Ndị Ọgbaru Ekwuputana Nkwado Ha Nye Ọchịchị Obianọ Nke Ugboro Abụọ

Sep 11, 2017 - 09:23
Jan 23, 2021 - 22:49
 0
Ndị Ọgbaru Ekwuputana Nkwado Ha Nye Ọchịchị Obianọ Nke Ugboro Abụọ

Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Ndị e ji okwu ha agba izu n'okpuru ọchịchị Ọgbaru dị na steeti Anambra ekwupụtago n'ebe ọ dara ụda na ha kwụ aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Willie Obianọ n'azụ ma na-enyekwa ya nkwado zuru oke ịchị steeti ahụ nke ugboro abụọ.

Ndị otu a kwupụtara nke ahụ na mmemme a chịkọbara site n'aka ndị otu pati APGA n'okpuru ọchịchị ahụ, bụ nke dọtara ọtụtụ ndị ukwu dị iche iche, nke gụnyere: onye isi otu pati ahụ n'okpuru ọchịchị Ikeja dị na steeti Legọọsị, ma bụrụkwa onye ode akwụkwọ nchịkọba nke otu Ọhaneze Ndị Igbo na steeti Anambra, bụ maazị Emmanuel Awogu.

Ka ọ na-agwa ọhaneze ndị bịara mmemme ahụ okwu, onye ndu otu ụmụ nwaanyị n'okpuru ọchịchị ahụ, bụ 'Dame' Chinyere Mbakwe sị na ọtụtụ ọrụ dị iche iche Gọvanọ Willie Obianọ rụpụtara na ngalaba dị iche iche na steeti ahụ, tinyere ezi ọnọdụ nchekwa, ịkwụ ndị nkụzi na ndị ọrụ ụgwọ ọnwa n'oge, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ o mepụtagoro  ga-agbara ya aka ebe, ma mekwa ka nturu ugo ya na nhọpụta ahụ na-abịa n'ihu na steeti ahụ bụrụ nnọọ nke dara ụda dịka a tụrụ anya.

Ọ rịọzịkwara ndị Anambra ka ha ghara ikwe ka onye ma ọ bụ otu ọbụla duhie ma ọ bụ ghọrịa ha na  nhọpụta ahụ na-akpụdobe nso, bụ nke ga-ewere ọnọdụ n'abalị iri na asatọ nke ọnwa Nọvemba ahọ a.

N'otu n'otu n'okwu ha, nnukwu onye enyem aka pụrụ iche nye Gọvanọ Obianọ n'ihe gbasaara ndọrọndọrọ ọchịchị bụ maazị Arịnzechukwu Awọgụ, na ogbo ya bụ maazị Paul Nwosu kwuputara na Gọvanọ Obianọ dị njikere ịhụ na ihe na-agawanye n'ihu na steeti ahụ otu o kwesiri, ọbụnadị ruo ọchịchị ya nke ugboro abụọ.

Ha bụ ndị otu e ji okwu ha agba izu nọrọ n'ebe ahụ kwuo hoohaa na ọchịchị Gọvanọ Willie Obianọ dị ha mma, na n'ihi ya, ya chịrị gaba, na ha kwụkwa ya n'azụ, maka na ọchịrị mma ga-achịkwa ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.