Ndị Òtù PAY Achịkọbarala Ndị Ntorobịa Ọgbakọ Nkuzi n'Awka

Oct 3, 2019 - 04:29
Jan 22, 2021 - 05:43
 0
Ndị Òtù PAY Achịkọbarala Ndị Ntorobịa Ọgbakọ Nkuzi n'Awka

Izunna Okafor, Awka, Nigeria

A kọwaala mkpa ọ dị na ndị ntorobịa ga-amụta ọrụ aka ma mụtakwa usoro e ji achị ezi ọchịchị, dịka ihe ga-enyere ha aka ịbụ ndị ga-ewèta mgbanwe n'ime obodo ha dị iche iche.

Nke a bụ isi sekpụ ntị nakwa okwu a kpụ n'ọnụ na nnukwu ọgbakọ otu ụbọchị a chịkọbarààrà ndị ntorobịa steeti Anambra site n'aka òtù nnọrọ onwe a maara dịka 'Progressive Anambra Youths (PAY),' bụkwa nke weere ọnọdụ n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra.

N'okwu ya oge ọ na-enye nkuzi na mmemme ahụ, onyeisi ụlọ mgbasa ozi 'Anambra Broadcasting Service' bụ Maazị Uche Nwọrah kpọkùrù ndị ntorobịa ka ha na-akwádo onwe ha ma na-adị njikere oge niile ichere òhèrè ọma, ma chetakwara ha na ọchịchị bụ ọkpụkpọ òkù ịrụ ọrụ, bụkwa nke ọ kwuru na mmadụ apụghị ịrụnwu nke ọma ma ọ bụrụ na o nwetaghị ezigbo ọzụzụ ma ọ bụ kwado onwe ya nke ọma.

O kwuru na ezi ọchịchị chọrọ onye ñụjuru mmiri ara afọ, onye nwere ọgụgụ isi, nakwa onye ọdịmma ndị ọ na-achị na-echu ụra karịa ọdịmṅa nke ya onwe ya, ma kpọkuzie ndị ntorobịa ka onye ọbụla n'ime ha wère ohere ọma ọbụla o nwere wee mụta ihe dị iche iche ga-enyere ya aka na ndụ maka na ọ bụ onye kwadoro onwe ya nke ọma ka ohere ọma na-abịakute.

N'okwu nke ya oge ọ na-agbarì isiokwu mmemme ahụ, nke pụtara ma a tụgharịa ya na bekee 'Ịzụlite Ndị Mgbanwe n'Ogoogo Mba Ụwa Maka Ọchịchị Ala Anyị,' ótù nwa amadi nọchitegoro anya ọgbọ nta nkwàdo Orumba North na South ugboro atọ n'ụlọ ọgbakọ nnọchi anya ala anyị, bụ Dọkịta Ben Nwankwọ kọwara ezigbo mgbanwè dịka mnwògharị ziri ezi na ma nke echichè ma nke ihe a na-ahụ anya, ma mee ka a mara na ihe mbụ onye ọbụla bụ ezi onye ndu ga-enwe bụ ọhụhụ ụzọ na ezi echiche, ya na otu ọ ga-esi mepụta ezi echiche ahụ emepụta, tupu ihe ndị ọzọ esònyebezie.

Dọkịta Nwankwọ, bụkwa onyeisi ụlọ ọrụ 'Leading Edge Group, Abuja' mere ka a mara na otu obodo ọbụla na mba ụwa siri mepedobe bụ mpụtara na ngosipụta nke ụdịrị ọchịchị na onye ndu obodo ahụ nwèrè, ma dụkwa ndị ntorobịa ahụ ka ha teta n'ụra ma chekwaba ọdịnihu ha site n'ịmụta ihe dị iche iche ga-enyere ha aka ịbà uru, iso n'ihe a na-eme na ịbụ ezigbo ndị ndu, n'ihi na, dịka o sìrì kwuo, ọchịchị abụghị maka iji ọkwa, kama na ọ bụ maka ịrụ ọrụ.

Na mbụ n'ozi nnọọ ya, onyeisi òtù ahụ, bụ Ifeanyichukwu Ike kọrọ akụkọ bànyere otu ya bụ òtù siri màlite n'ahọ 2009, ma mee ka a mara na mmemme ahụ bụ oke ọgbakọ ha na-achịkọba kwà ahọ ọbụla iji nye ụmụ na-eto eto òhèrè ịkparịta ụkà na ịtụkọ erò ọnụ banyere otu a ga-esi wèta ezi mgbanwè, ezi ọchịchị na ezi ọnọdụ mmepe na ngalaba dị iche iche nke ala Nigeria.
Ọ kpọpụtasịrị ihe dị iche iche òtù ahụ mepụtagoro n'ime ahọ ise gara aga, ma kpọpụtakwa ụfọdụ ihe ha na-achọ ịchụsò nso-nso, nke gụnyere ikesàrà ụfọdụ ụmụakwụkwọ nọ n'ime-ime obodo akwụkwọ e ji ede ihe, ruru puku iri abụọ, ya na akwụkwọ ọgụgụ ruru puku abụọ, ma rịọkwazie enyemaka ndị mmadụ iji mee ka mmezupụta atụmatụ ahụ pụta ihè.

Ka ọ na-agbape ọgbakọ ahụ, onyeisi oche na mmemme ahụ, bụ Maazị Jude-Kingsley Onyeka kọwara ya bụ ọgbakọ ọzụzụ dịka nke ziri ezi na nke dabàrà adabà, n'ihi ajọ ọnọdụ ala Nigeria nọ na ya ugbu a, bụ nke o kwùrù na o nweghị ezi ọdịnihu ọbụla o jiiri ndị ntorobịa.

Ya bụ nwa amadi, onye jiri aha otu ndọrọ-ndọrọ ọchịchị APC wee zọọ ọkwa ịnọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Nnewi North/South Ekwusigo n'ụlọ ọgbakọ nnọchi anya etiti na nhọpụta izugbe a gara aga, kwùrù na ihe ọ chọpụtara banyere ụmụ na-eto eto na ndị ntorobịa oge ọ zọrọ ọchịchị mere ka ọ mara ihe mere ndị amaghị nke ekwe na-akụ n'ọchịchị jiri gaa n'ihu na-abanye n'ọkwa ọchịchị, ma kpọkùzie ndị ntorobịa ka ha gbanwègharịa echiche, ma gharazie ịdị na-eji maka ego wee na-akwàdo ma ọ bụ na-etinye aka n'ihe dị iche iche adabaghị adaba.

Mmemme nkuzi na mkparịta ụka ahụ dọtàrà ụfọdụ ndị dị iche iche e ji okwu ha agba ìzù na steeti ahụ, nke gụnyere onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Nnewi North n'ụlọ omebe iwu steeti Anambra, bụ Maazị Nọnso Okafor; onye jiri aha otu ndọrọ-ndọrọ wee zọọ ọkwa ịnọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Anọcha/Njikọka/Dunukọfịa n'ụlọ ọgbakọ omebe iwu etìtì na nhọpụta izugbe ahọ 2019, bụ Maazị Elijah Onyeagba, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.