Ya ka O mepeere ha ụzọ.

Mmemme ọgbakọ ekpere ahụ, nke bụ nke mbụ obodo ahụ na-achịkọba ụdị ọgbakọ ahụ, bụ nke weere ọnọdụ n'ama egwuregwu ụlọụka 'St. Paul's Central School' dị n'Igboukwu, n'okpuru ọchịchị Agụata, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ụmụafọ obodo ahụ na ndị dị iche iche e ji okwu ha agba izu, nke gụnyere ndị ọrụ ụka, ndị sitere ụlọụka dị iche iche ndị ọchịchị obodo, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu. 

N'okwuchukwu ya n'ebe ahụ, onyeozi Chineke siri Steeti Rivers wee bịa, bụ Ụkọchukwu Elkanah Hason kọwara ya bụ ọgbakọ ekpere  dịka nke nwere ikike itiji agbụ niile nke ekwensu, weta ntọpụ n'agbụ ma wetekwa ngọzị na mmepe ụzọ n'obodo ahụ n'ọtụtụ ụzọ dị iche iche. 

O kelere ụmụafọ obodo ahụ maka ịghọta mkpa ọ dị iwedà onwe ha ala ma chọọ ihu Chineke site n'ọgbakọ ekpere ahụ, ọbụladị dịka o kpekwazịrị ka ihu Chineke mụkwasị n'obodo ahụ nà ná ndụ ụmụafọ obodo ahụ na n'ezi ihe ọbụla ha na-etinye aka na ya, ka ha wee hụta ezi ịdịmma Ya n'ozuzuoke n'obodo ukwu ahụ.

N'okwu nke ya, onye nọgodi n'ọkwa dịka eze ọdịnala Igboukwu, bụ Maazị Michael Nduka mere ka a mara na ọgbakọ ekpere ahụ a kpọrọ "Ekpere Maka Igboukwu" bụ nke ebumnobi ya bụ iji chọọ ihu Chineke n'ime ihe iche akamgba niile obodo ahụ na-ezute, ya na iji tijie agbụ niile nke ekwensu na ihe ndọghachi azụ niile na-echere obodo ahụ akamgba.

Dịka ọ na-ekwupụta na obodo ahụ mere ezi nzọpụụkwụ dị mma site n'ịchịkọba ọgbakọ ekpere ahụ iji chọọ ihu Chineke, o mere ka a mara na ọtụtụ obodo mepere emepe mèpèrè n'ihi na ha jiri Chineke na ekpere wee mere ntọala obodo ha, bụkwazị nke ha kpebiri ime site n'ọgbakọ ekpere ahụ pụrụ iche.

Na ntụnye nke ya, onyeisi ọchịchị 'Igboukwu Development Union' (IDU) bụ Maazị Chris Ike mere ka a mara na nke ahụ bụ nke mbụ na mbụ a na-achịkọba ụdị ọgbakọ ekpere dị etu ahụ n'obodo ahụ, ma kelekwazịe ndị niile pụtara n'ìgwè wee sonye na ya, ọbụladị dịka ọ kpọzịrị oku ka e nwee ịhụnanya, udo na ịdịnotu n'obodo ahụ, maka na ọ bụ n'ebe ihe ndị ahụ dị ka ngọzị Chineke na-abata.
 
Ụfọdụ ndị ọzọ soro nye aka n'ịhazi ọgbakọ ekpere ahụ ma sonyekwa na ya bụ ekpere, nke gụnyere Maazị Okey Eze, na Maazị Paul Egwuonwu kwupụtara na ha nwere okwukwe na ezi olileanya na ihe ukwu ga-amalite mebe n'obodo ahụ n'oge adịghị anya n'ihi ya bụ ọgbakọ ekpere.

A nọkwazịrị na mmemme ahụ kpee ọtụtụ ekpere dị iche iche maka ntọpụ n'agbụ, ibibi abụmọnụ, mmepe ụzọ, udo, ọganihu nakwa ezi ihe ndị ọzọ, dịka o siri bụrụ mkpa obodo ahụ na mmasị Chineke.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484