Ndị Omekoome Awakpòla Ogige Ndị Na-Agba Ọsọ Ndụ Na Benue

May 15, 2021 - 20:45
 0
Ndị Omekoome Awakpòla Ogige Ndị Na-Agba Ọsọ Ndụ Na Benue

Izunna Okafor dere akụkọ a

Igbo sị na ọ na-abụ gbaa afọ ọ bụrụ omenala! Ịghafu ọbara, mpụ na arụrụala dị iche iche abụrụla ụkwa a chị n’aka n’ala Nigeria. O wee bụrụ ụka bụrụ ilu.

Mkpamkpa kpara n’ogige ndị gbapụrụ ọsọ ndụ site n’ụlọ ha nke a kpọrọ Abagena Internally Displaced Persons (IDP) Camp dị ihe dịka kilomita iri na mpụga Makurdi, isiobodo steeti Benue. Ndị oji egbe nke a na-eche na ha bụ ndị na-achị ehi wakporo ndị ahụ gbatara ọsọ ndụ ma biri n’ogige ahụ kemgbe ọtụtụ afọ, gbaa ha gwoo gwoo. Ha gburu ma merụọ ọtụtụ ndị mmadụ ahụ.

Ya bụ ihe ka e kwuru na o mere n’etiti abalị mgbe ọtụtụ n’ime ndị bi n’ogige ahụ, bụ ndị karịrị puku asatọ n’ọnụọgụ labacharala ụra abalị n’ụlọ ezumezu (halls) dị iche iche, ebe ụfọdụ nọ n’ụra na mbara n’ihi oke ekpomọkụ.

Otu agadi nwaanyị aha ya bụ Mama Atsuku onye kọwara na ya mụ anya oge ndị ọchị ehi ahụ wakporo ha, kwuru na ya nọkatara na ndeeri ahụ nụba ụda egbe n’ike n’ike tutu o bido zobezie ka mmiri. Mama Atsuku bi n’ogige ahụ kemgbe 2018 dịka ndị na-achị ehi wakpochara ha n’obodo ha bụ Umenger nke dị n’okpuru ọchịchị Guma na steeti ahụ. Dịka o siri kwu, oge ụda egbe ahụ dabaziri aghara aghara, ndị mmadụ ji ime abalị ahụ zọba isi onwe ha site n’ịgba ọsọ ndụ, eleghị anya n’azụ. Na ya malitere ọsọ nke ya ma daa ada; nke mere ka ikpere ya chikwapụ.

O kwuru sị: “Ana m agba ọsọ ka m gaa ebe m ga-ezo ma gbahapụ mkpọ m dịka m na-eme nke ahụ. N’ihi na ndị ọzọ na-agbakwa ọsọ, a dara m ada, ọ bụ sọ Chineke zọpụtara m nke mere na ndị ọzọ ejighị ụkwụ zogbu m. Anọ m ebe ahụ, enweghị m ike ikulite ọtọ ganye na otu nwoke abịa kulite m n’ala.”

Ya mere, Mama Atsuku enweghịzi ihe ọ ga-eme karịa isi n’ogige ahụ pụọ, dịka ọtụtụ ndị ọzọ bi ebe ahụ. Mana ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ bụ, ebee ka ndị a bi n’ogige (IDPs) na-aga site n’ebe a?

N’okwu nke ya, David Avese, ji ụmụ asaa onye nke mgbọ egbe tụgburu otu nwa ya nwoke n’abalị ahụ, ebe ụmụ ya nwoke abụọ bụ Terkura na Joshua na-azọ ndụ ha n’ụlọụgwọ Benue State University Teaching Hospital (BSUTH) gwara ndị ntaakụkọ site n’ụlọọgwụ sị na ụmụ ya nwoke atọ dina ala n’otu ute wee na-arahụ ụra n’abalị ahụ oge ndị omekome ahụ gbara ogige ahụ okirikiri wee na-agba egbe.

O kwuru sị: “Ndị oji egbe ahụ gbara egbe ihe ruru awa abụọ n’enweghị ndị ọrụ nchekwa gbataara anyị ọsọ enyemaka. Ma dịka mgbọ si na mpụta afọ Terkura gafee, Joshua enwetachaghị ụdị chi ọma ahụ dịka a gbara ya egbe ma gbukwaa ya mma n’aka na ụkwụ.”

Mama Nguhian Gwaza, onye nke e gburu mma na ngụgụ ya n’akụkụ ara, nọkwa n’ụlọọgwụ ahụ.

N’akụkụ nke ya, Gwabo Matthew, onye na-ekwusi ike na ọ bụ ndị Fulani mere nwakpo ahụ kọwara sị: “Mgbe ha mechara ebumnuche ha wee pụọ, e butere ozu mmadụ isii ma buru ọtụtụ ndị ọzọ ha merụrụ ahụ gaa ụlọọgwụ, ebe otu n’ime ha mechara nwụọ.”

E kwuru na ozugbo ndị omekome ahụ siri ebe ahụ pụọ dịka ha kpachara arụ, ha gawakwara n’ebe ọzọ, a kpọrọ Chile Island, Mbatoho dị na Makurdi, ebe ha wakporo ma merụkwa ndị mmadụ ahụ. Otu onye bị n’ogbe ahụ Denen Guntu, gwara ndị ntaakụkọ tinyere ihe ndị ọzọ gbasara otu ha siri gbaa nwunye nwanne ya egbe, na ha wakporo ha n’ihe dịka elekere atọ nke ụzọ ụtụtụ.

