Ndi Ogidi Echiena Gọvanọ Obianọ 'Dike E Ji Eje Mba'

Sep 18, 2017 - 06:06
Jan 23, 2021 - 17:46
 0
Ndi Ogidi Echiena Gọvanọ Obianọ 'Dike E Ji Eje Mba'

Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ enwetena aha echichi ọhụụ 'Dike e ji eje mba' site n'aka ndị obodo Ogidi, bụ nke dị n'okpuru ọchịchị Idemili Nọọtụ na steeti ahụ.

Aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ enwetena aha echichi ọhụụ 'Dike e ji eje mba' site n'aka ndị obodo Ogidi, bụ nke dị n'okpuru ọchịchị Idemili Nọọtụ na steeti ahụ.

Gọvanọ Obianọ natara ya bụ oke echichi pụrụ iche na mmeme Ilo Mmụọ bụ nke weere ọnọdụ n'obi eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Alex Ọnyịdo, ma bụrụkwa mmemme ndị obodo ahụ na-eji eme emume iri ji ọhụụ ha.

Ya bụ mmemme bụ nke dọtara ndị ukwu ndị ukwu dị iche iche site na mpaghara dị iche iche n'ala anyị, nke gụnyere gọvanọ Willie Obianọ na osote ya bụ Dọkịnta Nkem Okeke, onye isi otu pati APGA n'ala anyị n'oge mbụ, ma bụrụkwa onye isi otu ịchụ nta nkwado maka ịhọpụtagharị gọvanọ Willie Obianọ nke ugboro abụọ, bụ Maazị Victor Umeh, tinyere ọtụtụ ndị ọrụ gọọmeenti dị iche iche na ụmụafọ obodo ahụ.

Ka ọ na-echibe ya echichi ahụ, Igwe Ọnyịdọ sị na ya bụ mmemme bụ nke dịbara gboo iji kwalite mmekọrịta na ịdị n'otu nke ndị obodo ahụ, ma kpekwazie ekpere ka owuwe ihe ubi nke ahọ a bukarịchaa nke ndị gara aga. O toro gọvanọ Obianọ n'ihi ihe dị iche iche o mepụtagoro kemgbe ọ rịgooro n'ọkwa ọchịchị, ọ kachasị na ngalaba ọrụ ugbo, nchekwa na ihe mwunye, ma gwakwazie ya na ndị obodo ahụ ekpebiena ịkwado ya na nhọpụta ahụ na-abịa n'ihu na steeti ahụ n'ihi na o gosina ha ịhụnanya.

N'okwu nke ya kwa, otu nwaafọ obodo ahụ ma bụrụkwq onye a ma ama n'ịzụ ahịa, bụ 'Chief' Sam Anyanwụtakụ, mere ka a mara na site n'aka gọvanọ Obianọ, na Chineke ewechighatana udo n'obodo, bụ nke gbapụrụ kemgbe ihe karịrị ahọ iri abụọ gara aga a na-azọ eze na ya bụ obodo, ma sịkwazie na echichi ahụ bụ iji kele ya n'ihe o meere ha.

Na nzaghachi, gọvanọ Obianọ kelere Igwe Ọnyịdọ na Ogidi niile banyere nnukwu nkwanye ugwu ahụ ha nyere ya ma kwe ha nkwa na ọ ga-aga n'ihu na-echeta ndị obodo ahụ n'ọchịchị ya. Ọ sị na ọrụ ijikọ aka ọnụ nke ya na ndị Anambra iji hụ na e nwere ịdị n'otu na ezi ọnọdụ obibi ndụ so n'ezi ihu na mbọ ọchịchị ya na-agba, na n'ihi ya, na ọ ga-agakwa n'ihu n'ịkwalite ezi ọdịmma ahụ site n'ọchịchị ya.

N'ozi ekele ya, ode akwụkwọ mgbasa ozi nke otu pati APGA n'ala anyị bụ maazị Ifeatụ Obi-Okoye, onye bụkwa nwaafọ obodo ahụ kwuru na mmemme ahụ nke e jikwa echeta ọgbụgba otu ahọ Igwe Ọnyịdo jiri rịgoro n'ọkwa ọhịchị bụ nke dara ụda n'ihi na ngọzị ọdịnala amalitekwana ịbatara ụmụafọ obodo ahụ n'ịgba mbọ ha niile, ka ọ gasịrị nnọọ ihe karịrị ahọ iri abụọ.

Imepe ụlọ ọrụ nhazị ọhụụ nke eze ọdịnala ahụ na egwu ọdịnala dị iche iche a gbara so n'ihe pụtakarịchara ihè na ya bụ mmemme.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.