Ndị Obosi Emeela Emume Ito Ọgbọ Nke Ahọ 2021

Mar 11, 2021 - 14:40
 0
Ndị Obosi Emeela Emume Ito Ọgbọ Nke Ahọ 2021
Ndị Obosi Emeela Emume Ito Ọgbọ Nke Ahọ 2021
Ndị Obosi Emeela Emume Ito Ọgbọ Nke Ahọ 2021

Izunna Okafor dere akụkọ a

Omenala bụ ọbara na-ehù na ndụ àgbụrụ, ma bụrụkwa nwata tote o tokwuru.

Nke a bụ nke pụtara ihè n'ozùzuoke, dịka ndị Obosi dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Idemili North' nke steeti Anambra merùbere emume Ito Ọgbọ, bụ otu nnukwu emume e jiri mara obodo ahụ.

Ya bụ oke mmemme bụ nke weere ọnọdụ n'ogige Afor Adike, ma bụrụkwa nke dọtara imirikiti ụmụafọ obodo ahụ na ọtụtụ ndị ọzọ siri ebe dị icheiche wee bịa isonye na ya.

N'okwu nnabata ya na mmemme ahụ, eze ọdịnala Obosi, bụ Igwe Chidubem Iweka mere ka a mara na a malitere ime emume Ito Ọgbọ Obosi kemgbe ihe karịrị narị ahọ gara, ma bụrụkwa mmemme sitere n'aka ndị nna-nna ha wee rute ha aka. 

Dịka ọ na-ekwupụta na ọ bụ mmemme ahụ bụ nke kachasị mmemme niile a na-eme n'obodo ahụ, ọ kọwara na mmemme ahụ bụ nke ha ji emerùbe ma na-akwanyere ndị okenye ha ndị rugoro ahọ iri asatọ ùgwù n'ụzọ pụrụ iche, ma mee ka a mara na o nweghị ihe ịgwọ ọgwụ ọjọọ ọbụla maọbụ ikpere arụsị dị na ya bụ mmemme, nke pụtara na onye ọbụla nwere ike isonye na mmemme ahụ.

N'ozi ekele ya na mmemme ahụ, Minịsta na-ahụ maka mgbasa ozi na omenala n'ala Nigeria, bụ Maazị Lai Mohammed tòrò ndị Obosi na eze ọdịnala ha maka ichekwaba na ijigidesi omenala ahụ ike kemgbe ọtụtụ ahọ gara aga, bụ nke nwere ọtụtụ ezi mmetụta na mpụtàra n'ịkwalite ahụike na ọnọdụ obibindụ ụmụ mmadụ na mmepe obodo ahụ n'izugbe.

Ya bụ Minịsta, nke onye nọchitere anya ya na mmemme ahụ bụ odeakwụkwọ ọkpụtọrọkpụ na ngalaba ụlọọrụ ahụ, bụ Dọkịta Ifeoma Anyanwutaku kwupụtanwòrò mkpebi na ezi njikere nke ọchịchị onyeisiala Muhammadu Buhari nwere itute na ịkwalitesi ụzọ dị icheiche ego ga-esi na-abata n'akpa gọọmenti, bụ nke otu n'ime ha bụ inwògharị ngalaba omenala na njem nlegharịanya.

Dịka ọ na-akọwa na itute ụzọ dị etu ahụ ego ga-esi na-abata n'akpa gọọmenti ga-enye aka ibelata oke ntụkwasịobi na mmanụ a na-egwute n'ala, ya bụ Minịsta kelekwara ndị Obosi ọzọ maka ọmarịcha emume ahụ, ma kwupụta na ụlọọrụ ya dị ezi njikere ijikọ aka ọnụ, ha na ndị Obosi iji hụ na mmemme ahụ anwụghị, ma mee ya ka ọ gbagotekwuo n'ogoogo ịbụ emume a mà àmá n'ala Nigeria.

N'akụkụ nke ya, Minịsta na-ahụ maka gburugburu, bụ Oriakụ Sharon Ikeazor kelere ndị obodo maka ịchịkọba mmemme ahụ, kelee ndị òtù ọgbọ 'Igwebuike Age Grade' maka etu e siri hazie ya bụ mmemme, ma kwezie nkwa na ọ ga-enye aka ịkwalite emume ahụ ka ọ bụrụ nke a na-eme n'ogoogo mba ụwa ma sorokwa na mmemme ndị UNESCO.

Na mbụ n'okwu ya, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obiano, nke Kọmishọna na-ahụ maka omenala na njem nlegharị na steeti ahụ, bụ Dọkịta Anịerobi nọchitere anya ya, mere ka a mara na omenala so n'otu ihe ọchịchị ya na-ejigidesi ike, ma gbaa akaebe na Ndị Anambra nwère ọtụtụ omenala na ọnatarachi dị icheiche Chineke jiri gọzie ha, bụ nke kwesiri ka a kwàlite ha nke ọma.
 
O kwuru na ọchịchị ya ga-aga n'ihu ịkwàdò omenala dị icheiche e jiri mara obodo dị na steeti ahụ, iji gaa n'ihu ime ka ebe bụrụ ebe nlegaraanya maka ndị ji ego achụ ego.
 
Mmemme ahụ dọtara mmadụ ruru narị abụọ gbara ahọ iri asatọ, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee nye nkwanyeugwu, tie mmanwụ, gbaa egwu ọdịnala dị icheiche, ma rie ọtụtụ erimeri, tinyere ihe ndị ọzọ e jiri mee ndị mmadụ obi ụtọ, nke mere ka emume ahụ zaa aha a kpọrọ ya n'ezie.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484