Ndị Òjì Egbè Abagbuola Onyeisi Ọchịchị Obodo Nimo n'Anambra

Apr 17, 2019 - 22:09
Jan 21, 2021 - 22:10
 0
Ndị Òjì Egbè Abagbuola Onyeisi Ọchịchị Obodo Nimo n'Anambra

By Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Dịka a sị na ọ bụ chi na-efo ihe ọma na ihe ọjọọ ana-efote, ndị oji egbe ezu, ndị a maghị ndị ha bụ agbagbuola maazị Frank Anthony Igboka, bụ onyeisi ọchịchị òbòdò Nimo dị n'okpuru ọchịchị Njikọka na steeti Anambra.

Nwa amadi a, onye a maara dịka Mmili ka a gbàgburu n'ime ụgbọala ya ụbọchị Tuuzdee mgbe ọ gara ịzụrụ onwe ya ihe n'ahịa Oyè Nimo, bụkwazị ebe a nọrọ wee kwàá mgbọ dị egwù site n'aka ndị a maghị ndị ha bụ.

Dịka ozi a kụpụrụ site n'aka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhanaeze na ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ maazị Harụna Mọhamed, siri kọwaa, ebelebe ahụ gbùrù ka o jiri nkeji iri na asatọ gafèé elekere asatọ nke anyasị, bụ oge ndị ahụ màlitere gbaba egbè aghara aghara n'ahịa ahụ.

O kwuru na ndị ọrụ uwe ojii nọ na mpaghara Nimo ahụ gbààrà gaba ebe ahụ oge ya bụ ụda egbe màlitere ịda; ma mgbe ha rùrù, ha hụzịrị nwa amadi ahụ ka ọ tọbììrì n'ime ụgbọala Chevrolet SUV ya n'ogbu ọbara na àpà mgbọ egbe juru ya ahụ. Nke ahụ, dịka o siri kwuo, mezịrị ka ha búrú ya ozigbo gaba ụlọ ahụike Beke dị na Nimo, bụ ebe dọkịta nọzịrị wee lee ya ahụ, ma fee n'isi, sị na ụkwa a na-apị, nà mkpụrụ adịghị ya.

N'ịga n'ihu, maazị Harụna kwuru na site n'obere nnyocha e mègoro, na a chọpụtara na ndị ahụ dị mmadụ anọ n'ọnụ ọgụgụ, wee nọrọ nso nke ukwuu, jìrí égbè sụọ nwa amadi ahụ kọtọkọtọ, ma buru ụgbọala ha tinye isi n'ụzọ chere ihu n'Eziowelle, nyàá ọnwụ ọnwụ, fee ka nnụụ, larie ozigbo, nke na o nweghịzịkwa onye hụrụ azụ ha anya. Ọ sịkwa na ha tụtụkọtara mgbọ egbe 7.62 MM a gbagoro agba n'ebe ahụ ya bụ ihe nọrọ wee mee.

O forozịrị ntutu taa, sị na ha ga-eme nnyòcha miri èmì banyere nke ahụ, iji nwụchikọọ ndị obikpọnkụ ahụ kpara ya bụ arụ, ọ bụnadị dịka ọ dụrụ ọhanaeze ka ha nyere ha aka site n'inye ha ozi ọbụla dị mkpà ga-eme ka e nwee ike ijide ndị ahụ na ndị ọzọ na-ebute ala adịghị mma na steeti ahụ, site n'ịkpọtụrụ ha n'akara ntụmadị, bụ 07039194332.

N'okwu dịkwa ka ibè ya, gọọmenti steeti Anambra adịlarị na mbụ katọọ ogbugbu ahụ e gburu ya bụ nwa amadi, ma kọwaa ya dịka nke jọgburu ònwé ya na nke na-agba anya mmiri.

Kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka mgbasa ozi na ịkọwara ọhanaeze ihe ha kwèsiri ịma, bụ maazị C. Don Adịnụba gbarụrụ ihu bànyere nke ahụ, ka ọ nara ozi maka ya bụ akụkọ ọjọọ.

N'ozi a kụpụzịrị site n'aka ya bụ kọmishọna n'aha gọọmenti Anambra, ọchịchị steeti ahụ àmápụtala ma kwe nkwà inye mmadụ ọbụla gba ezi àmà ma ọ bụ wèta ozi ga-edubànye ma nye aka n'ijide ndị gburu nwa amadi ahụ ego dị nde Naịra ise.

N'oge gara aga, maazị Frank Anthony Igboka bụ onye ome iwu, n'ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti Anambra, bụ ebe ọ nọchitere anya ọgbọ nta nkwàdo Njikọka malite n'ahọ 1999 ruo n'ahọ 2003.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.