Ndị NYSC Ahụ Ndị Ntọ Tọ̀ọ̀rọ̀ Ènwéréla Onwe Ha

Nov 3, 2021 - 21:39
 0
Ndị NYSC Ahụ Ndị Ntọ Tọ̀ọ̀rọ̀ Ènwéréla Onwe Ha

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ka ọ gachaara abalị olenaole e jiri tọrọ ha, mmadụ abụọ ndị ahụ ji otu ahọ efe ala nna ha n'okpuru amụmà 'National Youth Service Corps (NYSC)' ndị ntọ tọọọrọ enwerela onwe ha pụọ n'aka ndị tọọrọ ha.

Nke a bụ nke e mere ka ụwa mara site n'ozi a kụpụrụ ụbọchị Wenezdee site n'aka onye enyemaka pụrụ iche nye Gọvanọ Samuel Ortom nke steeti Benue n'ihe gbasaara mgbasàozi ogbaraọ̀hụ́rụ, bụ Jimin Geoffrey site n'ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ. Ọ kọwara na ọ bụ site na njikọaka gọọmenti steeti ahụ, ụlọọrụ ụgbọala e ji ebu ndị njem, bụ Benue Links na ezinụlọ ndị ahụ a tọọrọ atọrọ ka e jiri nweta ntọhapụ ndị ahụ.

Dịka o siri kọwaa, mmadụ abụọ n'ime mmadụ isii ahụ a tọhapụrụ bụ ndị ji otu ahọ efe ala nna ha, ma bụrụkwa ndị a tọọrọ n'ụzọ oge ha na-aga n'ogigè ebe a na-enye ndị ji otu ahọ efe ala nna ha ọzụzụ na steeti Zamfara; ebe mmadụ anọ ndị ọzọ bụ ụmụafọ steeti Benue na-emere onwe ha njem.

O nyere aha ndị NYSC ahụ dịka Jennifer Awashima Iorliam na Joseph Zakaa. Ọ gakwara n'ihu kwuo na otu onye n'ime ndị ahụ a tọọrọ, bụ Sedoo Kondo, bụ nwata akwụkwọ mahadum 'Usman Dan Fodio University, Sokoto', ma bụrụkwa onye a tọ̀ọ̀rọ̀ n'ụzọ oge ọ na-alaghachi n'ụlọakwụkwọ ya. O kwukwara na onye nke ọzọ bụ Ruth Sesuur Tsokar, ma bụrụkwa onye na-aga eleta nwanne ya bi na steeti Kebbi; ebe mmadụ abụọ ndị ọzọ bụ Muhammadu Saminu na Safiam Muhammadu bụ ụmụnne abụọ na-aga Sokoto, tupu ndị ntọ wee wakpo ha niile n'ụzọ n'ụgbọala Benue Links ha nọ were eme njem, wee tọrọ ha na ndị NYSC ahụ.

Maazị Geoffrey kọwara na ọ bụ n'elekere isii nke mgbede ka e jiri tọ́hàpụ̀ ndị ahụ. Kaosiladị, o kwughị na o nwere ụgwọ ha kwụrụ ndị ntọ ahụ tupu ha tọhapụ ha ma ọ bụ na a kwụghị ha ụgwọ ọbụla.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484