Ndị Ntaakụkọ Nsụkka Enyela Obianọ Onyinye Nkwanyeugwù

May 26, 2021 - 20:37
May 30, 2021 - 19:26
 0
Ndị Ntaakụkọ Nsụkka Enyela Obianọ Onyinye Nkwanyeugwù

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ndị òtù jikọtara ndị ntaakụkọ na Nsukka dị na steeti Enugu nọrọ na nsonso a wee nye aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ onyinye nkwanyeùgwù maka mgbasàpụ aka ya ịnabàtà ndị ọbịa na steeti ya, imete ha mma, na inyekwa ha òhèrè n'ọchịchị ya.

Inye Gọvanọ onyinye nkwanyeùgwù ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'obodo Gọvanọ Obianọ bụ Agụleri; ma bụrụkwa nke ndị òtù ahụ mere ngwangwa ha gachara njem nleta n'ebe ahụ a na-arụ ọdụ ụgbọelu mba ụwa Anambra n'Ụmụeri dị n'okpuru ọchịchị 'Anambra East'

N'okwu ya oge ọ na-enye ya onyinye nkwanyeùgwù ahụ, onyeisi ndị òtù ahụ, bụ Maazị Chijioke Amu-Nnadi kwùrù na ebumnobi nkwanyeùgwù ahụ bụ iji kelee ya maka ezi ọrụ ya, ọkachasị site n'inye ótù nwanne ha nwoke, bụ Maazị James Eze ọkwa dị oke elu n'ọchịchị ya, bụ onye ọ kpọlitere n'ọkwa dịka odeakwụkwọ mgbasaozi ya, ma bụrụkwa onye ji ọkwa na gọọmentị ya, malite n'àgbà nke mbụ nke ọchịchị ya wee ruo na nke abụọ a.

Ọ kọwara Gọvanọ Obianọ dịka onye na-anabata ndị ọbịa nke ọma ma bụrụkwa onye na-arụsi ọrụ ike, bụ nke o gosipụàgòrò kemgbe ọtụtụ ahọ gara aga o jiri bata n'ọkwa ọchịchị ya; ma jaa ya ike ka o jide ka o ji.

Maazị Amu-Nnadi jikwàrà òhèrè ahụ wee kelee Gọvanọ Obianọ maka agadaga ọrụ dị iche iche ọ rụgoro na steeti ahụ, ọkachasị ọdụ ụgbọelu mba ụwa ahụ ọ rụrụ na nsonso a na steeti ahụ, ya na ọrụ ndị ọzọ ọ rụgoro kemgbe ahọ o jiri bàta n'ọkwa ọchịchị, ma kọwaa na ọdụ ụgbọelu ahụ ga-enye aka ịdọta mmepe dara ụda na steeti ahụ, na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ, na n'ala Nigeria n'izugbe.

Ọ kpọkùkwàzịrị Ndị Igbo ma dụọ ha ọdụ ka ha na-esi n'ọdụ ụgbọelu dị na mpaghara ala Igbo wee na-eme njem ha, n'ihi na nke ahụ ga-enye aka bèlatara ha mmefù ego ma nyekwa aka n'ịkwàlite ọnọdụ mmepe ampaghara ahụ.

Na nzaghachi ya oge ọ na-anata nkwanyeùgwù ahụ, Gọvanọ Obianọ mere ka a mara na ya na Maazị James Eze màtàrà onwe ha oge ha rụrụ n'ụlọ ọba ego, bụ oge Eze rụrụ ọrụ nke ọma n'okpuru ya n'ụlọọrụ ha dịka obere nwaokorobịa; ma bụrụkwazie ihe mere o jiri chètá ya ma kpọlite ya n'ọkwa ka ọ nọrọ n'ísí n'ihe banyere mgbasaozi ya oge ọ batara n'ọkwa ọchịchị.

Banyere ọdụ ụgbọelu ahụ ọ na-arụ n'Ụmụeri, o kwuru ọzọ na ọchịchị ya ebìrìghị ego ọbụla site n'ebe ọbụla iji wee rụọ ọdụ ụgbọelu ahụ, ma kwuo na ọdụ ụgbọelu ahụ na ihe ndị ọzọ ọchịchị ya rụgòrò na ndị nke a ka na-arụ arụ ugbua dabàrà adabà na nkwà o kwere iwèta mmepe tọrọ atọ na steeti Anambra, na iwulite ọnọdụ akụnụba steeti ahụ.

O kèlèkwàzịrị ndị ahụ maka nkwanyeùgwù ahụ, ma kwe nkwà ịga n'ihu na-anabata ndị ọbịa na steeti ahụ, ọbụladị dịka o kwenwòrò nkwà inye ụmụafọ steeti ahụ na ndị ọbịa ezi ọchịchị bụ ịgbà.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484