Ndị Rịpọblịkan Amaghị Ịhe Ha Ga-eme Ihe Mulvaney Kwuru

Ndị Rịpọblịkan Amaghị Ịhe Ha Ga-eme Ihe Mulvaney Kwuru

Oct 18, 2019 - 18:21
Jan 19, 2021 - 18:21
 0
Ndị Rịpọblịkan Amaghị Ịhe Ha Ga-eme Ihe Mulvaney Kwuru
: :
playing

Mick Mulvaney, otu n'ime ndị ọkwa ha gbagoro agbago na White House, obi gọọmenti mba Amerịka, atabiena ire taa. Ọ tọghere ngịga n'igbudu ahịa. Mgbe Mulvaney na-agwa ndị nta akụkọ okwu na Wọshingtịn, n'ụbọchị Tọzdee, mgbe ọ na-aza ajụjụ, Mulvaney kwetere na ịhe Prezidenti Trump jiri hapụ ịnye ndị Yukren $400 M (narị ijeri dọla anọ) ndị omebe iwu mawapụtara ha bụ iji mee ka Yukren mere ya ihe ahụ ọ chọrọ.

Mba Yukren na mba Rọshịa na-alụ agha kamgbe afọ abụọ. N'iji nyere ndị Yukren aka, ndị ọgbakọ omebe iwu mba Amerịka, US Kọngres, mawapụta akatamkpo ego ahụ maka ịkwado ndị Yukren n'ịzụ ngwa agha.

Onye isi ala Amerịka, Donald Trump, mechara kpachie yabụ ego. O kweghị enye ya ndị Yukren n'oge tosiri etosi. N'ọnwa abụọ gara aga, mgbe Trump na onye isi ala ndị Yukren na-akpa ụbụbọ n'ekwe ntị, Trump gwara Volodymyr Zelensky n'o nwere aka o kwesịrị ịnyere yabụ Trump tupu o nwete ego ahụ. Trump rịọrọ Zelensky ka ọ malite nnyocha megide Joe Biden, onye so azọ ọkwa onye isi ala Amerịka n'aha otu Demokrat.

Trump rịọrọ Zelensky ka ọ malite nnyocha megide nnwa Joe Biden bụ onye ruburu ọrụ na Yukren.

Mgbe ndị Demokrat chọpụtara nke a, ha malitere ime nnyocha nke ha nwere ike iji chụtuo Trump n'ọkwa ọchịchị. Trump mechara gọwa agụgọ na enweghị kwịdprokwo dị na yabụ okwu. Ụfọdụ ndị Rịpọblikan na-agọrọ Trump ọnụ ya.

Mana taa bụ Tozdee, oke ikuku feziri mee ka ndị mmadụ hụ ike ọkụkọ.

Mulvaney, onye na-arụrụ Trump ọrụ, kwuputere taa na n'ezie, Trump riọrọ Zelensky arịrọ ahụ. Ndị omebe iwu ka na-eme nnyocha na US Kọngres.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.