Ndị INEC Edebanyego Aha Nde Mmadụ Abụọ n'Akwụkwọ Maka Nhọpụta Anambra

Sep 22, 2017 - 19:51
Jan 23, 2021 - 17:20
 0
Ndị INEC Edebanyego Aha Nde Mmadụ Abụọ n'Akwụkwọ Maka Nhọpụta Anambra

Izunna Okafor, Awka

Otu na-ahụ maka nhọpụta ọchịchị n'ala anyị bụ INEC n'aha ịchafụ ekwuputana na ha edebanyego ihe ruru aha nde mmadụ abụọ n'akwụkwọ maka nhọpụta ahụ na-abịa n'ihu na steeti Anambra. Onye 'Resident Electoral Commisioner' nke steeti ahụ bụ maazị Nwachukwu Orji mere ka a mara nke a na nzukọ ya na ndị isi na-ahụ maka nhọpụta na ndị otu 'Civil Society Organisations' bụ CSOs n'aha ịchafụ mere n'Ọka bụ isi obodo steeti Anambra.

Otu na-ahụ maka nhọpụta ọchịchị n'ala anyị bụ INEC n'aha ịchafụ ekwuputana na ha edebanyego ihe ruru aha nde mmadụ abụọ n'akwụkwọ maka nhọpụta ahụ na-abịa n'ihu na steeti Anambra. Onye 'Resident Electoral Commisioner' nke steeti ahụ bụ maazị Nwachukwu Orji mere ka a mara nke a na nzukọ ya na ndị isi na-ahụ maka nhọpụta na ndị otu 'Civil Society Organisations' bụ CSOs n'aha ịchafụ mere n'Ọka bụ isi obodo steeti Anambra. Ọ sị na ha ga-ebipụta akwụkwọ ndebanye jikọtara ihe niile ahụ n'ihe dịka izu atọ na-abịa abịa, bụ nke ha ga eme n'ọgba atọ, ma mekwa ka ọ dị n'okpuru dị iche iche na steeti ahụ.

Maazị Ọrjị mekwara ka a mara na a ga-ezitekwa ọtụtụ ndị ọrụ nchekwa maka ya bụ nhọpụta, ma sị na n'ime ndị ọrụ nchekwa dị puku iri abụọ na ọtu a mapụtara maka ya bụ nhọpụta, na puku abụọ anọrọgorị anọrọ.

Ọ sị na otu INEC na steeti ahụ ga-arịọ ikike site n'aka isi ụlọ ọrụ ha dị n'Abụja iji wee nweta ụfọdụ ndị ga-eso rụ ọrụ na ya bụ nhọpụta site na mahadum dị iche iche na steeti ahụ, tinyere puku mmadụ asaa a ga-esi na ndị na-efe ala nna anyị wee nweta. Ọ sị na ọ bụ mmadụ iri atọ na ise ndị na-apụta ịzọ ya bụ ọkwa aka ga-achị steeti ahụ, ma sịkwa na otu pati ọbụla nke mere nhọpụta praịma ha na-agwaghị ha bụ ndị INEC emeghị ya n'usoro iwu, na n'ihi ya, na onye nke ha apụghị isonye na ya bụ nhọpụta.

O kwuru na ụlọ ọrụ ahụ ga enyocha ịchụ nta nkwa nke ndị otu ọbụla iji hụ na e nweghị okwu akpọmasi ọbụla na ihe ndị ọzọ na-ekwesighị ekwesi, ma gwakwa otu pati ọbụla ka ha mee ya bụ ihe n'usoro iwu.

N'okwu nke ya, onyeisi otu 'Policy and Legal Advocacy Centre' (PLAC) bụ maazị Clement Nwankwo kwuru na ala Naịjiria na-atụ anya ka ya, bụ nhọpụta ga-ewere ọnọdụ na steeti ahụ n'abalị iri na asatọ nke ọnwa Nọvemba ahọ a bụrụ nke e mere n'ụzọ pụrụ iche na n'ụzọ ghe anya oghe nke ọma karịa ndị a na-emebụ n'oge gara aga.

Ọ sị na anya onye ọbụla dị na ya bụ naṅhọpụta nke ukwu maka na ọ bụ site n'ezi mpụtara ya ka a ga-eji mara ihe nhọpụta izugbe a ga-eme n'ala anyị n'ahọ 2019 ga-abụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.