Ndị Okenye Anambra, Òtù UN Etòóla Obianọ Maka Ọdụ Ụgbọelu Anambra

Ndị Okenye Anambra, Òtù UN Etòóla Obianọ Maka Ọdụ Ụgbọelu Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ a


Ndị okenye steeti Anambra, bụ ndị a maara dịka 'Anambra Elders Council' etòóla aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ maka ọkpụrụkpụ ọrụ dị icheiche o jigasị n'aka na steeti ahụ, ọkachasị ọdụ ụgbọelu mba ụwa ahụ ọ na-arụ n'Ụmụeri (a maara dịka 'Anambra International Cargo and Passenger Airport') na ògigè ụlọ ezumezu mba ahụ ụwa ọ na-arụ n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ (a maara dịka 'Anambra International Conference Center').

Ndị okenye a kwupụtara ekele ha oge ha soro Gọvanọ wee gaa ileta ka ọrụ si aga n'ebe ahụ a na-arụ ọdụ ụgbọelu ahụ, bụkwa ebe Gọvanọ jiri ọnụ ya wee kọwasịara ha ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ n'akụkụ niile nke ọdụ ụgbọelu ahụ.

N'okwu ya n'ebe ahụ, onye jibụ ọkwa dịka Odeakwụkwọ Izugbe òtù mba ụwa 'Commonwealth' kọwàrà ọdụ ụgbọelu ahụ dịka nke magburu onwe ya, ma kelee ya bụ Gọvanọ Obianọ maka agadaga ọrụ ahụ, ọkachasị maka na o nweghị ebe  maọbụ onye ọbụla o bìrì ego wee rụọ ya bụ ya bụ ọkpụrụkpụ ọrụ.

Ọ kọwara Obianọ dịka onye ma nke ekwe na-akụ n'ịma ka e si ejiịkwa ego, kwuo na ọdụ ụgbọelu ahụ na ụlọ ezumezu ahụ ga-adọta mmepe dara ụda, kwàlitekwa ọnọdụ akụnụba steeti ahụ; ma kpọkuzie ndị mmadụ ka ha bata na steeti ahụ bịa wunye akụnụba ha n'ime steeti ajụ.

Ndị ọzọ dị icheiche kwuru okwu n'ebe ahụ gụnyere onyeisi òtù 'Congregation for Divine Worship' n'oge mbụ, bụ Cardinal Francis Arinze; Ashbishọọpụ Ụka Angịlịkan Na Mpaghara Niger na Bishọọpụ Dayọsiisi Awka, bụ Ashbishọọpụ  Alexander Ibezim; onye chịrị steeti Anambra n'oge mbụ, bụ Gọvanọ Chukwemeka Ezeife; onyeisioche otu jikọtara ndị eze ọdịnala na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ, bụ Igwe Nnaemeka Achebe; osote onyeisi otu Ọhaneze Ndị Igbo, bụ Maazị Damian Okeke-Ogene, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ, bụkwa ndị kelere Chineke maka ngwaọrụ o ji Gọvanọ ahụ akwara na steeti ahụ, ma kpekwa kwupụtakwa olileanya o nwere na a ga-arụchapụ ma gbapee ya bụ ọdụ ụgbọelu n'oge adịghị anya.


N'akụkọ ọzọ dịkwa ka ibè ya, òtù mba ụwa a maara dịka òtù 'United Nations' (UN) etòóla aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ maka ọdụ ụgbọelu mba ụwa ahụ ọ rụrụ na steeti ahụ, ma kọwakwa ya dịka otu n'ime ihe kacha da ụda ọchịchị nọ ugbua na steeti ahụ megoro.

Ọ bụ onye ọrụ UN na-ahụ maka ihe metụtara mmadụ n'ala Nigeria, bụ Maazị Edward Kallon nyere Gọvanọ ekele a oge ya na ụfọdụ ndịisi òtù mba ụwa dị icheiche, nke gụnyere òtù 'European Union' (EU) òtù 'World Health Organisation' (WHO) soro Gọvanọ Obianọ na ọfọdụ ndị ọrụ gọọmenti steeti ahụ wee bàgide na njem nleta n'ogige ebe ahụ a na-arụ ya bụ ọdụ ụgbọelu, dị n'Ụmụeri, n'okpuruọchịchị ime obodo 'Anambra East'.

Ka ha gagharịchara na gburugburu ogige ọrụ ahụ, Maazị Kallon kwupụtàrà afọojuju ya banyere ụdị kpọcha-kpọcha akụrụngwa e ji arụ ọrụ ahụ, nà et ọtụ si agawanye n'ihu n'ike n'ike ebe ahụ; ma kọwaa ya dịka ntọala na ezigbo nzọpụ ụkwụ ga-ewulite ọnọdụ mmepe na ọnọdụ akụnụba steeti ahụ, mapaghata ndịda-ọwụwa anyanwụ na ala Nigeria n'ozuzuoke ma ọrụ malite n'ebe ahụ n'uju.

N'okwu nke ha n'otu n'otu, Gọvanọ Obianọ na Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ ngo na steeti ahụ, bụ Injinia Marcel Ifejiofor, onye dugharịrị ndị ahụ n'ogige ahụ nyèrè nkọwa banyere ọdụ ụgbọelu ahụ, etu ọnọdụ ọrụ siri gbata kwụrụ n'ebe ahụ, na uru dị icheiche ogige ya bụ ọdụ ụgbọelu mba ụwa ga-eweta, nà ụzọ dị iche iche ọ ga-esi nye aka n'ịkwalite ọnọdụ mmepe na ọnọdụ akụnụba steeti ahụ.

Ndị ahụ gàkwàrà njem nleta n'ụlọọrụ na-ahụ maka atụmatụ nchekwa ahụike a maara dịka 'Anambra State Health Insurance Agency' (ASHIA), iji hụkwa ka ihe si aga n'ebe ahụ; ma bụrụkwa ebe ọ nọrọ gbapee ogige a kpọrọ 'Data Operations Centre', nke ngalaba ahụike steeti ahụ ga-eji na-arụ ọrụ.

Ha mechàkwaziere ụbọchị ahụ, gaa n'ebe obibi Gọvanọ dị n'Amawbia, bụ ebe Maazị Kallon nọrọ wee gbapee usoro a maara dịka 'Mobile Technology Health Insurance Platform' (MTHIP) nke mbụ ya n'ala Nigeria, iji mee ka ndị nọ n'ime-ime obodo nwee ike isonye n'amụmà nchekwa ahụike n'enweghị nsogbu maọbụ ihe mgbakàsịahụ ọbụla.