Ndị Nawfịa na Enugwu-Agịdị Eguzobego Otu Nkwado Maka Ịhọpụtagharị Gọvanọ Obianọ

Sep 27, 2017 - 16:46
Jan 22, 2021 - 22:07
 0
Ndị Nawfịa na Enugwu-Agịdị Eguzobego Otu Nkwado Maka Ịhọpụtagharị Gọvanọ Obianọ

Izunna Okafor, Awka

Mbọ dị iche iche a na-agba maka ịhọpụtagharị gọvanọ Willie Obianọ nke ugboro abụọ enwetawanyena nnọọ nkwado, dịka ndị obodo Nawfịa na Enugwu-Agịdị dị n'okpuru ọchịchị Njikọka na steeti Anambra nọrọ n'izu gara aga wee guzobe mkpokọta ndị ntorobịa karịrị narị atọ n'ọnụ ọgụgụ nakwa ndị ndu ha stite n'aka nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye gọvanọ n'ihe gbasaara nchịkọba ndị ntorobịa, bụ maazị Oddy Akubuike.

Ka ọ naa-eguzobe ndị ntorobịa ahụ, ya bụ nnukwu onye enyemaka pụrụ iche chetaara ha na gọvanọ Obianọ emego nke ọma n'ahọ atọ na ọkara ọ nọgoro n'ọkwa ọchịchị, ma gwaziekwa ha ka ha baa n'ime ime obodo ha dịgasị iche iche mee ka ndị mmadụ mara mkpa ọ dị na ya bụ nwa amadi nwetara mmeri maka ịchị nke ugboro abụọ.

Na nzaghachi, maazị Simon Ndulue na Nkem Obuzọr sitere Enugwu-Agịdị gbara akaebe banyere ọtụtụ ihe dị iche iche ọchịchị gọvanọ Obianọ meputagooro ndị ntorobịa na obodo ha, nke gụnyere iguzube ebe a na-amụ ọrụ aka dị iche iche, ebe obibi maka ndị ọrụ dọkịnta, inye ndị ntorobịa obodo ahụ karịrị narị anọ ọrụ, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ, ma kwekwa nkwa ịkwado ya bụ gọvanọ maka ịchị nke ugboro abụọ.

Na Nawfịa, onye ndu ndị ntorobịa n'obodo ahụ bụ maazị Obiọrah Okechukwu, na ndị nchịkọba ụmụ agbọghọbịa n'obodo ahụ bụ Adaeze Ijeoma Nwankwọ na nwaada Tessy Nweke kwuputakwara maa gbaa akaebe n'ọtụtụ ihe gọvanọ Obianọ meputagoro na mkpa ọ dị inye ya na osote ya bụ Dkt. Nkem Okeke nkwado nke ugboro abụọ.

Ihe pụtakarịchara ihe na mmemme ahụ gụnyere nguzobe e guzobere kpọmkwem ndị ndu nke nchịkọba ndị ntorobịa ahụ site n'aka onye enyemaka pụrụ iche nye osote gọvanọ n'ihe gbasaara okwe ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ maazị Anthony Otue, na nkwado ịchị nke ugboro abụọ nke e nyere gọvanọ na osote ya site n'aka ụmụafọ obodo abụọ ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.