N’ihi oke iwe na mwute banyere mwakpo ahụ, ndịntorobịa okirikiri ahụ buuru ozu ndị ahụ niile nwụrụ anwụ wee gbochie okporoụzọ awaraawara Makurdi-Lafia, bụ nke butere njem aga aga, ala ala ọtụtụ awa ụbọchị ahụ. Mbọ niile ndị ọrụ nchekwa gbara iji mee ka ha bupusia ozu ndị ahụ n’ụzọ dị ka iwusa mmiri n’okwute. Ọ bụ n’ihi ọbịbịa nke gọvanọ na-achị steeti ahụ Samuel Ortom bịara wee rịọ ha mere ka iwe ndịntorobịa ahụ jụrụ, ha were kwere ka e buruzie ozu ndị ahụ dọnye n’ọbaozu.

Gọvanọ Samuel Ortom, dịka ọ na-agwa ndịntorọbịa ahụ iwe na-ewe okwu kpọkuru onyeisiala Muhammadu Buhari ka o mee ihe o kwesịrị ime banyere ichekwa ndị Nigeria. Ọ kọwara mwakpo ahụ a wakporo n’ogige kampụ IDP dịka nke jọgburu udele na njọ ma sigbuo nkakwụ n’isi.

Gọvanọ ahụ, onye kpọrọ oku ka e mee ọsọ ọsọ megide arụ ndị na-achị ehi na-akpa n’ala anyị gbaa gburugburu, kwuru sị na ọ bụrụ na Gọọmenti Etiti jiri agha ndị na-achị ehi na-ebu kpọrọ ihe na mbụ, na ọ garaghị eru otu ọ dị ugbu a. Ọ kwara arịrị na n’ime izuụka abụọ gara aga, na e gbuola ihe karịrị mmadụ iri asaa, sọọsọ n’okpuru ọchịchị Makurdi, ebe imirikiti obodo na Benue nọ na nsogbu n’ihi agha ndị na-achị ehi. Na ndị niile bi n’ogige ahụ amalitekwala ịchọ ebe obibi nke ha amaghị ebe ha ga-enweta, dịka ha gbapusịrịla n’ebe ahụ. 

Otu o sila dị, osote gọvanọ steeti ahụ, Benson Abounu agaala leta ndị ahụ nwetara mmerụ ahụ bụ ndị na-anara ọgwụgwụ n’ụlọọgwụ Benue State Teaching Hosiptal, Makurdi. Ọ gagharịrị, leta ma kasie ndị ahụ niile. Ọ kọwara mwakpo ahụ dịka nke adabaghị adaba. Ọ rụtụrụ aka na ka a chupuchara ndị ahụ n’ụlọ ha, nke mere ka ha birizie n’ogige IDP na ndị ahụ na-achị ehi gakwara n’ihu gaa ebe ahụ wakpo ha ma gbuo mmadụ asaa n’etiti ndeeri ma hapụ mmadụ iteghete n’ọnọdụ mmerụ ahụ dị iche iche.

Ya mere, Abounu kwuru na gọọmenti steeti Benue agaghị agakwa n’ihu anabata ogbugbu ndị nke ya n’emeghị ihe ọbụla ma kpọkuo Gọọmenti Etiti na ndị ọrụ nchekwa ka ha gbaa mbọ mee ihe ha kwesịrị ime banyere ichekwa ndụ na akụnaụba ndị Nigeria.

Ọ gakwara n’ihu kpokuo ndị ọnụ ruru n’okwu, bụ ndị nke nọ ndị ahụ na-akpa arụ ndị ahụ nso ka ha gwa ha okwu, ka ha kwụsị igbu ndị mmadụ.

N’akụkụ nke ya, onyeisi zuzugbe, Tiv Socio-Cultural Organisation nke a maara ka Mzough-U-Tiv (MUT), Maazị Lorbee Ihagh, bụ kọmishọna uweojii lara ezumike nka kpọrọ onyeisiala Muhammadu Buhari oku ka ọ kwụsị ogbugbu a na egbu ndị mmadụ na steeti ahụ, ma maa ọkwa na emeghị nke ahụ ga-etinye ndị mmadụ n’iji aka ha zọọ onwe ha.

Ka ọ dị ugbu a, gọọmenti steeti Benue ekpesarala mba ọzọ (international community) banyere nsogbu ndị na-achị ehi na-enye ha; ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka iji wee kwụsị ajọ ọnọdụ ahụ ma nyekwa ndị o metụtara nkwado.

Odeakwụkwọ State Emergency Management Agency (SEMA), Dọkịnta Emmanuel Shior, onye kwuputara nke a kọwara na ya bụ mkpebi dị mkpa n’ihi oke ibu dakwasara gọọmenti steeti ahụ gbasara otu a ga-esi hazie ya bụ ajọ ọnọdụ.

Gbasara ndị ahụ a wakporo, gbuo n’ogige IDPs kampụ Abagena, Dọkịnta Shior onye kwara arịrị na enweghị ole ọnụọgụ ndị uweojii e kwesịrị inwe n’ụfọdụ kampụ ndị ahụ, rịọrọ onyeisi uweojii (inspector-General) ka o zitekwuo ndị ọrụ uweojii na steeti ahụ iji chekwaa ndị mmadụ bi n’ebe obibi ndị ahụ gbapụrụ ọsọ ndụ site n’ụlọ ha, (kampụ IDP) nke dị asatọ n’ọnụọgụ.

Otu o sila dị, ọ rịọrọ ndị steeti ahụ ka ha tinyere Gọvanọ Samuel Ortom aka n’ileru anya n’ọnọdụ ndị ahụ enweghịzi ebe obibi.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484